bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Matthew 15
Matthew 15
Igbo 1988
← Chapter 14
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 16 →
1
Mgbe ahụ, ụfọdụ ndị Farisii na ndị Juu si Jerusalem bịara ịjụ Jisọs ajụjụ.
2
Ha jụrụ ya sị, “Gịnị mere ndị na-eso ụzọ gị adịghị erube isi nꞌomenala ndị okenye anyị? Tupuu mmadụ erie nri, ọ bụ omenala anyị na onye ahụ ga-ebu ụzọ kwọọ aka. Ma ndị na-eso ụzọ gị adịghị eme nke a.”
3
Jisọs zara ha sị, “Gịnị mekwaranụ unu ji na-emebi iwu Chineke nꞌihi omenala unu?
4
Nꞌihi na Chineke nyere unu iwu sị, ‘Sọpụrụnụ nne na nna unu, onye ọ bụla kwujọrọ ndị mụrụ ya ka a ga-egbu.’
5
Ma nꞌọnọdụ iwu a, unu na-ezi ndị mmadụ sị, ‘Ọ bụrụ na onye ọ bụla enwee ihe ọ ga-eji nyere ndị mụrụ ya aka, onye ahụ nwere ike ịjụ inyere ha aka ma ọ bụrụ na o kwuo na ihe ọ bụla o nwere bụ nke Chineke.’
6
Nꞌọmenala unu onye mere ihe dị otu a mere ihe ziri ezi, mgbe ọ jụrụ iji ihe o nwere sọpụrụ ndị mụrụ ya. Gịnị ka nke a na-egosi? Ọ̀ bụghị na unu emeela ka iwu Chineke bụrụ ihe dị ala karịa omenala unu?
7
“Ndị ihu abụọ! Amụma ahụ Aịzaya buru banyere unu bụ eziokwu. Nꞌihi na Chineke sitere nꞌọnụ ya kwuo sị,
8
‘Ndị a ji egbugbere ọnụ ha na-asọpụrụ m, ma obi ha dị anya site nꞌebe m nọ.
9
Ịkpọ isi ala ha bụ ihe efu, nꞌihi na ọ bụ ozizi mmadụ ka ha na-ezi nꞌọnọdụ iwu Chineke.’ ”
10
Mgbe ahụ, Jisọs kpọrọ igwe mmadụ nọ nꞌebe ahụ sị ha, “Geenụ ntị nꞌihe m na-ekwu. Ghọtakwanụ okwu m!
11
Ọ bụghị ihe banyere mmadụ nꞌọnụ na-emerụ ya. Kama ọ bụ ihe si nꞌọnụ onye ahụ pụta, ya na ihe onye ahụ chere nꞌobi ya.”
12
Ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya sị, “Ị makwaara na obi adịghị ndị Farisii mma nꞌihi okwu ahụ i kwuru.”
13
Ma Jisọs zara sị ha, “Osisi ọ bụla Nna m na-ejighị aka ya kụọ ka a ga-efopụ.
14
Ya mere, unu echegbula onwe unu, nꞌihi na ha bụ ndị ndu kpuru ìsì. Mgbe ọ bụla kwa onye ìsì na-edu onye ìsì ibe ya ha abụọ aghaghị ịdaba nꞌime olulu.”
15
Pita sịrị ya, “Kọwaaranụ anyị ihe okwu a pụtara. ‘Ọ bụghị ihe mmadụ riri na-emerụ ya.’ ”
16
Jisọs jụrụ ya sị, “Ọ̀ bụ na ị ghọtaghị? Ọ̀ ga-abụ na o nweghị ihe dị iche nꞌetiti gị na ha nꞌịghọta eziokwu?
17
Ọ̀ ga-abụ na unu aghọtaghị na ihe ọ bụla mmadụ riri nꞌọnụ ya na-abanye ya nꞌime afọ, emesịa o sitekwa ya nꞌike pụọ?
18
Ma ihe si mmadụ nꞌọnụ pụta na-esi ya nꞌobi apụta. Ọ bụ ihe dị otu a na-emerụ mmadụ.
19
Nꞌihi na ọ bụ nꞌobi mmadụ ka echiche ime ihe ọjọọ ndị a si apụta: igbu mmadụ, ịkwa iko, ịchụ nwanyị, na isogharị nwoke, na izu ohi, na ama ụgha, na nkwutọ.
20
Ihe ndị a bụ ihe na-emerụ mmadụ, ọ bụghị ma mmadụ kwọrọ aka tupuu o rie nri, ma ọ bụ na ọ kwọghị.”
21
Jisọs hapụrụ obodo ahụ gaa nꞌebe ọzọ dị obodo Taịa na Saịdọn nso.
22
Nꞌebe ahụ, otu nwanyị onye Kena bi nꞌobodo ahụ bịakwutere Jisọs rịọọ ya sị, “Onyenwe m, nwa Devidi, biko meere m ebere. Ada m nwanyị nwere ajọ mmụọ nꞌime ya nke na-esogbu ya oge nile.”
23
Ma Jisọs egheghị nwanyị ahụ ọnụ. Ọ gbara ya nkịtị. Emesịa ndị na-eso ụzọ Jisọs bịakwutere ya rịọọ ya sị ya, “Chụlaa nwanyị a! Lee ka o si esogharị anyị na-enye anyị nsogbu site nꞌarịrịọ ya!”
24
Jisọs sịrị nwanyị ahụ, “Ezitere m nanị inyere ndị Juu aka, ndị bụ atụrụ furu efu nke Izirel.”
25
Ma nwanyị a bịara daa nꞌụkwụ Jisọs rịọọ ya arịrịọ sị ya, “Onyenwe m, nyere m aka!”
26
Jisọs zara sị ya, “O zighị ezi na a ga-ewere nri ụmụntakịrị tụpụrụ nkịta.”
27
Nwanyị ahụ zara ya sị, “Ọ bụ eziokwu Onyenwe m. Ma a na-ekwekwa ka ụmụ nkịta nọọ nꞌokpuru tebulu rie ibiribe nri nke na-esi nꞌelu tebulu ahụ daa nꞌala.”
28
Jisọs zara sị ya, “Nwanyị, okwukwe gị dị ukwuu! Laa, e meerala gị ihe ị na-arịọ.” Nꞌotu oge ahụ a gwọrọ ada ya.
29
Jisọs hapụrụ ebe ahụ lọghachi nꞌakụkụ osimiri Galili. Ọ rịgooro nꞌelu ugwu nꞌọdụ ala.
30
Igwe mmadụ dị ukwuu bịakwutere ya. Ha duteere ya ndị ọrịa, na ndị ngwụrọ, na ndị ìsì, na ndị aka, na ndị ụkwụ ha nwụrụ anwụ, na ndị ogbi, na ọtụtụ ndị ọzọ. Jisọs gwọkwara ha nile.
31
Ọ tụrụ mmadụ nile nꞌanya mgbe ha hụrụ na ndị ogbi nile bidoro ikwu okwu. Mgbe ha hụkwara na a gwọrọ ndị aka, na ndị ụkwụ ha nwụrụ anwụ. O jukwara ha anya ịhụ na ndị ngwụrọ gara ije, na ndị ìsì hụkwara ụzọ. Ha toro Chineke nke Izirel.
32
Jisọs kpọrọ ndị na-eso ụzọ ya sị ha, “Ana m emere igwe mmadụ ndị a ebere, nꞌihi na mụ na ha anọọla abalị atọ nꞌebe a, ma ha eribeghị nri ọ bụla. Agaghị m ezilaga ha na-erighị nri, nꞌihi na ụfọdụ ha nwere ike ịda nꞌụzọ.”
33
Ndị na-eso ụzọ ya sịị, “Ebee ka anyị ga-enweta nri ga-ezuru ha nꞌọzara a?”
34
Jisọs jụrụ ha ajụjụ sị, “Gịnị bụ nri unu nwere?” Ha sịrị ya, “Ogbe beredi asaa na azụ ole na ole.”
35
Jisọs gwara igwe mmadụ ahụ ka ha nọdụ ala.
36
O weere beredi asaa na azụ ole na ole ahụ kelee Chineke ekele. Ọ nyawasịrị ha, nye ndị na-eso ụzọ ya. Ndị na-eso ụzọ ya nyekwara igwe mmadụ ahụ.
37
Onye ọ bụla nꞌime ha rijuru afọ. Ha dị puku dimkpa anọ riri nri ahụ. Ma a gụnyeghị ndị nwanyị na ụmụntakịrị.
38
Mgbe ha risịrị nri, a tụtụkọtara ibiribe nri dara nꞌala. Ha juru nkata asaa.
39
Jisọs zilagara ha, baa nꞌụgbọ mmiri gafee osimiri, bịaruo nꞌobodo Magadan.
← Chapter 14
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 16 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28
Recommended Reading
Commentary
Matthew Commentaries
→
Devotional
Matthew Devotional Guide
→
Get This Bible
Igbo Study Bible
→