bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Revelation 19
Revelation 19
Igbo 1988
← Chapter 18
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 20 →
1
Mgbe ihe ndị a gasịrị, anụrụ m ụzụ nke ọtụtụ igwe mmadụ nꞌeluigwe. Ha nile na-eti mkpu na-asị, “Haleluya, keleenụ Onyenwe anyị. Ọ bụ nꞌaka Chineke anyị ka nzọpụta si bịa, ọ bụkwa nanị ya ka nsọpụrụ na ike nile dịrị.
2
Nꞌihi na ikpe ikpe ya nile ziri ezi, bụrụkwa eziokwu. Ọ taala nwanyị ahụ na-akwa iko, na onye jiri mmehie ya merụọ ụwa ahụhụ. Ọ bọọlara ndị ohu ya e gburu egbu ọbọ.”
3
Olu iti mkpu ha gakwara nꞌihu na-ada, na-asị, “Ka otuto dịrị Onyenwe anyị. Nꞌihi na anwụrụ ọkụ si nꞌobodo ahụ a kpọrọ ọkụ na-arigo ruo mgbe ebighị ebi.”
4
Mgbe ahụ iri ndị okenye abụọ na anọ ahụ, ha na ihe e kere eke anọ ahụ dara nꞌala nꞌihu Chineke Onye nọkwasịrị nꞌelu ocheeze ukwu ahụ, fee ya ofufe na-asị, “Ka o si otu a dịrị! Haleluya! Toonụ Onyenwe anyị!”
5
Otu olu sitekwara nꞌocheeze ahụ kwuo okwu sị, “Toonụ Chineke unu ndị ohu ya, ndị ukwu na ndị nta, unu ndị na-atụ egwu ya.”
6
Mgbe ahụ, anụkwara m ihe yiri ụzụ nke ọtụtụ ndị mmadụ. Nꞌezie, ụzụ a dara dị ka ụzụ nke mmadụ na-anụ mgbe ebili mmiri na-amagharị nꞌoke osimiri. Ọ dakwara dị ka ụzụ nke egbe eluigwe. Ma ihe ndị na-eme ụzụ a na-eti mkpu na-ekwu bụ, “Toonụ Onyenwe anyị. Nꞌihi na Onyenwe anyị Chineke anyị na-achị achị ugbu a.
7
Ka anyị ṅụrịanụ ọṅụ, ka obi tọọkwa anyị ụtọ. Ka anyị sọpụrụkwanụ ya nꞌihi na oge mmemme ọlụlụ di na nwụnye nke Nwa atụrụ ahụ eruola, nwụnye ya edoziekwala onwe ya.
8
E nyela ya ike iyikwasị onwe ya akwa mara mma nke na-enweghị ntụpọ ọ bụla, na nke dị nnọọ ezi ọcha. Nꞌihi na akwa ọcha ahụ nọchiri anya ọrụ ọma nke ndị Chineke rụrụ.”
9
Mmụọ ozi ahụ kwa gwara m okwu sị m dee ihe ndị a nꞌakwụkwọ: “Ngọzi na-adịrị ndị ahụ a kpọrọ ka ha bịa soro nꞌoriri ọlụlụ nwụnye Nwa atụrụ ahụ.” Ọ gwakwara m sị, “Okwu a i deturu ugbu a bụ okwu Chineke nꞌonwe ya kwuru.”
10
Mgbe ọ gwasịrị m okwu a, adara m nꞌala nꞌụkwụ ya ịkpọ isi ala nye ya, ma ọ gwara m sị, “O kwesịghị ka ị kpọọ isi ala nye m nꞌihi na abụ m nanị onyeozi Chineke dị ka gị onwe gị, na dị ka ọtụtụ ụmụnna gị ndị na-agba ama banyere okwukwe ha nwere nꞌime Jisọs. Ọ bụ nanị Chineke ka i kwesịrị ịkpọ isi ala nye. Nꞌihi na isi amụma nile na isi ihe ndị a nile m ziri gị bụ ịgwa gị ihe banyere Jisọs.”
11
Mgbe ahụ kwa elere m anya hụ ka eluigwe meghere. Ahụkwara m otu inyinya dị ọcha guzo nꞌebe ahụ. Onye nọkwasịrị nꞌelu ya bụ onye a kpọrọ aha ya Onye kwesịrị ntụkwasị obi na Onye eziokwu. Ọ bụ onye na-ebu agha na onye na-enye ahụhụ nꞌụzọ ziri ezi.
12
Anya ya na-acha dị ka ire ọkụ. Ọtụtụ okpu eze dịkwa ya nꞌisi. Otu aha nke nanị ya maara omimi ya ka e dekwasịrị ya nꞌegedege ihu.
13
E gbokwasịrị ya uwe mwụda e denyere nꞌọbara. Aha a na-akpọ ya bụ Okwu Chineke.
14
Ụsụ ndị agha nke eluigwe, ndị yi uwe dị nnọọ ezi ọcha, nke na-enwụkwa enwụ, na-esokwa ya nꞌazụ. Ha nọkwasịrị nꞌelu inyinya na-acha ọcha.
15
Ọ kpụ mma agha dị nkọ nꞌọnụ ya, nke o ji egbutu mba nile. Ọ ga-ejikwa aka ike chịa ha. Ọ bụkwa ọrụ ya ime ka mba nile nụrụ ụfụ iwe Chineke Onye pụrụ ime ihe nile. Nꞌihi na mmeso ọ ga-emeso ha ga-adị ka a ga-asị na o ji ụkwụ ya na-azọpịasị mkpụrụ vaịnị dị na mbadamba ala ebe a na-anọ azọcha mkpụrụ vaịnị.
16
Otu aha ka e dere nꞌelu uwe ya na nꞌelu apata ya. Ọ bụ, Eze ndị eze nile, na Onyenwe ndị nwe mmadụ nile.
17
Mgbe ahụ ahụrụ m otu mmụọ ozi ka o guzo nꞌime anyanwụ na-eti mkpu nꞌoke olu na-akpọku ụmụ nnụnụ nile na-efe na mbara eluigwe na-asị ha, “Bịanụ! Zukọọnụ! Nꞌihi na Chineke dị ukwuu na-akpọ unu oriri anyasị.
18
Bịanụ soro rie anụ ahụ ndị eze, na ndị ọchịagha, na ndị isi agha. Sorokwanụ rie anụ ahụ inyinya na anụ ahụ ndị nọkwasịrị nꞌelu ha. Riekwanụ anụ ahụ ndị mmadụ, ndị ukwu na ndị nta, ndị ohu na ndị nwere onwe ha.”
19
Mgbe ahụ ahụrụ m anụ ọhịa ọjọọ ahụ ya na ndị eze nile dị nꞌụwa, na ndị agha ha, ka ha zukọtara ibu agha megide onye ahụ nọkwasịrị nꞌelu inyinya ọcha ahụ, na megide ndị agha ya.
20
Ma e jidere anụ ọhịa ọjọọ ahụ, ya na onye amụma ụgha ahụ nwere ike ime ihe ịtụnanya mgbe ọ bụla anụ ọhịa ọjọọ ahụ nọ nsọ. Ọrụ ịtụnanya nke o ji duhie ndị nile nwere akara anụ ọhịa ahụ, na ndị kpọrọ isi ala nye oyiyi ya. Ha abụọ, anụ ọhịa ahụ, na onye amụma ụgha ya, ka a tụnyere nꞌime ọdọ ọkụ ahụ e ji nkume na-enwụ ọkụ kwanye.
21
Ndị agha ha nile ka e jikwa mma agha dị nkọ, nke dị nꞌọnụ onye ahụ nọ nꞌelu inyinya ọcha ahụ gbuo. Ụmụ anụ ufe nile nke eluigwe rikwara ozu ha dị ka ha nwere ike iri.
← Chapter 18
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 20 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22