bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Revelation 10
Revelation 10
Igbo 1988
← Chapter 9
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 11 →
1
Emesịa, ahụrụ m mmụọ ozi ọzọ dị oke egwu ka o si nꞌeluigwe rịdata. Igwe ojii gbara ya gburugburu. Eke na egwurugwu dịkwa ya nꞌisi. Ihu ya na-egbukwa maramara dị ka anyanwụ. Ụkwụ ya na-enwukwa dị ka ọkpụrụkpụ ọkụ.
2
O ji akwụkwọ ntakịrị a pịakọtara apịakọta nꞌaka ya. Otu ụkwụ ya, nke aka nri ya, ka ọ zọnyere nꞌime osimiri, ma ụkwụ nke aka ekpe ya ka ọ zọkwasịrị nꞌelu ala.
3
Mgbe mmụọ ozi ahụ ji oke olu, nke dara ụda dị ka ịgbọ ụja nke ọdụm, tie mkpu, egbe eluigwe asaa gbara otu mgbe ahụ zaghachi ya.
4
Mgbe m chọrọ idetu ihe egbe eluigwe ndị a kwuru, anụrụ m otu olu si nꞌeluigwe kpọọ m sị m, “Edela ihe ahụ nꞌakwụkwọ, nꞌihi na achọghị ka ndị ọzọ mata okwu ahụ egbe eluigwe ndị ahụ kwuru.”
5
Mgbe ahụ, mmụọ ozi ahụ dị ike nke zọkwasịrị ụkwụ ya nꞌelu osimiri, na nꞌala akọrọ ahụ, chiliri aka ya abụọ elu,
6
were onye ahụ na-anọkwasị nꞌocheeze ahụ ṅụọ iyi. Ya bụ onye ahụ kere eluigwe na ụwa, na ihe nile dị nꞌime ha, na oke osimiri, na ndị nile bi nꞌime ha, sị na oge ezuola. Na o kwesịkwaghị ka a tụfuo oge ọ bụla.
7
Mmụọ ozi ahụ sịkwara na mgbe mmụọ ozi nke asaa ahụ fụrụ opi ike ya, a ga-eme ka ihe omimi nile zoro ezo, nke Chineke sitere nꞌọnụ ndị amụma kwuo nꞌọgbọ gara aga, bụrụ ihe e mezuru emezu.
8
Mgbe ahụ otu olu sitere nꞌeluigwe gwa m okwu ọzọ sị, “Gaa napụta mmụọ ozi dị ike ahụ guzo nꞌelu oke osimiri na ala akọrọ akwụkwọ nta ahụ o ji nꞌaka ya.”
9
Ejekwuru m mmụọ ozi ahụ dị ike, rịọ ya ka o nye m akwụkwọ nta ahụ. Ọ zara m sị, “Lee ya, were ya taa ya. Mgbe ị na-ata ya nꞌọnụ gị, ọ ga-atọ gị ụtọ dị ka mmanụ aṅụ. Ma mgbe i lodara ya nꞌime afọ gị, ọ ga-elu gị ilu nꞌafọ.”
10
Ya mere, anaara m ya akwụkwọ nta ahụ taa ya. Dị ka o kwuru, mgbe m na-ata ya, ọ tọrọ m ụtọ nꞌọnụ ma mgbe m lodara ya nꞌafọ m, afọ bidoro ịtakasị m.
11
Emesịa mmụọ ozi ahụ gwara m okwu sị, “Ị ga-aga buo amụma nye ọtụtụ mmadụ, nꞌọtụtụ mba dị iche iche, nꞌime agbụrụ dị iche iche, nꞌasụsụ dị iche iche na nꞌihu ndị eze nile.”
← Chapter 9
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 11 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22