bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Matthew 21
Matthew 21
Igbo 1988
← Chapter 20
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 22 →
1
Mgbe Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya na-abịaru Jerusalem nso, ha rutere obodo Betfeji nke dị nꞌugwu Olivu. Mgbe ha nọ nꞌebe ahụ Jisọs zipụrụ mmadụ abụọ nꞌime ndị na-eso ụzọ ya ka ha gaa nꞌobodo nta dị nꞌihu ha.
2
Ọ gwara mmadụ abụọ a sị, “Meenụ ngwangwa baa nꞌime obodo ahụ dị anyị nꞌihu. Nꞌebe ahụ unu ga-ahụ otu inyinya ibu nke ya na nwa ya nọ nꞌotu ebe. Tọpụta inyinya ibu ahụ kpụta ya nꞌebe a.
3
Ọ bụrụ na onye ọ bụla ajụọ unu ihe unu na-eme, nanị ihe unu ga-agwa ya bụ na inyinya ahụ dị Onyenwe unu mkpa. Ọ ga-ahapụkwa ka unu kpụrụ ya.”
4
E mere nke a ka okwu e kwuru site nꞌọnụ ndị amụma mezuo.
5
Nꞌihi na ha buru amụma sị, “Gwanụ ada Zayọn sị, lee eze gị ka ọ na-abịakwute gị. Ọ bụ onye dị nwayọọ. Ọ nọkwasịkwara nꞌelu inyinya ibu, ee, nꞌelu nwa anụ na-ebu ibu.”
6
Ndị na-eso ụzọ ya gara mee ihe Jisọs sị ha mee.
7
Ha kpụtara inyinya ibu ahụ na nwa ya. Ha wụkwasịkwara uwe ha nꞌelu ya kukwasị Jisọs nꞌelu ya.
8
Ọtụtụ nꞌime igwe mmadụ ahụ so Jisọs, tụsara uwe ha nꞌokporo ụzọ. Ndị ọzọ ghuturu alaka osisi, tụsaa ha nꞌụzọ, nꞌihu ya.
9
Ụfọdụ nꞌime igwe mmadụ ahụ nọ Jisọs nꞌihu, ndị ọzọ sokwa ya nꞌazụ. Ha nile nọkwa na-eti mkpu nꞌoke olu na-asị, “Otuto dịrị Nwa Devidi! Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ, nke na-abịa nꞌaha Onyenwe anyị! Otuto nꞌebe kachasị ihe nile elu!”
10
Mgbe Jisọs batara nꞌime Jerusalem, ụzụ tụrụ, obodo ahụ nile mere mkpọtụ. Ndị mmadụ bidoro na-ajụ ajụjụ na-asị, “Onye kwa bụ nwoke a?”
11
Igwe mmadụ ahụ so Jisọs zara sị, “Nwoke a bụ Jisọs, onye amụma ahụ si Nazaret, obodo dị nꞌime Galili.”
12
Jisọs banyere nꞌụlọ nsọ ukwu Chineke dị na Jerusalem malite ịchụpụ ndị nile na-ere ahia na ndị na-azụ ihe ahia nꞌebe ahụ. O kpuru tebulu ndị na-agbanwe ego ihu nꞌala, kwatuokwa oche ndị na-ere nduru.
13
Ọ gwara ha okwu sị ha, “E dere ya nꞌakwụkwọ nsọ sị, ‘Ụlọ Nna m ga-abụ ụlọ ekpere’, ma unu na-eme ya ka ọ bụrụ ogige ndị ohi!”
14
Ndị ìsì na ndị ngwụrọ bịakwutere ya nꞌebe ahụ. O mekwara ka ahụ dị ha ike.
15
Ma mgbe ndị isi nchụaja na ndị ozizi iwu hụrụ ihe ịrịba ama ndị a, hụkwa ka ụmụnta na-eti mkpu nꞌoke olu na-asị, “Otuto dịrị Nwa Devidi!” Iwe were ha nke ukwuu.
16
Ha bịakwutere Jisọs jụọ ya ajụjụ sị, “Ị̀ na-anụkwa ihe ụmụnta ndị a na-ekwu?” Jisọs zara sị ha, “Ee, ana m anụ ya. Ọ̀ bụ na unu agụtabeghị ihe akwụkwọ nsọ kwuru? Nꞌime ya ka e kwuru sị, ‘A ga-esite nꞌọnụ ụmụ a mụrụ ọhụrụ na ụmụ na-aṅụ ara nye Chineke otutu dị ebube.’ ”
17
Emesịa, Jisọs hapụrụ Jerusalem laghachi nꞌobodo nta Betani, ebe o dinara nꞌabalị ahụ.
18
Nꞌụtụtụ echi ya, mgbe Jisọs si Betani na-alaghachi Jerusalem, agụụ gụrụ ya nke ukwuu.
19
Ma o lepụrụ anya hụ otu osisi a na-akpọ fiigi ka ọ dị nꞌakụkụ ụzọ. Mgbe o rutere ebe osisi ahụ dị, o jeruru nso nꞌukwu ya ịchọpụta ma ọ mịrị mkpụrụ. Ma ihe ọ hụrụ bụ nanị ahihia ndụ. Mkpụrụ ọ bụla adịghị nꞌelu ya. Ya mere, Jisọs bụrụ osisi ahụ ọnụ sị, “Malite taa gaa nꞌihu, ị gaghị amịkwa mkpụrụ ọzọ!” Otu mgbe ahụ kwa, osisi ahụ kpọnwụrụ.
20
Mgbe ndị na-eso ụzọ ya hụrụ ka osisi ahụ kpọnwụrụ, ha tụrụ egwu, jụọ Jisọs ajụjụ sị ya, “Gịnị mere osisi fiigi a ji kpọnwụọ ngwangwa otu a?”
21
Jisọs zara sị ha, “Eziokwu ka m na-ekwu, mgbe m na-agwa unu sị, ọ bụrụ na unu enwee okwukwe, gharakwa inwe obi abụọ, unu ga-eme ihe karịrị nke a. Unu pụrụ inye ugwu olivu a iwu sị ya, ‘Si nꞌebe a wezuga onwe gị, gaa danye nꞌoke osimiri,’ ọ ga-emezukwa.
22
Ihe ọ bụla kwa unu sitere nꞌokwukwe rịọọ Chineke nꞌekpere, unu ga-anatakwa ya.”
23
Emesịa, Jisọs lọghachiri nꞌụlọ nsọ ukwu Chineke, nọdụ nꞌebe ahụ na-ezi ihe. Ndị isi nchụaja na ndị ozizi iwu bịakwutere ya jụọ ya sị, “Onye nyere gị ike i ji na-eme ihe ndị a nile ị na-eme?”
24
Jisọs zara sị ha, “Aga m ajụ unu otu ajụjụ. Ọ bụrụ na unu azaa ajụjụ m, aga m azakwa unu ajụjụ unu, gwa unu ebe m siri nweta ike m.”
25
Nke a bụ ajụjụ m, “Ònye zitere Jọn omee baptizim, nye ya ike ime ndị mmadụ baptizim? Ọ bụ Chineke ka ọ bụ mmadụ?” Ndị isi ahụ gbarịtara izu banyere ajụjụ a. Ha kpebiri sị, “Ọ bụrụ na anyị asị na ọ bụ Chineke zitere ya, ọ ga-ajụ anyị ihe mere anyị ji jụ ịnabata ihe Jọn kwuru.
26
Ọ bụrụkwanụ na anyị asị na ọ bụ mmadụ zitere ya, igwe mmadụ ndị a ga-abịakwasị anyị nꞌiwe, nꞌihi na mmadụ nile kwenyere na Jọn bụ onye amụma.” Ya mere ha zara Jisọs sị ya: “Anyị amaghị.”
27
Jisọs zakwara ha sị, “Mụ onwe m agaghị agwakwa unu onye nyere m ike ime ihe ndị a.”
28
Jisọs jiri ilu gwa ha okwu sị, “Gịnị ka unu chere banyere ihe a? Otu nwoke nwere ụmụ abụọ gwara nwa ya nke okenye sị ya, ‘Nwa m gaa rụọ ọrụ nꞌubi m taa.’
29
Nwa ahụ zara nna ya sị, ‘Agaghị m aga’. Ma mgbe e mesịrị, ọ gbanwere obi ya gaa.
30
Nna ha bịakwutere nwa ya nke nta sị ya, ‘Nwa m, gaa rụọ ọrụ nꞌubi m taa.’ Nwa ahụ zakwara sị, ‘Aga m aga.’ Ma nꞌikpeazụ ọ gaghị.
31
Ònye nꞌime ha abụọ mere ihe nna ya chọrọ?” Ha zara sị ha, “Onye nke mbụ.” Jisọs kọwaara ha sị, “Nꞌezie, ndị ọnaụtụ na ụmụ nwanyị akwụla ga-ebu unu ụzọ banye nꞌalaeze Chineke.
32
Nꞌihi na Jọn bịakwutere unu gwa unu ka unu chegharịa, lọghachikwute Chineke, ma unu ekweghị. Ndị ọnaụtụ, na ụmụ nwanyị akwụla chegharịrị. Ọ bụladị mgbe unu hụrụ ha, nke a emekwaghị ka unu chegharịa kwere.”
33
“Ugbu a geekwanụ ntị nꞌilu ọzọ. Otu nwoke dị nke nwere ala ubi. Nwoke a kụrụ osisi oroma nꞌubi a. Ọ gbakwara ubi ya ogige, wuokwa mbadamba ebe a ga-anọ mee mmanya nꞌime ya. O wukwara ụlọ nche nꞌime ya. Mgbe o mesịrị ihe ndị a, o weere ubi ahụ tinye nꞌaka ndị ga-elekọtara ya ubi ahụ, pụọ gaa biri nꞌala ọzọ.
34
“Mgbe oge iwe ihe ubi ruru, o zipụrụ ndị na-ejere ya ozi ka ha jekwuru ndị na-elekọta ubi ahụ, nata mkpụrụ nke ruuru ya site nꞌubi ahụ.
35
Ma ndị na-elekọta ubi ahụ jidere ndị ozi ya ahụ tie otu onye nꞌime ha ihe, gbuokwa onye ọzọ nꞌime ha. Ha tụkwara otu nꞌime ha nkume.
36
“Emesịa, nwoke a zigakwara ọtụtụ ndị ozi karịrị ndị nke mbụ nꞌọnụ ọgụgụ, ịnata mkpụrụ ruuru ya. Ma ndị na-elekọta ubi ahụ mekwara ndị a ihe ha mere ndị nke mbụ.
37
Nꞌikpeazụ nwoke ahụ zigara ọkpara ya. Echiche ya bụ na ndị na-elekọta ubi ahụ ga-asọpụrụ ya.
38
“Ma mgbe ndị a na-elekọta ubi ahụ lepụrụ anya hụ ọkpara nwoke a ka ọ na-abịa, ha gbara izu nꞌetiti onwe ha sị, ‘Lee! Onye a bụ onye ga-eketa ihe nile onyenwe ubi a nwere. Bịanụ ka anyị gbuo ya, ka ubi a bụrụkwa nke anyị.’
39
Mgbe ọkpara nwoke ahụ bịarutere, ha jidere ya nꞌike, kpụrụ ya gafee nꞌazụ ubi ahụ, gbuo ya nꞌebe ahụ.
40
“Mgbe nwoke nwe ubi ahụ lọtara, gịnị ka unu chere na ọ ga-eme ndị ahụ o tinyere ilekọtara ya ubi ya?”
41
Ndị nọ nꞌebe ahụ zara sị ya, “Ọ ga-egbu ndị ajọ omume ahụ, laa ha nꞌiyi nꞌụzọ dị njọ. Ọ ga-ewerekwa ubi ya tinye nꞌaka ndị nlekọta ọzọ, ndị ga-enyekwa ya mkpụrụ ubi ruuru ya nꞌoge ya.”
42
Jisọs jụrụ ha ajụjụ sị, “Ọ̀ ga-abụ na unu agụtabeghị ihe e dere nꞌakwụkwọ nsọ sị, ‘Nkume ahụ ndị na-ewu ụlọ jụrụ, ka e mere ka ọ bụrụ nkume dị mkpa nꞌụlọ ahụ? Nke a bụ ọrụ nke nanị Onyenwe anyị rụrụ. Ọ bụkwa ọrụ ịtụnanya nꞌanya anyị!’
43
“Ya mere, ana m eme ka unu ghọta, na a ga-anapụ unu alaeze Chineke, were ya nye ndị mba ọzọ, ndị ga-enyeghachikwa Chineke mkpụrụ ruuru ya.
44
Ndị nile ga-adakwasị nkume eziokwu ahụ ka a ga-etiwasị. Ma ndị nkume ahụ dakwasịrị ka a ga-egwepịa dị ka ntụ.”
45
Mgbe ndị isi nchụaja na ndị Farisii ghọtara na okwu ndị a Jisọs kwuru bụ banyere ha,
46
ha chọrọ ijide ya. Ma ha tụrụ oke egwu, nꞌihi na igwe mmadụ nọ nꞌebe ahụ kweere na Jisọs bụ onye amụma.
← Chapter 20
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 22 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28