bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Revelation 12
Revelation 12
Igbo 1988
← Chapter 11
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 13 →
1
Mgbe ihe ndị a gasịrị, oke ihe ịrịba ama pụtara ìhè nꞌeluigwe nke na-egosi ihe gaje ime. Ahụrụ m otu nwanyị e yikwasịrị anyanwụ dị ka uwe. Ọnwa dịkwa nꞌokpuru ụkwụ ya abụọ. Okpu eze nke kpakpando iri na abụọ dị gburugburu ya, dịkwa ya nꞌisi.
2
Nwanyị ahụ dị ime, na-etikwa mkpu dị ka nwanyị ime na-eme, nke na-ejikere ịmụpụta nwa ọhụrụ.
3
Na mberede, agwọ ochie ahụ a na-akpọ Dragọn nꞌasụsụ bekee pụtara ìhè. O nwere isi asaa na mpi iri. O kpukwasịkwara okpu eze asaa nꞌisi ya.
4
Nꞌazụ ya, o nwere ọdụdụ nke o ji dọkpụrụ otu ụzọ nꞌime ụzọ atọ nke kpakpando nile dị nꞌeluigwe, tụda ha nꞌala. Ọ bịara guzo nꞌihu nwanyị ahụ mgbe ọ na-achọ ịmụpụta nwa ahụ ọ dị ime ya, nọọ na njikere iri nwantakịrị ahụ nwanyị ahụ ga-amụpụta.
5
Emesịa, nwanyị ahụ mụpụtara nwantakịrị ahụ, onye gaje ịchị achị nꞌelu ụwa dum. Onye ga-ejikwa aka dị ike chịa ọchịchị ya. Mgbe ahụ a mụpụtara ya, nꞌotu oge ahụ kwa, e si nꞌebe ahụ wepụ nwanta ahụ were ya gaa nꞌebe Chineke nọ nꞌeluigwe nꞌocheeze ya.
6
Ma nwanyị ahụ si nꞌebe ahụ gbapụ gbalaa nꞌọzara ebe Chineke kwadebere na ọ ga-anọ. Ebe ahụ ka Chineke ga-elekọta ya anya nke ọma otu puku ụbọchị na narị ụbọchị abụọ na iri ụbọchị isii.
7
Mgbe ihe ndị a gasịrị, agha dị oke egwu dapụtara nꞌeluigwe. Ma onyeisi ndị mmụọ ozi a na-akpọ Maikel na ụsụ ndị mmụọ ozi ya malitere ibuso agwọ ochie ahụ na ndị mmụọ ozi ya a chụdara achụda agha.
8
Mgbe a lụchara ọgụ a, e meriri agwọ ochie ahụ nꞌagha, chụpụ ya site nꞌeluigwe.
9
Agwọ ukwu a bụ agwọ ochie ahụ a na-akpọ ekwensu, nke na-eduhie ndị nile bi nꞌụwa. A chụturu ya nꞌụwa, ya na ndị agha ya nile.
10
Mgbe ahụ anụrụ m oke olu si nꞌeluigwe na-ada sị, “O mezuola nꞌikpeazụ, nzọpụta Chineke na ike na ọchịchị na ịchị isi Kraịst, ha abụrụla ihe dị ire nꞌihi na e sitela nꞌeluigwe chụtuo onye ahụ na-ebo ụmụnna anyị ebubo. Ọ na-ebo ha ebubo ehihie na abalị nꞌihu Chineke anyị.
11
Ha lụgburu ya nꞌagha site nꞌọbara Nwa atụrụ ahụ na site nꞌama ha, nꞌihi na ha ahụghị ndụ ha nꞌanya karịa, kama ha tọgbọrọ ndụ ha kwere ịnwụ ọnwụ nꞌihi ya.
12
Ṅụrịanụ ọṅụ ndị nile bi nꞌeluigwe. Unu ụmụ nke eluigwe ṅụrịanụ. Ka obi tọọkwa unu ụtọ. Ma ahụhụ dịrị unu ndị bi nꞌụwa, nꞌihi na ekwensu ejirila oke ọnụma bịakwute unu. Ọ makwaara na oge o nwere ehighị nne.”
13
Mgbe agwọ ochie ahụ chọpụtara na a chụdala ya nꞌụwa, o sogburu nwanyị ahụ mụrụ nwa nwoke ahụ.
14
Ma e nyere nwanyị ahụ nku abụọ, nke dị ka nku oke ugo, ka o jiri ya feba nꞌime ọzara, ebe a kwadooro ya, na ebe a ga-anọ lezie ya anya afọ atọ na ọnwa isii ichedo ya site nꞌaka agwọ ahụ.
15
Ma agwọ ahụ meghere ọnụ ya mee ka mmiri si nꞌọnụ ya sọpụta, nke ga-ebufu nwanyị ahụ ma ọ bụrụ na mmiri ahụ eruo ebe nwanyị ahụ nọ.
16
Ma ala nyeere nwanyị ahụ aka. O meghere ọnụ ya loda ide mmiri a.
17
Mgbe ahụ agwọ ahụ nke iwe juru obi megide nwanyị ahụ, jikesịrị ike pụọ, ibu agha megide ụmụ nwanyị ahụ nile fọdụrụ, bụ ndị nile na-edebe iwu Chineke na ndị na-ekwupụta na ha bụ ndị nke Jisọs.
← Chapter 11
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 13 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22