bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Matthew 7
Matthew 7
Igbo 1988
← Chapter 6
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 8 →
1
“Unu ekpela ndị ọzọ ikpe, ka a ghara ikpekwa unu ikpe.
2
Nꞌihi na a ga-ekpe unu ikpe dị ka unu si kpee ndị ọzọ. Ihe i meere ndị ọzọ ka a ga-emekwara gị.
3
Gịnị mere i ji na-esogbu onwe gị banyere ntakịrị ahịhịa dị nwanne gị nꞌanya mgbe ahịhịa dị ukwuu karịa nke ya dị gị onwe gị nꞌanya?
4
Olee otu ị ga-esi gwa ya sị ya, ‘Nwanne m, kwere ka m tụpụ gị ntakịrị ahịhịa danyere gị nꞌanya,’ mgbe ahịhịa dị ukwuu karịa nke ya dị gị nꞌanya, nke na-adịghị ekwe gị hụzie ụzọ?
5
Onye ihu abụọ! Buru ụzọ wepụ ihe dị gị nꞌanya ka i nwee ike ịhụzi ụzọ ịtụpụ nke dị nwanne gị nꞌanya.
6
“Enyela nkịta ihe dị nsọ. Enyekwala ezi ihe dị oke ọnụ ahịa. Ha ga-azọ ha ụkwụ ma lusịkwa gị ọgụ.
7
“Rịọọ, ị ga-arịọta, chọọ, ị ga-achọta. Kụọọ aka, a ga-emeghere gị ụzọ.
8
Onye ọ bụla na-arịọ na-arịọta. Onye na-achọ na-achọtakwa. Onye na-akụ aka ka a ga-emeghere ụzọ.
9
Ọ bụrụ na nwantakịrị arịọọ nna ya beredi, ọ ga-enye ya nkume?
10
Ọ bụrụkwa na ọ rịọọ ya azụ, ọ ga-enye ya agwọ?
11
Ebe unu ndị mmehie pụrụ inye ụmụ unu ezi onyinye, Nna unu bi nꞌeluigwe ga-enyekwa unu karịa, ma ọ bụrụ na unu arịọọ ya.
12
“Meere ndị ọzọ dị ka i si chọọ ka ha meere gị. Nke a bụ ihe Mosisi na ndị amụma ziri.
13
“Ụzọ dị warara na-eduba nꞌeluigwe. Site na ya baa. Ụzọ dị obosara na-eduba nꞌọkụ. Ọtụtụ mmadụ na-esoro ya nꞌihi na ọ dị mfe.
14
Ole na ole na-achọta ụzọ na-eduba na ndụ, nꞌihi na ọ dị warara.
15
“Kpachapụnụ anya! Nꞌihi na ndị amụma ụgha dị. Ha na-abịakwute unu nꞌụdị atụrụ, ma ha bụ agụ. Ozizi ha pụrụ iduhie unu.
16
Unu ga-amata ha site nꞌụdị ndụ ha na-ebi. A na amara osisi ọ bụla site na mkpụrụ ya. Ị gaghị ahụ mkpụrụ ose kpọọ ya mkpụrụ aṅara.
17
A na-esite na mkpụrụ nke osisi mịpụtara mata ụdị osisi ọ bụ.
18
Osisi na-amụ mkpụrụ ọma adịghị amị mkpụrụ ọjọọ. Nke na-amị mkpụrụ ọjọọ adịkwaghị amị mkpụrụ ọma.
19
Ma osisi ọ bụla na-amịghị mkpụrụ ọma ka ga-egbutu tụnye nꞌọkụ.
20
Ụzọ e si amata osisi ọma ma ọ bụ mmadụ ọma bụ site na mkpụrụ ya.
21
“Ọ bụghị ndị nile na-akpọ m aha na-asị m ‘Onyenwe anyị, Onyenwe anyị’ ga-abanye nꞌalaeze eluigwe, kama ọ bụ nanị ndị ahụ na-eme ihe Nna m nọ nꞌeluigwe chọrọ ka ha mee.
22
Nꞌụbọchị ikpe ahụ, ọtụtụ ndị mmadụ ga-asị m, ‘Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, anyị kwusara ozi ọma nꞌaha gị. Ọ bụkwa aha gị ka anyị ji chụpụ mmụọ ọjọọ, meekwa ọtụtụ ihe ịrịba ama.’
23
Ma aga m asị ha, sitenụ nꞌihu m pụọ, amaghị m unu, nꞌihi na ọrụ unu dị njọ.
24
“Onye ọ bụla ṅara ntị nꞌokwu ndị a m kwuru, ma meekwa ha, dị ka nwoke ahụ maara ihe, onye wuru ụlọ ya nꞌelu nkume sịrị ike.
25
Mmiri zosikwara ike nꞌelu ụlọ ahụ, idee mmiri sọkwara gburugburu ụlọ ahụ. Ifufe siri ike fekwara, ma ụlọ ahụ adaghị. Nꞌihi na e wuru ya nꞌelu nkume.
26
“Ma ndị nile nụrụ okwu ndị a, ma lefuo ha anya, bụ ndị nzuzu. Ha dị ka nwoke wuru ụlọ ya nꞌelu aja.
27
Ngwangwa mmiri zoro, idee mmiri sọkwara, ifufe fesikwara ike, ma ụlọ ahụ dara daruo ala.”
28
Mgbe Jisọs kwuchara okwu ndị a, ozizi ya juru ndị mmadụ ahụ nile anya.
29
Nꞌihi na Jisọs ziri ha ihe dị ka onye ike nile dị nꞌaka. Ọ bụghị dị ka ndị ozizi ndị Juu.
← Chapter 6
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 8 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28