bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Revelation 7
Revelation 7
Igbo 1988
← Chapter 6
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 8 →
1
Mgbe ihe ndị a gasịrị, ahụrụ m ndị mmụọ ozi anọ ka ha guzo nꞌakụkụ anọ nke ụwa. Ha na-egbochikwa ka ifufe ọ bụla ghara ife nꞌelu ala, na nꞌelu osimiri, na nꞌelu osisi.
2
Mgbe ahụ ahụkwara m mmụọ ozi ọzọ ka o si nꞌọwụwa anyanwụ na-apụta. Akara Chineke dị ndụ dịkwa nꞌaka ya. O tikuru ndị mmụọ ozi anọ ahụ mkpu, bụ ndị ahụ e nyere ike imekpa ụwa ahụ, ya na oke osimiri na ihe nile dị nꞌime ha, sị ha,
3
“Cherenụ! Unu emekwala ihe ọ bụla ugbu a. Unu emekwala ihe ọjọọ nꞌụwa ma ọ bụ nꞌoke osimiri ma ọ bụ nꞌosisi ọ bụla, tutuu ruo mgbe anyị ga-akakwasị ndị nile na-ejere Chineke ozi akara Chineke nꞌegedege ihu ha.”
4
Mgbe a kasịrị ha akara ndị a, anụrụ m ọnụ ọgụgụ ndị natara akara ahụ. Ha dị narị puku mmadụ, na iri puku mmadụ anọ na anọ. E sitere nꞌebo iri na abụọ nke ndị Izirel họpụta ha. Ndị sitere nꞌebo Juda dị puku mmadụ iri na abụọ. Ndị si nꞌebo Ruben dịkwa puku mmadụ iri na abụọ. Puku mmadụ iri na abụọ sikwa nꞌebo Gad. E sitekwara nꞌebo Asha họpụta puku mmadụ iri na abụọ. Ndị si nꞌebo Naftali dị puku mmadụ iri na abụọ. Ọ bụkwa puku mmadụ iri na abụọ ka e si nꞌebo Manase họpụta. Ndị si nꞌebo Simiọn dị puku mmadụ iri na abụọ. Otu a kwa a họpụtara puku mmadụ iri na abụọ site nꞌebo Livayị. Ndị si nꞌebo Isaka dị puku mmadụ iri na abụọ. Ọ bụkwa puku mmadụ iri na abụọ ka e si nꞌebo Zebulọn họpụta. Puku mmadụ iri na abụọ si nꞌebo Josef. Ndị sikwa nꞌebo Benjamin pụta dị puku mmadụ iri na abụọ.
9
Mgbe ihe ndị a gasịrị, ahụrụ m igwe mmadụ, ndị dị ọtụtụ nꞌọnụ ọgụgụ. Ha sitere na mba dị iche iche na ebo dị iche iche, na asụsụ dị iche iche. Ha guzo nꞌihu ocheeze ahụ na nꞌihu Nwa atụrụ ahụ. Ha yikwasịrị onwe ha uwe dị ọcha, jirikwa igu nkwụ nꞌaka ha.
10
Ha nile nọ na-eti mkpu nke ukwuu na-asị, “Nzọpụta na-abịa site nꞌaka Chineke anyị onye nọ nꞌelu ocheeze ya. Ọ na-abịakwa site nꞌaka Nwa atụrụ ahụ.”
11
Mgbe ihe ndị a na-eme, ndị mmụọ ozi nile bịara nso ocheeze ahụ na-agba ya gburugburu, na-agbakwa ocheeze ndị okenye ahụ gburugburu na ihe e kere eke anọ ahụ dị ndụ. Ndị mmụọ ozi ndị a nile na-akpọkwa isi ala nꞌihu Onye ahụ nọ nꞌocheeze ahụ. Ha na-efekwa Chineke ofufe, na-asị,
12
“Amin! Ngọzi na amamihe nile na ekele nile na nkwanye ugwu nile, na ike nile, na ebube nile dịrị Chineke anyị ruo mgbe nile ebighị ebi. Amin.”
13
Mgbe ahụ, otu nꞌime iri ndị okenye abụọ na anọ ahụ jụrụ m ajụjụ sị m, “Ị maara ndị ndị a bụ, ndị a e gbokwasịrị uwe ọcha ahụ? Ebee ka ha siri pụta?”
14
Azara m sị ya, “Amaghị m, Onyenwe m, biko kọwaara m ndị ha bụ”. Ọ zara m sị m, “Ndị a bụ ndị sitere nꞌime oke mkpagbu ahụ pụta. Ha bụ ndị sachara uwe ha, mee ha ka ha dịrị ọcha site nꞌọbara Nwa atụrụ ahụ.
15
Ọ bụ nke a mere ha ji guzoro nꞌihu ocheeze Chineke na-efe ya ofufe ehihie na abalị nꞌime ụlọ nsọ ya. Onye ahụ na-anọkwasị nꞌelu ocheeze ahụ ga-ekpuchikwa ha, mee ka agụụ ghara ịgụ ha ọzọ.
16
Akpịrị agaghị akpọkwa ha nkụ mgbe ọ bụla. A ga-eche ha nche ka okpomọkụ ọ bụla ghara irute ebe ha nọ. Anyanwụ agaghị amakwasịkwa ha ọzọ.
17
Nꞌihi na Nwa atụrụ ahụ guzo nꞌihu ocheeze ahụ ga-azụ ha dị ka atụrụ. Ọ ga-edurukwa ha jee nꞌisi mmiri nke ndụ ahụ. Chineke ga-ehichapụkwa anya mmiri ọ bụla site nꞌanya ha.”
← Chapter 6
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 8 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22