bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Matthew 17
Matthew 17
Igbo 1988
← Chapter 16
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 18 →
1
Mgbe ụbọchị isii gafesịrị, Jisọs kpọrọ Pita na Jemes na Jọn rigoro nꞌelu ugwu, ebe nanị ha nọdụrụ.
2
Mgbe ha nọ nꞌebe ahụ na-ele Jisọs anya nꞌelu ugwu ahụ, mmadụ atọ ndị a hụrụ ka anụ ahụ Jisọs gbanwere. Ihu ya nwupụrụ ọcha dị ka akpụkpọ eluigwe. Uwe ya chakwara ọcha dị ka ogho.
3
Na mberede, mgbe ha nọkwa na-ele ya anya, ha hụrụ Mosisi na Ịlaịja ka ha bịara soro Jisọs na-ekwurita okwu nꞌelu ugwu ahụ.
4
Mgbe ahụ Pita tiri mkpu nꞌoke olu sị, “Onyenwe anyị! Ọ dị mma ka anyị nile nọdụ nꞌebe a! Ọ bụrụ na ị ga-enye m ike, aga m ewu ọnụ ụlọ atọ nꞌebe a. Otu nꞌime ụlọ ndị a ga-abụ nke gị, otu nke Mosisi, nke ọzọ nke Ịlaịja.”
5
Mgbe Pita kpụ okwu a nꞌọnụ, igwe ojii kpuchiri ha nile. Ha nụrụ olu sitere nꞌigwe daa sị, “Onye a bụ Ọkpara m, onye m hụrụ nꞌanya! Ihe ya dịkwa m ezi mma. Nụrụnụ olu ya.”
6
Mgbe Pita na Jemes, na Jọn nụrụ olu a, ha dara nꞌala kpuchie ihu ha nꞌihi egwu.
7
Ma Jisọs jekwuuru ha metụ ha aka sị ha, “Bilienụ, unu atụla egwu.”
8
Mgbe ha lelitere anya ha, ọ bụ nanị Jisọs ka ha hụrụ. Ọ nwekwaghị onye ọzọ ya na ya guzo.
9
Ma mgbe ha si nꞌelu ugwu ahụ na-arịdata, Jisọs nyere ha iwu ka ha ghara ịkọrọ onye ọ bụla ihe ha hụrụ tutuu ruo mgbe o siri nꞌọnwụ bilie.
10
Ndị na-eso ụzọ ya jụrụ ya sị, “Gịnị mere ndị isi ndị Juu ji na-ekwu na Ịlaịja ga-ebu ụzọ bịa tupuu Onyenwe anyị abịa?”
11
Jisọs zara ha sị, “Ihe ha kwuru bụ eziokwu. Ịlaịja kwesịrị ibu ụzọ bịa idozi ihe nile nꞌụsoro.
12
Ma Ịlaịja abịalarị, ma ndị mmadụ amataghị ya. Kama ọtụtụ mmaụ emeela ya ihe ọjọọ dị iche iche. Otu a kwa ka mụ onwe m bụ Nwa nke mmadụ ga-esi hụọ ahụhụ site nꞌaka ha.”
13
Mgbe ahụ ndị na-eso ụzọ ya ghọtara na ọ bụ Jọn omee baptizim ka Jisọs na-ekwu ihe banyere ya.
14
Mgbe ha si nꞌelu ugwu ahụ rịda, ha hụrụ igwe mmadụ nọ na ndagwurugwu ugwu ahụ na-eche ha. Otu nwoke sitere nꞌetiti igwe mmadụ ahụ bịakwute Jisọs gbuo ikpere nꞌihu ya, rịọọ ya sị,
15
“Onyenwe m, biko, meere nwa m nwoke ebere, nꞌihi na akwụkwụ na-adọ ya. Ọtụtụ mgbe ọ na-adaba nꞌime ọkụ ma ọ bụ nꞌime mmiri.
16
Ma ekuteere m ya ndị na-eso ụzọ gị ka ha gwọọ ya, ma ha enweghị ike ime ka ahụ dị ya mma.”
17
Jisọs zara sị, “Ụmụ ọgbọ a na-enweghị okwukwe, ndị na-adịghị erubekwa isi! Ruo ole mgbe ka mụ na unu ga-anọ? Ruo ole mgbe ka m ga-anọ na-anagide ekweghị ekwe unu? Kutere m nwanta ahụ nꞌebe a!”
18
Mgbe ha kutere ya, Jisọs baara mmụọ ọjọọ ahụ mba, mee ka o si nꞌime nwanta ahụ pụta. Otu mgbe ahụ, mmụọ ọjọọ ahụ pụtara, ahụ dịrị nwanta ahụ mma.
19
Mgbe e mesịrị, ndị na-eso ụzọ Jisọs bịakwutere ya na nzuzo jụọ ya sị, “Gịnị mere o ji siere anyị ike ịchụpụ mmụọ ọjọọ ahụ?”
20
Jisọs zara sị ha, “Ọ bụ nꞌihi na okwukwe unu nwere ehighị nne. Ọ bụrụ na unu nwere okwukwe nke dịkarịsịrị nta, nke ga-aha ka mkpụrụ mọsụtadị, unu nwere ike nye ugwu a iwu sị ya, ‘Site nꞌebe a wezụga onwe gị,’ ọ ga-apụkwa.
21
Ma mmụọ ọjọọ dị otu a agaghị apụ, ma ọ bụghị nanị site nꞌikpe ekpere na ibu ọnụ.”
22
Mgbe ha nọ na Galili, Jisọs gwara ha sị, “A ga-arara m bụ nwa nke mmadụ nye nꞌaka ndị ga-egbu m.
23
Ha ga-egbukwa m, ma nꞌụbọchị nke atọ aga m esite nꞌọnwụ bilie.” Okwu a wutere ndị na-eso ụzọ ya nke ukwuu.
24
Mgbe ha bịaruru Kapanọm, ndị na-ana ụtụ nꞌihi ụlọ nsọ ukwu Chineke bịakwutere Pita jụọ ya sị, “Onye ozizi unu ọ̀ na-atụkwa ụtụ?”
25
Pita zara ha sị, “Ee, ọ na-atụ ụtụ.” Ọ banyere nꞌụlọ ịgwa Jisọs banyere nke a. Ma tupuu Pita ekwuo ihe ọ bụla, Jisọs jụrụ ya ajụjụsị, “Gịnị ka i chere banyere nke a Pita? Ọ̀ bụ nꞌaka ndị ole ka ndị eze ụwa si anakọta ụtụ? Ọ̀ bụ nꞌaka ụmụ ha, ka ọ bụ nꞌaka ndị ọbịa e meriri emeri?”
26
Pita zara ya sị, “Ọ bụ site nꞌaka ndị ọbịa.”
27
Jisọs sịrị, “Ọ dị mma, iwu ejighị ụmụ ha. Ma otu ọ dị, achọghị m ka anyị mee ka iwe wee ha. Gaa nꞌosimiri ahụ tụnye nko azụ gị nꞌime ya. Meghee ọnụ azụ nke mbụ ị ga-egbute. Ị ga-ahụ otu mkpụrụ ego nꞌime ọnụ ya. Were ya nye ha, ka ọ bụrụ ụtụ nke mụ na gị.”
← Chapter 16
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 18 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28