bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Matthew 16
Matthew 16
Igbo 1988
← Chapter 15
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 17 →
1
Otu ụbọchị, ndị Farisii na ndị Sadusii bịakwutere Jisọs ịnwa ya ọnwụnwa. Ha gwara Jisọs sị ya, “Gosi anyị ihe ịrịba ama si nꞌelu, nke ga-ezi anyị na ị bụ onye ị sị na ị bụ.”
2
Jisọs zara sị ha, “Ihe unu maara nke ọma bụ nanị ịkọwa ihu eluigwe. Nꞌanyasị unu na-sị, ‘Mmiri agaghị ezo nꞌihi na ihu eluigwe na-acha uhie uhie.’
3
Nꞌụtụtụ unu na-asị, ‘Anyị ga-enwe mmiri ozuzo taa nꞌihi na ihu eluigwe na-acha uhie uhie na oji oji.’ Lee na unu pụrụ ịkọwa ihu eluigwe, ma unu apụghị isite nꞌihe ịrịba ama ndị a unu na-ahụ anya kọwaa ihe oge a anyị nọ nꞌime ya pụtara.
4
Ajọ ọgbọ nke jupụtara nꞌekweghị ekwe, nke na-arịọkwa ka e mee ihe ịrịba ama na mbara eluigwe. Ọ dịghị ihe ịrịba ama ọzọ a ga-egosi unu karịa ihe ịrịba ama Jona.” Mgbe ahụ Jisọs sitere nꞌebe ahụ ha nọ pụọ.
5
Mgbe ha gafesịrị nꞌofe ọzọ nke osimiri ahụ, ndị na-eso ụzọ ya chetara na ha ejighị ihe oriri ọ bụla.
6
Nꞌoge ahụ kwa, Jisọs dụrụ ha ọdụ sị ha, “Lezienụ anya nꞌebe ihe na-eko achịcha ndị Farisii na ndị Sadusii dị.”
7
Ma ndị na-eso ụzọ ya aghọtaghị ihe Jisọs na-agwa ha. Ha chere na ọ na-ekwu okwu a nꞌihi na ha chefuru iweta nri ha ga-eri.
8
Ebe ọ bụ na Jisọs matara ihe ha na-eche nꞌobi ha, ọ gwara ha okwu sị ha, “Unu ndị okwukwe nta! Gịnị mere unu ji na-esogbu onwe unu nꞌihi na unu enweghị ihe oriri?
9
Olee mgbe unu ga-amata ihe? Ọ̀ bụ na unu echetaghị puku mmadụ ise ahụ m jiri ogbe beredi ise mee ka ha rijuo afọ?
10
Unu echetakwaghị na m ji ogbe beredi asaa zụọ puku mmadụ anọ? Ibiribe beredi juru nkata ole ka unu tụtụkọtara?
11
Gịnị mere unu ji chee na ọ bụ ihe banyere nri ka m na-ekwu? Ka m kwuokwa okwu m kwuru ọzọ, cheenụ onwe unu nche nꞌebe ihe na-eko achịcha ndị Farisii na ndị Sadusii nọ.”
12
Nꞌikpeazụ ha ghọtara na ihe ọ na-akọwara ha abụghị ihe banyere ihe na-eko achịcha a na-ata ata, kama ọ bụ ihe banyere ozizi ọjọọ ndị Farisii na ndị Sadusii.
13
Mgbe Jisọs bịaruru obodo a na-akpọ Sizaria Filipaị, ọ jụrụ ndị na-eso ụzọ ya ajụjụ sị ha, “Onye ka ndị mmadụ na-asị na mụ onwe m bụ?”
14
Ha zara sị ya, “Ụfọdụ na-asị na ị bụ Jọn omee baptizim, ụfọdụ na-asị na ị bụ Ịlaịja, ndị ọzọ na-asịkwa na ị bụ Jeremaya, ma ọ bụ otu nꞌime ndị amụma.”
15
Ma Jisọs jụrụ ha sị, “Onye kwanụ ka unu onwe unu na-eche na m bụ?”
16
Saịmọn Pita zara sị ya, “Ị bụ Onye nzọpụta ahụ, Ọkpara Chineke dị ndụ.”
17
Jisọs gwara Pita okwu sị ya, “Saịmọn Pita, ị bụ onye Chineke gọzịrị agọzi, nꞌihi na eziokwu a i kwuru ugbu a esiteghị nꞌaka mmadụ efu rute gị. Kama ọ bụ Nna m bi nꞌeluigwe mere ka ị mata ya.
18
Ma ka m gwa gị eziokwu, aha gị bụ Pita, nke pụtara ma a sụgharịa ya, Nkume. Ọ bụkwa nꞌelu nkume a ka m ga-ewu ụlọ chọọchị m. Ike nile nke ọkụ ala mmụọ apụkwaghị iguzo megide ya.
19
Aga m enye gị mkpịsị igodo alaeze eluigwe. Ihe ọ bụla dị nꞌụwa ị jụrụ na ọ gaghị abata nꞌeluigwe agaghị abata nꞌebe ahụ. Ihe ọ bụla kwa ị nabatara nꞌụwa, ya ka a ga-anabatakwa nꞌeluigwe.”
20
Mgbe ahụ, Jisọs nyere ndị na-eso ụzọ ya iwu ka ha ghara ime ka ndị ọzọ mata na ya bụ Onye nzọpụta ahụ.
21
Site nꞌoge ahụ Jisọs malitere ịkọwara ndị na-eso ụzọ ya ihe banyere Jerusalem. O mere ka ha mata na ọ ga-ahụ ahụhụ dị iche iche site nꞌaka ndị isi ndị Juu. Ọ gwara ha sị, “Ndị isi ndị Juu ga-egbu m. Ma mgbe ụbọchị atọ gasịrị, aga m esite nꞌọnwụ bilie.”
22
Mgbe Jisọs gwasịrị ha okwu a, Pita duuru ya pụọ gaa nꞌotu akụkụ, nọdụ nꞌebe ahụ baara ya mba sị ya, “Onyenwe m, Chineke ekwela. Ihe ndị a agaghị adakwasị gị!”
23
Ma Jisọs chigharịrị lee Pita anya sị ya, “Si nꞌebe m nọ pụọ, ekwensu! Ị bụ nnọọ ajọ mmadụ nꞌebe m nọ. Nꞌihi na ihe ị na-eche echiche ya bụ nanị echiche mmadụ, ọ bụghị echiche Chineke.”
24
Mgbe ahụ Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya okwu sị ha, “Ọ bụrụ na onye ọ bụla achọọ ịbụ onye na-eso ụzọ m, ya buru ụzọ jụ onwe ya, buliekwa obe ya soro m nꞌazụ.
25
Nꞌihi na onye ọ bụla na-eche ndụ ya nche ka ọ hapụ ifunarị ya ga-atụfu ya. Ma onye ọ bụla tụfuru ndụ ya nꞌihi m, ga-enwetakwa ya.
26
Nꞌihi na uru gịnị ka mmadụ nwetara ma ọ bụrụ na o ritechaa ụwa nile nꞌuru ma tufuo ndụ ya? Gịnị bụ ihe ahụ dị nꞌụwa a ga-eji gbanwere ndụ mmadụ?
27
Nꞌihi na mụ bụ Nwa nke mmadụ ga-abịa nꞌebube nke Nna m, mụ na ndị mmụọ ozi m. Mgbe ahụ ka m ga-ekpe onye ọ bụla ikpe dị ka ọrụ ya si dị.
28
Ụfọdụ nꞌime unu ndị guzo nꞌebe a ugbu a ga-adị ndụ hụ Nwa nke mmadụ ka ọ na-abịa dị ka eze nꞌalaeze ya.”
← Chapter 15
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 17 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28