bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Revelation 6
Revelation 6
Igbo 1988
← Chapter 5
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 7 →
1
Mgbe m nọ na-elegide ya anya, Nwa atụrụ ahụ nyakapụrụ akara nke mbụ dị nꞌakwụkwọ ahụ. Otu nꞌime ihe e kere eke anọ ahụ tiri mkpu dị ka a ga-asị na ọ bụ olu egbe eluigwe dara, gwa m okwu sị m, “Bịa”.
2
Mgbe m lere anya nꞌihu m, ahụrụ m inyinya dị ọcha. Onye ahụ na-anọkwasị nꞌelu ya ji ụta nꞌaka ya. A tụkwasịkwara okpu eze nꞌisi ya. Ọ bụkwa nꞌebe nile ka ọ na-ejegharị ibu agha na imeri emeri.
3
Emesịa, Nwa atụrụ ahụ nyakapụrụ akara nke abụọ dị nꞌakwụkwọ ahụ. Ngwangwa, anụrụ m ka ihe e kere eke nke abụọ tiri mkpu sị m, “Bịa”.
4
Nꞌoge a, inyinya ahụ na-acha ọbara ọbara gbapụtara. E nyere onye ahụ na-anọkwasị nꞌelu ya mma agha dị ogologo nyekwa ya ike ime ka udo hapụ ịdịkwa nꞌụwa. E nyekwara ya ike iwebata ọchịchị nke ndị na-emegide emegie nꞌime ụwa. Mgbe ahụ ibu agha dị iche iche na igbu mmadụ jupụtara nꞌebe nile.
5
Ma mgbe Nwa atụrụ ahụ nyakapụrụ akara nke atọ ahụ, anụrụ m olu nke ihe e kere eke nke atọ ka ọ na-akpọ m sị, “Bịa”. Ahụrụ m inyinya dị ojii. Onye na-anọkwasị nꞌelu ya ji ihe ọtụtụ abụọ nꞌaka ya.
6
Mgbe ahụ otu olu dara site nꞌetiti ihe e kere eke anọ ahụ dị ndụ sị, “Otu ogbe achịcha ka a na-ere naịra abụọ. Ma ka onye ọ bụla hapụ imebi mmanya na mmanụ”.
7
Mgbe a nyakapụrụ akara nke anọ ahụ, anụrụ m ka ihe e kere eke nke anọ ahụ gwara m okwu sị, “Bịa”.
8
Ahụrụ m inyinya na-adịghị ezi ọcha. Aha onye na-anọkwasị ya nꞌelu bụ ọnwụ, Inyinya ọzọ nke onye ọzọ a na-akpọ ọkụ ala mmụọ nọkwasịrị na-esokwa ya nꞌazụ. E kere ụwa ụzọ anọ, nyefee ha otu ụzọ nꞌaka, ka ha jiri ọnwụ na ọrịa na anụ ọhia gbuchapụ ndị nile bi nꞌime ha.
9
Ma mgbe a nyakapụrụ akara nke ise, ahụrụ m otu ebe ịchụ aja. Nꞌokpuru ebe ịchụ aja ahụ ka m hụrụ mkpụrụ obi ndị nile nwụrụ anwụ nꞌihi ozi ọma nke Chineke na nꞌihi na ha guzosịrị ike ịgba ama nke eziokwu na nke ndụ zuru oke.
10
Ha nile nọ na-eti oke mkpu na-akpọku Onyenwe anyị na-asị ya, “Gị Onyenwe anyị, Onyenwe ihe nile, Onye dị nsọ na Onye eziokwu, ọ̀ bu ruo ole mgbe ka ị na-eche ikpe ụwa na ndị bi nꞌime ya ikpe nꞌihi ajọ omume ha mesoro anyị? Ọ̀ bụ ruo ole mgbe ka ị na-eche ịbọrọ anyị ọbọ nꞌihi ọbara anyị ndị nile bi nꞌime ụwa wufuru?”
11
Nꞌotu oge ahụ, e yikwasịrị ha uwe dị ọcha nꞌotu nꞌotu. A gwakwara ha ka ha zuru ike nwa oge, tutuu ruo mgbe ụmụnna ha a ga-egbu nꞌihi ozi ọma Jisọs Kraịst ga-abịa soro ha dịkọọ ndụ ọzọ.
12
Anọkwa m na-ele anya mgbe Nwa atụrụ ahụ nyakapụrụ akara nke isii ahụ. Nke a mere ka oke ala ọma jijiji dịrị. Anyanwụ gbara ọchịchịrị dị ka akwa mkpe. E mekwara ka ọnwa chaa uhie uhie dị ka ọbara.
13
Mgbe ahụ, kpakpando dị na mbara eluigwe malitere ịdapụ nꞌala dị ka mkpụrụ osisi na-achaghị acha si adapụ mgbe oke ifufe na-efe.
14
Otu a, mbara eluigwe ahụ nke kpakpando jupụtara adịkwaghị, dị ka a ga-asị na a pịakọtara ya dị ka ute, wepụ ya. Ugwu nta nile na ugwu ukwu nile, na agwa etiti nile makwara jijiji, site nꞌọnọdụ ha wezuga onwe ha.
15
Ndị eze nile nke ụwa na ndị nọ nꞌọchịchị dị iche iche, na ndị ọgaranya, na ndị nọ nꞌọnọdụ dị elu, na ndị ọchịagha, na ndị mmadụ nile dị iche iche, ndị ukwu ma ndị nta, ndị ohu na ndị nwe onwe ha, ha nile gara zoo onwe ha nꞌime ọgba nkume na nꞌokpuru ugwu, na-eti mkpu na-arịọ ugwu ndị ahụ na-asị ha,
16
“Dakwasịnụ anyị, zoo anyị ka onye ahụ nọkwasị nꞌelu ocheeze ahụ hapụ ịhụ anyị, ka iwe nke Nwa atụrụ ahụ hapụ ịbịakwasị anyị.
17
Nꞌihi na, lee oke ụbọchị iwe ha abịala, onye pụrụ ịgbanarị ya?”
← Chapter 5
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 7 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22