bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Revelation 22
Revelation 22
Igbo 1988
← Chapter 21
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
1
Emesịa, mmụọ ozi ahụ gosiri m iyi ahụ e si ekute mmiri na-enye ndụ. Mmiri a na-acha nnọọ vaaa dị ka enyo. O sikwa nꞌokpuru ocheeze Chineke na Nwa atụrụ ahụ na-asọpụta.
2
O si ebe ahụ na-asọ bịa gafee nꞌetiti okporo ụzọ ahụ dị nꞌobodo ahụ. Nꞌakụkụ aka nri na aka ekpe iyi ahụ a ga-ahụ osisi ahụ na-enye ndụ. Osisi ndị a na-amị ụzọ mkpụrụ iri na abụọ dị iche iche. Ha na-amịpụta mkpụrụ ọhụrụ kwa ọnwa ọ bụla. Akwụkwọ osisi ahụ wapụtara bụ ọgwụ e ji agwọ mba nile.
3
A gaghị achọpụta ihe ọ bụla Chineke bụrụ ọnụ nꞌime obodo ahụ. Ocheeze Chineke na nke Nwa atụrụ ahụ ga-adị nꞌobodo ahụ. Ndị ohu ya ga-efekwa ya ofufe.
4
Ha ga-ahụkwa ihu ya, a ga-edekwa aha ya nꞌegedege ihu ha.
5
Abalị agaghị adịkwa nꞌebe ahụ, ịmụnye oriọna agaghị adịkwa mkpa. Mkpa ìhè anwụ na-enye agaghị adịkwa nꞌihi na Onyenwe anyị Chineke ga-abụ ìhè ha, ha ga-achịkwa achị dị ka eze ruo mgbe ebighị ebi.
6
Mgbe ahụ mmụọ ozi ahụ gwara m okwu sị m, “Okwu ndị a kwesịrị ka a tụkwasị ha obi. Ha bụkwa eziokwu. Onyenwe anyị Chineke, onye na-enye ndị amụma Mmụọ ya ezitela mmụọ ozi ya ịgwa gị ihe ndị ahụ ga-emezu nꞌoge na-adịghị anya.
7
“Lee, ana m abịa ọsịịsọ. Ngọzi na-adịrị onye ahụ na-edebe okwu amụma ndị a dị nꞌakwụkwọ a!”
8
Mụ onwe m bụ Jọn hụrụ ihe ndị a nile, nụkwa ha na ntị m. Mgbe m dara nꞌala ịkpọ isi ala nye mmụọ ozi a ziri m ozi ndị a,
9
ọ gwara m okwu ọzọ sị m, “Emela ihe dị otu ahụ! Mụ onwe m bụkwa onyeozi Jisọs dị ka gị onwe gị, na dị ka ụmụnna gị ndị amụma, na dị ka ndị ahụ nile na-edebe okwu nile e dere nꞌakwụkwọ a. Ọ bụ nanị Chineke ka ị ga-akpọ isi ala nye.”
10
Mgbe ahụ ọ dọrọ m aka na ntị sị m, “Ekpuchila okwu amụma ndị a dị nꞌakwụkwọ a, nꞌihi na oge mmezu ha adịla nso.
11
Ka ndị nile na-eme ajọ omume gaa nꞌihu na-eme ajọ omume ha, ka ndị na-adịghị ọcha gaa nꞌihu bụrụ ndị na-adịghị ọcha, ka ndị na-eme ezi ihe gaa nꞌihu na-eme ezi ihe, ka ndị dị nsọ gaa nꞌihu bụrụ ndị dị nsọ.”
12
“Lee, ana m abịa ọsịịsọ! Ụgwọ ọrụ m ga-enye onye ọ bụla dị ka ọrụ ọ rụrụ si dị dịkwa m nꞌaka.
13
Abụ m Alfa na Omega, Mmalite na Ọgwụgwụ, Onye buru ụzọ dịrị na onye na-adịgidekwa.
14
Ngọzi na-adịrị ndị ahụ sara uwe ha mmiri, ka ha si otu a bụrụ ndị na-enweta òke na mkpụrụ si nꞌosisi ahụ na-enye ndụ, ndị ga-enwe ike isite nꞌọnụ ụzọ baa nꞌobodo ahụ.
15
Nꞌazụ obodo ka ndị ahụ bụ nkịta nọ, ha na ndị nile na-agba aja, na ndị nile na-akwa iko, na ndị nile na-egbu mmadụ, na ndị nile na-ekpere arụsị, na ndị nile hụrụ ụgha nꞌanya ma na-emekwa ya.
16
“Mụ onwe m bụ Jisọs ezitela mmụọ ozi m ka ọ gwa gị ihe ị ga-agwa nzukọ m nile. Ọ bụ m bụ Mgbọrọgwụ ji Devidi ndụ, na onye si nꞌagbụrụ ya pụta. Abụkwa m Kpakpando ụtụtụ ahụ, nke na-enwụ ezi onwụnwụ.”
17
Mmụọ Nsọ na nwanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ na-asị, “Bịa!” Ka onye ọ bụla nụrụ ịkpọ oku ha kpọkuokwa ndị ọzọ sị ha, “Bịa!” Onye akpịrị na-akpọ nkụ ya bịa. Onye ọ bụla chọrọ ya bịa ṅụrụ mmiri na-enye ndụ nꞌefu, na-akwụghị ụgwọ ọ bụla.
18
Ana m adọ onye ọ bụla nụrụ okwu amụma dị nꞌakwụkwọ a aka na ntị sị, Ọ bụrụ na onye ọ bụla atụkwasị ihe ọ bụla nꞌakwụkwọ a, Chineke ga-atụkwasịrị ya ihe otiti ahụ nile e kwuru okwu ha nꞌakwụkwọ a.
19
Ọ bụrụkwa na onye ọ bụla ewepụ okwu ọ bụla nꞌakwụkwọ amụma a, Chineke ga-ewepu òke o nwere nꞌosisi ahụ na-enye ndụ, na òke o nwere nꞌobodo nsọ ahụ, nke e kwuru okwu ha nꞌakwụkwọ a.
20
Onye ahụ gbara ama ndị a nile na-asị, “Nꞌezie, ana m abịa ọsịịsọ.” Amin. Bịa, Onyenwe anyị Jisọs.
21
Ka amara Onyenwe anyị Jisọs dịnyere unu nile. Amin.
← Chapter 21
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22