bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Revelation 5
Revelation 5
Igbo 1988
← Chapter 4
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 6 →
1
Emesịa, ahụrụ m akwụkwọ a pịakọtara apịakọta nke e dererị ihe nꞌime ya. Ọ dị nꞌaka onye ahụ nọkwasịrị nꞌelu ocheeze ahụ. A nyachikwara akwụkwọ a ụzọ asaa, kaakwa ya akara nꞌebe nile a nyachiri ya.
2
Otu mmụọ ozi dị oke ebube pụtara tie mkpu, na-ajụ ajụjụ na-asị, “Ọ̀ bụ onye nwere ike ịnyakapụ akara e jiri kechie akwụkwọ a a pịakọtara apịakọta?”
3
Ma ọ dịghị onye ọ bụla e nyere ike imeghepụ akwụkwọ ahụ nꞌime eluigwe ma ọ bụ nꞌime ụwa, ma ọ bụ site nꞌokpuru ụwa. O nweghị onye e nyere ike ịgụpụta ihe e dere nꞌime akwụkwọ ahụ.
4
Nꞌihi na o nweghị onye nwere ike meghee ya, ma ọ bụ gụpụta ihe e dere nꞌime akwụkwọ ahụ, akwara m akwa.
5
Ma otu onye nꞌime iri ndị okenye abụọ na anọ ahụ, nke nọkwasịrị nꞌocheeze nta ndị ahụ gbara ocheeze ukwu ahụ gburugburu gwara m okwu sị m, “Akwala akwa ọzọ. Lee ugbu a, Ọdụm ahụ si nꞌagbụrụ ndị Juda, nꞌime ezinụlọ Devidi, emeriela ndị iro ya nile. O gosila onwe ya dị ka onye nwere ike ịnyakapụ akara asaa ahụ dị nꞌakwụkwọ ahụ.”
6
Mgbe m lere anya, ahụrụ m otu Nwa atụrụ ka o guzo nꞌihu iri ndị okenye abụọ na anọ ahụ, nꞌihu ocheeze ukwu ahụ, na nꞌihu ihe e kere eke anọ ahụ. Nwa atụrụ ahụ nwekwara apa dị iche nꞌahụ ya, bụ nke mere ka ọ nwụọ nꞌoge ọ nwụrụ. O nwekwara mpi asaa na anya asaa nke nọ ọnọdụ mmụọ asaa nke Chineke, nke a na-ezipụ ịga nꞌebe dị iche iche nꞌime ụwa.
7
Nwa atụrụ a gara nꞌihu nke nta, nara akwụkwọ ahụ site nꞌaka nri onye ahụ na-anọkwasị nꞌelu ocheeze ahụ.
8
Mgbe Nwa atụrụ ahụ naara akwụkwọ ahụ, iri ndị okenye abụọ na anọ ahụ, ndị gbara ocheeze ukwu ahụ gburugburu dara nꞌala nꞌihu Nwa atụrụ ahụ. Ha nile nꞌotu nꞌotu jikwa opi na efere e ji ọlaedo mee, nke ihe na-esi isi ụtọ jupụtara nꞌime ha. Ihe na-esi isi ụtọ a bụkwa ekpere ndị nsọ.
9
Ha bụkuru Nwa atụrụ ahụ abụ ọhụrụ na-asị, “Nanị gị kwesịrị ịnara akwụkwọ ahụ na ịnyakapụ akara dị ya nꞌahụ. Nꞌihi na e gburu gị, ma i sitere nꞌọnwụ gị kpọtara Chineke ndị mmadụ, ndị si nꞌagbụrụ nile, na asụsụ nile, na ndị dị iche iche, na mba nile.
10
Ị chịkọtaala ha mee ha otu alaeze, na ndị nchụaja na-ejere Chineke anyị ozi. Ha ga-achịkwa achị nꞌụwa.”
11
Nꞌime ọhụ m, anụrụ m olu nke ọtụtụ ndị mmụọ ozi a na-apụghị ịgụta ọnụ ndị gbara ocheeze ahụ na ndị okenye ahụ nile gburugburu, ka ha na-abụ abụ na-asị,
12
“Nwa atụrụ ahụ e gburu kwesịrị ịnara ike nile, na akụ nile, na amamihe, na ume, na nsọpụrụ nile, na otuto nile na ngọzi nile!”
13
Mgbe ahụ anụrụ m ka ndị nile nọ nꞌeluigwe na ndị nọ nꞌụwa na ndị nọ nꞌokpuru ụwa, na ndị nọ nꞌokpuru oke osimiri na-eti mkpu na-asị, “Ka ngọzi nile, na nsọpụrụ nile, na otuto nile, na ike nile dịrị Onye ahụ na-anọkwasị nꞌocheeze ahụ, ha dịkwara Nwa atụrụ ahụ ruo mgbe ebighị ebi!”
14
Ihe e kere eke anọ ndị ahụ zakwara sị “Amin!” Iri ndị okenye abụọ na anọ ndị ahụ dakwara nꞌala nꞌihu ya kpọọ isi ala nye ya.
← Chapter 4
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 6 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22