bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Revelation 1
Revelation 1
Igbo 1988
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 2 →
1
Ihe dị nꞌakwụkwọ a bụ mkpughe banyere ihe na-aga ime nꞌoge dị nꞌihu na ndụ Jisọs Kraịst. Ọ bụ Chineke nyere ya ike ka o site nꞌọhụ kpughee ya nye Jọn ohu ya. E sitere nꞌeluigwe zite mmụọ ozi bịara kọwaara Jọn ihe ọhụ ndị a ọ hụrụ pụtara.
2
Jọn nꞌonwe ya dere ihe nile ọ hụrụ na ihe nile ọ nụrụ nꞌakwụkwọ, bụ okwu ahụ nile Chineke na Jisọs Kraịst kwuru.
3
Ngọzi na-adịrị onye ọ bụla ga-agụpụta ihe e dere nꞌakwụkwọ amụma a nꞌụlọ nzukọ. Ọ ga-anata ngọzi pụrụ iche site nꞌaka Onyenwe anyị. Ndị nile ga-egekwa ntị mgbe a ga-agụpụta ha, ma meekwa ihe e kwuru, ga-enwetakwa ngọzi. Nꞌihi na oge a ga-emezu ihe ndị a dị oke nso.
4
Ọ bụ m Jọn na-ede akwụkwọ a nye nzukọ asaa dị nꞌobodo Tọkị. Ka amara na udo Chineke, onye ahụ dị ndụ ugbu a, na onye ga-adịgide ndụ gaa nꞌihu dịrị unu. Ka amara na-esitekwa nꞌebe Mmụọ asaa ahụ na-eguzo nꞌihu ocheeze ya dịrị unu.
5
Ka amara sitekwara nꞌebe Jisọs Kraịst nọ, onye sitere nꞌikwesị ntụkwasị obi ya kpughee eziokwu a nye anyị dịrị unu. Ya onwe ya bụ onye mbụ sitere na ndị nwụrụ anwụ bilite. Ọ gaghị anwụkwa ọzọ. Ọ dị elu karịa ndị eze nile nke ụwa. Ka otuto dịrị ya nꞌihi na ọ hụrụ anyị nꞌanya, na nꞌihi na o sitere nꞌọbara ọ wụsịrị dọpụta anyị site na mmehie anyị nile.
6
Mgbe o chịkọtasịrị anyị kpọbata anyị nꞌalaeze ya, o mere ka anyị bụrụ ndị nchụaja Nna ya bụ Chineke. Nꞌihi na ọ na-achị ruo mgbe nile ebighị ebi. Ka anyị nye ya otuto ruo mgbe nile ebighị ebi. Amin.
7
Lezie anya! Ọ na-abịa ọsịịsọ site nꞌigwe ojii. Anya nile ga-ahụkwa ya nꞌezie. Ee, ma ndị ahụ nile kpọrọ ya ntu, ha ga-ahụ ya. Mba nile dị nꞌụwa ga-eru uju kwaa akwa, maakwa jijiji nꞌụbọchị ahụ ọ ga-abịa. Ka ọ dịrịkwa otu a.
8
Abụ m Alfa na Omega, Mmalite na Ọgwụgwụ ihe nile. Ihe ndị a ka Chineke kwuru, onye bụ Onyenwe anyị, na onye nwezuru ike nile. Onye dị ugbu a, na onye dịrị site na mmalite, na onye gaje ịbịa ọzọ.
9
Ọ bụ mụ onwe m nwanne unu nwoke Jọn, onye unu na ya na-ahụrịta ahụhụ nꞌihi Onyenwe anyị, na-edere unu akwụkwọ a. Mụ onwe m esorola keta oke nꞌime ntachi obi Onyenwe anyị Jisọs na-enye. Anyị nile ga-esorokwa keta alaeze ya. Ma ọ bụ nꞌihi okwu Chineke ka e ji site nꞌebe ndị mmadụ bi zipụ m ka m gaa biri nꞌala Patmọs, ala ntakịrị mmiri gbara gburugburu. E zigara m nꞌebe ahụ nꞌihi na m kwusara okwu Chineke ma kọwaakwa eziokwu ahụ Jisọs kpughere nye anyị.
10
Nꞌụbọchị Onyenwe anyị, nke bụ ụbọchị Sọnde, mgbe m nọ na-ekpe ekpere, na mberede, anụrụ m oke olu tiri mkpu nꞌakụkụ m. Olu a dara ụda dị ka opi ike.
11
Olu ahụ tiri mkpu gwa m okwu sị, “Mụ onwe m bụ Mmalite na Ọgwụgwụ ihe nile.” Mgbe ahụ olu ahụ gwakwara m okwu sị, “Detuo ihe nile ị hụrụ nꞌakwụkwọ. I dechaa ya, ziga ha nye nzukọ Kraịst asaa ahụ dị nꞌala Tọkị. Ya bụ, nzụkọ dị nꞌEfesọs, na Smarna, na Pegamọs, na Tiatira, na Sadis, na Filadelfia, na Laodesia.”
12
Mgbe m chigharịrị lee anya ịhụ onye na-agwa m okwu, ahụrụ m oriọna asaa e tinyere nꞌihe na-ejide oriọna e ji ọlaedo kpụọ.
13
Nꞌetiti oriọna ndị a, ahụrụ m otu onye yiri Jisọs, onye kpọrọ onwe ya Nwa nke mmadụ, ka o guzo. O yikwasịrị onwe ya uwe mwụda. Ma o nwere akwa ọzọ na-acha dị ka ọlaedo e ji dụchie gburugburu ebe ahụ obi ya dị.
14
Agịrị isi ya na-acha vaa dị ka ogho. Anya ya abụọ na-enwụkwa dị ka ire ọkụ.
15
Ụkwụ ya abụọ na-enwụ enwụ dị akpụkpọ ụkwụ e hichapụrụ nke ọma. Okwu si ya nꞌọnụ na-ada wụaa wụaa dị ka ụda nnugharị ebili mmiri.
16
O jidere kpakpando asaa nꞌaka nri ya, mma agha dị nkọ nwere ihu abụọ sikwa nꞌọnụ ya na-apụta. Ihu ya na-egbu maramara dị ka anyanwụ wapụtara nꞌike ya dum.
17
Mgbe m hụrụ ya, adara m nꞌala nꞌụkwụ ya dị ka onye nwụrụ anwụ. Ma o weere aka nri ya metụ m nꞌahụ gwa m okwu sị, “Atụla egwu. Abụ m Mmalite na Ọgwụgwụ ihe nile.
18
Abụ m onye ahụ nwụrụ anwụ, ma na-adị ndụ. Ugbu a ana m adị ndụ ruo mgbe nile ebighị ebi. Ọ bụ m ji igodo ọkụ ala mmụọ na ọnwụ. Atụla egwu!
19
Detuo ihe nile ị hụrụ na nke a ga-ekpughere gị malite ugbu a.
20
Nke a bụ ihe kpakpando asaa ahụ ị hụrụ nꞌaka nri m, na oriọna asaa ndị ahụ pụtara. Kpakpando asaa ahụ bụ ndị mmụọ ozi ụlọ nzukọ asaa ahụ ị na-edegara akwụkwọ a. Osisi oriọna asaa ahụ bụ ụlọ nzukọ ndị ahụ nꞌonwe ha.
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 2 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22