bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Revelation 2
Revelation 2
Igbo 1988
← Chapter 1
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 3 →
1
“Dee akwụkwọ nye mmụọ ozi ụlọ nzukọ dị nꞌEfesọs. Ihe ndị a ka ị ga-agwa ya, “Akwụkwọ a m na-edere gị bụ nke m ji ezi gị ozi onye ahụ na-ejegharị nꞌụlọ nzukọ ziri, onye ahụ ji ndị ndu ụlọ nzukọ ndị a nꞌaka ya. Leenụ ihe o kwuru.
2
Amaara m ihe nile banyere ọrụ ọma gị nile. Ahụkwala m ịrụsị ọrụ ike gị na ntachi obi gị. Amaara m na ị dịghị anabata ma na-anagịde mmehie nꞌetiti ndị gị. Ị nwapụtakwala okwu nke ndị nile na-akpọ onwe ha ndị ozi, ma ha abụghị ndị ozi nꞌezie, na-ekwu. Ị chọpụtala ekwesịghị ntụkwasị obi ha.
3
I jirila ntachi obi hujuo anya nꞌihi m, ma ike agwụghị gị.
4
“Ma nke a bụ ihe m nwere megide gị. Ị hapụla ịhụnanya mbụ ahụ i nwere nꞌebe m bọ. Ị hụkwaghị m nꞌanya dị ka i hụrụ m na mmalite.
5
Chee echiche nke ọma banyere ịhụnanya i nwere nꞌebe m nọ na mmalite, ma laghachi azụ nꞌime ya. Malite ịrụsị ọrụ ike dị ka i mere na mmalite. Ọ bụrụ na i meghị otu a, aga m abịakwute gị wepụ oriọna nọchiri anya gị nꞌebe ọ dị nꞌetiti oriọna ndị ọzọ.
6
“Ọ bụladị otu a, o nwere ihe ụfọdụ dị mma banyere gị. Ị kpọrọ ọrụ ọjọọ nke ndị Nikolaitan asị, dị ka mụ onwe m si kpọọ ya asị.
7
“Onye ọ bụla chọrọ ịnụ ihe Mmụọ Nsọ na-agwa nzukọ Onyenwe anyị kwesịrị ime ka ozi a baa ya nꞌime ntị. Onye ahụ na-emeri emeri ka m ga-enye mkpụrụ mbụ sitere nꞌosisi ahụ na-enye ndụ, nke bụ ebe izuike nke Chineke.
8
“Degara mmụọ ozi ụlọ nzukọ dị na Smarna akwụkwọ a. Ozi dị nꞌakwụkwọ a sitere nꞌaka onye ahụ bụ Mmalite na Ọgwụgwụ ihe nile. Onye nwụrụ anwụ ma na-adịkwa ndụ ọzọ.
9
“Amaara m ụzọ nile i si taa ahụhụ nꞌihi Onyenwe anyị. Ọzọ kwa, amaara m ihe banyere ndọgbu i na-adọgbu onwe gị nꞌọrụ, na ọnọdụ ogbenye gị. Ma nꞌezie, i nwere akụ dị ukwuu nꞌeluigwe. Amaara m ihe banyere nkwutọ nile ndị na-emegide gị na-ekwutọ gị, nkwutọ nke ndị ahụ kpọrọ onwe ha ndị Juu, na ụmụ Chineke, ndị na-abụghị ụmụ Chineke, kama ha bụ ndị na-akwagide ọrụ ekwensu.
10
Atụkwala egwu nꞌihi ihe ahụ gaje ịbịakwasị gị. Nꞌihi na ekwensu nꞌonwe ya gaje ime ka a tụba ụfọdụ nꞌime ndị gị nꞌụlọ mkpọrọ ka o jiri ya nwaa gị. A ga-akpagbu gị abalị iri. Ma guzosie ike, ọ bụladị mgbe ọnwụ ga-abịakwasị gị. Emesịa, aga m enye gị okpu nke ndụ ahụ.
11
Ka onye ọ bụla chọrọ ịnụ ihe nụrụ ihe Mmụọ Nsọ na-agwa nzukọ nke Onyenwe anyị. Ọnwụ nke ugbo abụọ agaghị emekpa onye ọ bụla na-emeri emeri ahụ.
12
“Dee akwụkwọ a nye mmụọ ozi ụlọ nzukọ dị na Pegamọs sị ya, “Nke a bụ ozi si nꞌọnụ onye ahụ jidere mma agha ukwu ahụ nwere ihu abụọ ahụ nꞌaka ya.
13
Amaara m nke ọma na i bi nꞌime obodo ebe ekwensu wukwasịrị ocheeze ya. Ọ bụkwa eziokwu na ekwensu gbara ofufe gị gburugburu. Ma ị na-anọgidesị ike nꞌime m. Ị jụrụ ịgọnarị m ọ bụladị nꞌoge Antipas ohu m ahụ kwesịrị ntụkwasị obi tọgbọrọ ndụ ya nꞌihi m site nꞌaka ndị na-ejere ekwensu ozi.
14
“Ma e wezụga ezi ama ndị a, enwere m ihe ụfọdụ megide gị. Ị na-akwagide ụfọdụ nꞌetiti ndị m bụ ndị na-eme omume dị ka Belam, onye ziri Balak otu ọ ga-esi merụọ ụmụ Izirel site nꞌiduba ha na mmehie ịkwa iko na oriri mmemme dị iche iche a na-emere arụsị.
15
Nꞌezie, ụfọdụ nꞌime ndị gị na-ejidesi ozizi ọjọọ a aka ike. Ndị dị otu a bụ ndị na-eso ụzọ Belam nꞌetiti ndị gị.
16
Ma ọ bụrụ na i chigharịghị site nꞌechiche na omume ọjọọ gị, aga m abịakwute gị na meberede jiri mma agha dị m nꞌọnụ tigbuo gị.
17
“Ka onye ọ bụla chọrọ ịnụ ihe gee ntị nꞌihe Mmụọ Nsọ na-agwa nzukọ Kraịst. Ọ bụ nanị ndị na-emeri emeri ga-eri achịcha ahụ e zoro ezo, nke bụ ihe oriri ndị nọ nꞌeluige. Ha nile nꞌotu nꞌotu ka m ga-enye ezi nkume ọcha ahụ. A ga-edekwasị aha ọhụrụ nꞌelu nkume ahụ, nke onye ọ bụla ọzọ na-agaghị amata, karịa onye ahụ ga-anata ya.
18
“Dee akwụkwọ a nye mmụọ ozi ụlọ nzukọ dị na Tiatira. Nke a bụ ozi sitere nꞌaka Ọkpara Chineke onye anya ya na-enwụba nꞌebe nile dị ka ire ọkụ. Ụkwụ ya kwa na-egbu maramara dị ka akpụkpọ ụkwụ e hichara nke ọma.
19
“Nke a bụ ihe o kwuru. Amaara m ezi ọrụ gị nile, tinyere obi ebere i nwere nꞌebe ndị ogbenye nọ. Ahụkwara m onyinye ọma ị na-enye ha, na ije ozi ị na-ejere ha. E wezụga ihe ndị a, amaara m ịhụnanya gị, na okwukwe gị, na ntachi obi gị. Ahụkwara m ịnụ ọkụ nke obi gị, na ezi ọchịchọ dị nꞌime gị imezu ha.
20
“Ma enwere m ihe ndị a megide gị. Ị na-anabata nwanyị ahụ a na-akpọ Jezibel, onye na-ekwupụta na ya bụ onye amụma nwanyị, onye na-akụziri ndị m na mmehie ịkwa iko bụ ihe ziri ezi. Ọ na-akwagide ha ka ha na-akwa iko, na-akụzikwara ha ka ha na-eri ihe a chụrụ nꞌịta nye arụsị.
21
Enyela m nwanyị a oge kwesịrị ka o site nꞌechiche ọjọọ ya na omume amaghị Chineke ya pụta chegharịa. Ma o sitela na mpako nke obi ya hapụ ichegharị.
22
Ugbu a gee ntị nꞌihe m chọrọ ikwu. Aga m etinye ya nꞌute ọrịa ebe ọ ga-anọ nꞌọrịa taa ahụhụ. Ịta ahụhụ a ga-adịkwara ya na ndị nile na-eso ụzọ ịkwa iko ya. Ọ bụrụ na ha echegharịghị site nꞌụzọ ọjọọ ha, ihe ndị a ga-abịakwasị ha.
23
Ma nꞌebe ụmụ ya nọ, aga m etigbu ha ka ha nwụọ. Nzukọ nile ga-amata na abụ m onye na-ahụzu echiche na ọchịchọ obi ụmụ mmadụ. Onye ọ bụla ga-anatakwa ụgwọ ọrụ kwesịrị ya.
24
“Ma ndị nile fọdụrụ na nzukọ dị na Tiatira, ndị na-esoghị ozizi ụgha ahụ, o nweghị ihe ọzọ m chọrọ site nꞌaka unu.
25
Kama, jidesienụ ihe ahụ dị nꞌaka unu aka ike tutuu ruo mgbe m ga-abịaghachi ọzọ.
26
“Ma onye ọ bụla nọgidere na-eme ihe m chọrọ ruo ọgwụgwụ ihe nile, ka m ga-enye ike nꞌebe mba nile nọ.
27
Unu ga-ejikwa mkpa nꞌaka igwe chịa ha, ọ bụladị dị ka Nna m si nye m ike ịchị ha. A ga-etiwasị ha dị ka ite aja e tiwasịrị nꞌala mee ka ọ dawasịa.
28
Mụ onwe m ga-enyekwa ha kpakpando ụtụtụ.
29
“Ya mere, ka ndị nile chọrọ ịnụ ihe gee ntị nꞌihe Mmụọ Nsọ na-agwa nzukọ ya.
← Chapter 1
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 3 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22