bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Revelation 13
Revelation 13
Igbo 1988
← Chapter 12
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 14 →
1
Mgbe ahụ, ahụrụ m otu anụ ọhia buru ibu, ka o si nꞌime oke osimiri na-arịpụta. Anụ ọhia a nwere isi asaa na mpi iri. Okpu eze iri dịkwa nꞌelu mpi ndị a. Aha e dekwasịrị nꞌisi asaa ahụ nꞌotu nꞌotu bụ aha ikwutọ na ikwuhie Chineke.
2
Anụ ọhia a m hụrụ dị ka agụ, ụkwụ ya dị ka ụkwụ anụ bi na mmiri, o nwekwara ọnụ dị ka nke ọdụm. Agwọ ochie ahụ nyere ya ike, nyekwa ya ocheeze ya na ike ịchị isi.
3
Ahụkwara m na otu nꞌime isi asaa ahụ o nwere bu ọnya nke pụrụ ime ka ọ nwụọ, ma e mere ka ọnya ahụ laa. Nke a juru ndị nile nọ nꞌụwa anya, mee ka ha na-esogharị anụ ọhia a ka ha leruo ya anya.
4
Ha kpọrọ isi ala nye agwọ ochie ahụ nꞌihi na o nyere anụ ọhia ahụ ike dị otu a. Ha bidokwara ịkpọ isi ala nye anụ ọhia ahụ, na-asị, “Ebee ka onye ahụ nọ, nke dị ukwuu karịa ya? Ònye pụkwara ibu agha megide ya?”
5
Mgbe ahụ agwọ ochie ahụ gbara anụ ọhia ahụ ume ikwu okwu nkwulu megide Onyenwe anyị. O nyekwara anụ ọhia ahụ ike ịchị isi nꞌelu ụwa afọ atọ na ọnwa isii.
6
Nꞌime afọ atọ na ọnwa isii ndị a anụ ọhia ahụ kwuluru aha Chineke na ụlọ nsọ ya na ndị nile bi nꞌeluigwe.
7
Agwọ ochie ahụ nyere ya ike ibu agha megide ndị Chineke na imeri ha. O nyekwara ya ike ịchị ebo nile na asụsụ nile dị nꞌebe nile ụwa sọtụrụ.
8
Mmadụ nile kpọrọ isi ala nye ya, bụ ndị ahụ a na-edeghị aha ha nꞌakwụkwọ nke ndụ Nwa atụrụ ahụ, onye Chineke mere site na ntọ ala nke ụwa ka ọ bụrụ onye a ga-akpọgbu.
9
Ọ bụrụ na onye ọ bụla chọrọ ịnụ ihe, ya nụrụ.
10
Ụmụ Chineke ndị e buru ụzọ gbaa ama na a ga-adọta ha nꞌagha, ọ bụ ha ka a ga-adọtakwa nꞌagha, ma ndị a gbara ama na ha ga-anwụ ka a ga-egbukwa. Ka obi ghara ịlọ unu mmiri nꞌihi na nke a bụ ohere unu nwere igosi ntachi obi unu na okwukwe unu.
11
Mgbe ahụ kwa, ahụrụ m anụ ọhia ọzọ dị iche nke nwere mpi nta abụọ dị ka mpi Nwa atụrụ ahụ. Kama olu ya yiri olu agwọ ochie ahụ. Ọ bụ anụ ọhia na-eme ka ụjọ tụọ ndị lekwasịrị ya anya. O sikwa nꞌime ala pụta.
12
E nyere ya ike ịchị isi nke anụ ọhia ahụ ọnya dị nꞌotu isi ya nwere. Ọ bụkwa ike a ka o ji kwagịde ndị nile bi nꞌụwa ka ha kpọọ isi ala nye anụ ọhia ahụ.
13
Anụ ọhia a si nꞌime ala pụta rụrụ ọtụtụ ọrụ ịtụ nꞌanya dị iche iche. O mere ka ọkụ si na mbara eluigwe daa nꞌụwa nꞌihu mmadụ nile.
14
Ọ na-arụ ọrụ ịtụnanya a mgbe ọ bụla anụ ọhia nke mbụ nọ na-ele ya anya. Ọ na-arụkwa ọrụ ndị a iji ya iduhie mmadụ nile nọ nꞌebe nile. O nyekwara iwu ka ndị nile bi nꞌụwa kpụọ ihe yiri anụ ọhia nke mbụ ahụ nwere ọnya gaara ewetara ya ọnwụ nꞌotu isi ya, bụ anụ ọhia e mekwara ka ọnya ya laa.
15
E nyere anụ ọhia nke abụọ a ike ikunye ume ndụ nꞌime ihe ahụ a kpụrụ akpụ. E nyekwara ya ike ime ka o kwuo okwu. Mgbe a kpụsịrị ihe ahụ kunye ya ume ndụ, ihe a a kpụrụ akpụ nyere iwu ka e gbuo onye ọ bụla jụrụ ife ya onwe ya ofufe.
16
O nyere iwu ka a kaa onye ọ bụla akara nꞌaka nrị ma ọ bụ nꞌegedege ihu, onye ọ bụla, ma onye ukwu ma onye nta, ọgaranya na ogbenye, ohu na onye nwe onwe ya.
17
Ọ dịghị onye ọ bụla nwere ike inweta ọrụ ma ọ bụ ịzụ ahia ma ọ bụ ree ahia ma ọ bụrụ na onye ahụ enweghị akara a, nke bụ aha anụ ọhia ahụ, ma ọ bụ ihe e ji mara ya, nke bụ ọnụ ọgụgụ aha ya.
18
Ihe dị nꞌebe a chọrọ ka e jiri amamihe nyochaa ya. Ka onye ọ bụla nwere ọgụgụ isi jiri uche ya sụgharịa ihe ọnụ ọgụgụ a pụtara. Nꞌihi na ọnụ ọgụgụ a nọchiri anya aha otu onye. Ihe ọnụ ọgụgụ ahụ nọchikwara aha ya bụ narị isii na iri isii na isii, ya bụ 666.
← Chapter 12
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 14 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22