bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Matthew 8
Matthew 8
Igbo 1988
← Chapter 7
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 9 →
1
Ọtụtụ mmadụ sooro Jisọs mgbe o si nꞌugwu ahụ rịdata.
2
Mgbe ha na-aga nꞌụzọ, otu onye ekpenta bịakwutere Jisọs kpọọ isi ala nye ya, rịọ ya sị, “Onyenwe m, ọ bụrụ na ị chọrọ, ị pụrụ ime ka m dị ọcha.”
3
Jisọs bikwasịrị ya aka sị ya, “Achọrọr m ka ị dị ọcha, dịrịkwa ọcha.” Ngwangwa ekpenta ahụ lara.
4
Jisọs nyere nwoke ahụ iwu sị ya, “Jekwuru onyeisi nchụaja, akọkwarala onye ọ bụla nꞌụzọ. Were onyinye gị mgbe ị na-aga dị ka e dere ya nꞌiwu Mosisi. Gaa ka onyeisi nchụaja lee gị ahụ, kwuokwara ọha na ị dịla ọcha.”
5
Mgbe Jisọs chọrọ ịbanye na Kapanọm, otu ọchịagha bịakwutere ya rịọọ ya ka ọ bịa gwọọ ohu ya nwoke, onye akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ, onye nọkwa nꞌoge ahụ nꞌoke ihe mgbu.
7
Jisọs zara sị ya, “Aga m abịa.”
8
Ma ọchịagha ahụ gwara Jisọs okwu sị ya, “Ekwesịghị m ka ị bata nꞌụlọ m. Nanị nọdụ nꞌebe a kwuo okwu, ahụ ga-adịkwa ohu m nwoke ike.
9
Dị ka ọchịagha nke m bụ, ọ bụrụ na m asị onye agha nọ nꞌokpuru m bịa, ọ na-abịa, nꞌihi na ọ nọ nꞌokpuru m. Ma i nwere ike karịrị nke a ịchụpụ ọrịa ahụ na-enye ohu m nsogbu.”
10
Okwu a juru Jisọs anya nke ukwuu. Ọ gwara igwe mmadụ ahụ okwu sị ha, “Nꞌezie, ahụbeghị m okwukwe dị otu a ebe ọ bụla, ọ bụladị nꞌala Izirel nile.
11
Nꞌezie kwa, ọtụtụ ndị mmadụ ga-esite nꞌakụkụ nile nke ụwa bịa soro Eberaham na Aịzik na Jekọb nọkọọ nꞌalaeze eluigwe,
12
ma ọtụtụ ndị si nꞌala Izirel, bụ ndị a na-akwadoro alaeze ahụ, ka a ga-atụba nꞌọchịchịrị, ebe ịkwa akwa na ịta ikikere eze ga-adị.”
13
Jisọs gwara ọchịagha ahụ okwu sị ya, “Laa! E meerela gị dị ka okwukwe gị sịrị dị.” Ahụ dịrị ohu ya mma nꞌotu ntabi anya ahụ.
14
Mgbe Jisọs ruru nꞌụlọ Pita, ọ chọpụtara na nne nwụnye Pita nwere ahụ ọkụ.
15
Jisọs gara metụ ya aka mee ka ahụ ọkụ ahụ hapụ ya. Nne nwụnye Pita biliri siere ha nri.
16
Nꞌoge anyasị, ha kpọtaara ya ndị mmụọ ọjọọ na-esogbu. Ọ chụpụrụ mmụọ ọjọọ ahụ nile, gwọọkwa ọtụtụ ndị ọzọ ahụ na-esogbu.
17
Nke a mezuru amụma ahụ Aịzaya buru sị, “O bupụrụ ọrịa anyị, burukwa ahụ mgbu anyị.”
18
Mgbe Jisọs hụrụ na ndị mmadụ dị ukwuu gbara ya gburugburu, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya okwu sị ha, “Jikerenụ ka anyị gafee osimiri!”
19
Nꞌoge ahụ, otu onyeisi nꞌetiti ndị Juu bịakwutere ya sị ya, “Onye ozizi, aga m eso gị gaa ebe ọ bụla ị na-aga.”
20
Ma Jisọs zara sị ya, “Ewi nwere ọnụ ebe ha na-edina, ụmụ nnụnụ nwekwara akwụ, ma mụ onwe m enweghị ebe obibi.”
21
Otu onye ọzọ nꞌime ndị so ya na-agagharị gwara ya okwu sị ya, “Aga m eso gị, kama kwere ka m buru ụzọ gaa lie nna m.”
22
Ma Jisọs zara sị ya, “Soro m ugbu a, hapụ ndị nwụrụ anwụ nꞌime mmụọ ha ka ha lie ndị nwụrụ anwụ ibe ha.”
23
Mgbe ihe ndị a gasịrị, Jisọs banyere nꞌụgbọ mmiri ịkwọfe osimiri ahụ, ya na ndị na-eso ụzọ ya.
24
Ọ dịghị anya ebili mmiri malitere na-amagharị. Oke ifufe bidokwara ife, na-ebuli mmiri elu. Ma Jisọs nọ nꞌụra mgbe ihe ndị a na-eme.
25
Ndị na-eso ụzọ ya jekwuuru ya kpọtee ya sị ya, “Onyenwe anyị, zọpụta anyị! Lee na ụgbọ anyị na-achọ imikpụ.”
26
Ma Jisọs zara sị ha, “Unu ndị okwukwe nta, gịnị mere ụjọ ji na-atụ unu?” O biliri baara ifufe ahụ na ebili mmiri ahụ mba. Ha dara jụụ, ebe nile deere jii.
27
O juru ndị na-eso ụzọ ya anya, mee ka ha jụọ ajụjụ sị, “Ọ bụ ụdị mmadụ dị aṅaa ka nwoke a bụ, onye ifufe na-eme ihe o nyere ha nꞌiwu.”
28
Emesịa, ha rutere obodo Gadarin, nke dị nꞌofe ọzọ nke osimiri ahụ. Nꞌebe ahụ, e nwere mmadụ abụọ bi nꞌebe a na-eli ozu. Ọ dịkwaghị onye na-esite ụzọ ahụ agafe, nꞌihi na ha na-akpa ike nke ukwuu.
29
Mgbe ha hụrụ Jisọs, ha tiri mkpu bido na-ajụ Jisọs ajụjụ sị ya, “Gịnị ka anyị na gị nwekọrọ gị Ọkpara Chineke? Ị gaghị echekwa eche ka oge ruo tupuu i bido ịta anyị ahụhụ?”
30
Igwe ezi nọ nꞌakụkụ ebe ahụ na-akpa nri.
31
Mmụọ ọjọọ ndị a rịọrọ Jisọs arịrịọ sị ya, “Ọ bụrụ na ị chụpụ anyị, biko, hapụ anyị ka anyị banye nꞌime ezi ndị a.”
32
Jisọs nyere ha iwu sị ha, “Ngwa, gaanụ!” Ha sitere nꞌime mmadụ abụọ ahụ pụta banye nꞌime igwe ezi ahụ. Otu mgbe ahụ kwa, ezi ndị ahụ nile gbaara ọsọ site na mkputamkpu ala ọnụ mmiri ahụ dabanyechaa nꞌime mmiri ahụ. Ha nwụkwara nꞌime ya.
33
Ndị na-azụ igwe ezi ndị ahụ gbapụrụ ọsọ gbalaa nꞌobodo gaa gwa ndị nile nọ nꞌime obodo ahụ ihe mere nꞌebe ahụ.
34
Ya mere ndị nile nọ nꞌobodo ahụ pụtara ịhụ Jisọs. Mgbe ha hụrụ ya ha rịọrọ ya sị ya pụọra ha nꞌobodo ha.
← Chapter 7
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 9 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28