bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Revelation 4
Revelation 4
Igbo 1988
← Chapter 3
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 5 →
1
Mgbe ihe ndị a gasịrị, eleliri m anya m elu hụ ọnụ ụzọ eluigwe ka e meghere ya. Ụda olu ahụ m nụrụ na mmalite dara ụda ọzọ, dị ka ụda opi ike sị m, “Bịa nꞌebe a ka m gosi gị ihe gaje ime nꞌoge dị nꞌihu.”
2
Mgbe ahụ, e mere ka m baa nꞌeluigwe nꞌime mmụọ m. Nꞌeluigwe, ahụrụ m ebube na ịma mma ya, hụkwa otu ocheeze na onye na-anọkwasị nꞌelu ya.
3
Ìhè dị ukwuu, nke na-egbu nweghenweghe dị ka mkpụrụ mmiri si nꞌahụ onye ahụ nọkwasịrị nꞌocheeze ahụ na-achapụta. Eke na egwurugwu, nke na-egbukwa amụma, gbara ocheeze ahụ gburugburu.
4
Iri ocheeze abụọ na anọ ọzọ, ndị dị nta, gbara ocheeze ukwu ahụ gburugburu. Ndị nọkwasịrị nꞌocheeze ndị a bụ iri ndị okenye abụọ na anọ, ndị yi uwe ọcha. Ha kpukwa okpu eze e ji ọlaedo kpụọ nꞌisi ha.
5
Mgbe ahụ ụda yiri ụda egbe eluigwe, ya na amụma na-egbuke egbuke sitere nꞌocheeze ukwu ahụ na-ada ma na-achapụtakwa. Nꞌihu ocheeze ukwu ahụ e nwere oriọna asaa na-enwụ ọkụ. Oriọna ndị a nọchiri ọnọdụ mmụọ asaa Chineke.
6
Ala dị nꞌihu ocheeze ahụ na-egbu nweghenweghe dị ka ebe a tụsara enyo e hichaziri nke ọma. Nꞌetiti ihu ocheeze ahụ na gburugburu ocheeze ahụ e nwere ihe e kere dị ndụ anọ dị ya. Ha nwere anya nꞌakụkụ ahụ ha nile, ihu na azụ.
7
Otu nꞌime ihe e kere eke ndị a nwere oyiyi dị ka ọdụm. Nke abụọ dị ka ehi. Nke atọ nwere ihu yiri nke mmadụ. Nke anọ dị dị ka ugo gbasapụrụ nku ya na-efe efe.
8
Nke ọ bụla nꞌime ihe e kere eke ndị a nwere nku isii. Nku dị nꞌetiti nku ndị a nwere anyị hiri nne. Ehihie nile na abalị nile ọrụ ha bụ iti mkpu na-asị, “Nsọ, Nsọ, Nsọ, ka Onyenwe anyị Chineke pụrụ ime ihe nile dị. Bụ onye ahụ dịrị nꞌoge gara aga, onye dị ugbu a, na onye ga-adị ruo mgbe nile ebighị ebi.”
9
Mgbe ihe e kere eke anọ ndị ahụ malitere inye onye ahụ na-anọkwasị nꞌelu ocheeze ahụ na-adị ndụ ruo mgbe nile ebighị ebi otuto nile, na nsọpụrụ nile, na ekele nile,
10
iri ndị okenye abụọ na anọ ahụ na-adakwa nꞌala nꞌihu ya na-efe ya ofufe, bụ onye ahụ na-adịgide ruo mgbe nile ebighị ebi. Ha nile nꞌotu nꞌotu na-atụda okpu eze ha nꞌihu ya na-abụ abụ na-asị,
11
“Ọ bụ nanị gị Onyenwe anyị na Chineke anyị kwesịrị ịnara otuto, na nsọpụrụ, na ike. Nꞌihi na ọ bụ gị kere ihe nile, ọ bụkwa site nꞌọchịchọ gị ka e ji kee ha, ma meekwa ka ha dịrị ndụ.”
← Chapter 3
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 5 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22