bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Revelation 11
Revelation 11
Igbo 1988
← Chapter 10
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 12 →
1
Emesịa, enyere m ihe ọtụtụ e ji atụ ihe. A gwara m sị m gaa tụọ ụlọ nsọ ukwu Chineke. A gwakwara m sị m tụọ ebe ịchụ aja dị nꞌụlọ nsọ ahụ. A gwakwara m ka m gụọ ọnụ ọgụgụ ndị nile na-akpọ isi ala nye Chineke nꞌime ya.
2
Ma a gwara m sị m atụkwala ogige dị na mpụta ụlọ nsọ ukwu nꞌihi na e werela ya nye ndị mba ọzọ. Ha ga-azọtọkwa obodo nsọ ahụ ụkwụ iri ọnwa anọ na abụọ.
3
“Aga m enye mmadụ abụọ ndị ga-agbara m ama ike ka ha buo amụma otu puku ụbọchị na narị ụbọchị abụọ na iri ụbọchị isii. Nꞌoge a ha ga-eyi akwa mkpe.”
4
Ndị amụma abụọ ahụ bụ osisi olivu abụọ ahụ na ihe ịdọba oriọna abụọ ahụ e debere nꞌihu Chineke onye kere ihe nile na mmadụ nile bi nꞌụwa.
5
A ga-eme ka onye ọ bụla ga-achọ imejọ ha nwụọ. Ọ bụ ọkụ si ha nꞌọnụ pụta ka ha ga-eji rechapụ ndị dị otu a.
6
A ga-enyekwa ndị àma abụọ ahụ ike imechi eluigwe ime ka mmiri ozuzu ọ bụla ghara izo nꞌụwa nꞌime afọ atọ na ọkara ahụ ha ga-ebu amụma ha. A ga-enyekwa ha ike ime ka osimiri na mmiri nta nile ghọọ ọbara. Ha ga-enwekwa ike ime ka ụdị ọrịa dị iche iche bịakwasị ụwa nile nꞌoge ọ bụla ha chepụtara nꞌobi ha.
7
Nꞌọgwụgwụ afọ atọ na ọkara ahụ, mgbe ha rụsịrị ọrụ ịgba ama ha, onye nduhie ahụ, nke ga-esite nꞌime olulu ahụ na-enweghị nsọtụ pụta, ga-ebuso ha agha merie ha, gbuokwa ha.
8
Mgbe ha nwụchara, ozu ha ga-atọgbọ nꞌala, nꞌokporo ụzọ dị na Jerusalem ụbọchị atọ na ọkara. Ee, ozu ha ga-atọgbọ nꞌokporo ụzọ Jerusalem, obodo ahụ e kwuru ihe banyere ya sị na ọ bụ obodo Sodọm, na obodo a kpọkwara Ijipti. Nke a bụ obodo ahụ ebe a kpọgidere Onyenwe ha nꞌobe.
9
A gaghị ekwenyekwa ka onye ọ bụla lie ozu mmadụ abụọ ahụ. Ma ndị nile dị iche iche nꞌụwa ga-agba ozu ha gburugburu nꞌebe a tọgbọrọ ha na-ele ha anya, nꞌihi na ha ga-abụ ihe ilere anya nye ụwa nile.
10
Ụwa nile ga-emekwa ụbọchị e gburu ha ka ọ bụrụ ụbọchị izuike. Ndị ụwa nile ga-aṅụrị ọṅụ nyerịtaa ibe ha onyinye dị iche iche, kpọọ oriri dị iche iche iji ṅụrịa ọṅụ nꞌihi ogbugbu e gburu mmadụ abụọ ahụ, ndị wetaara ha oke nhuju anya.
11
Ma mgbe ụbọchị atọ na ọkara gafesịrị, Chineke ga-eme ka Mmụọ ya na-enye ndụ banyekwa nꞌime mmadụ abụọ ndị a mee ka ha bilitekwa ọzọ. Mgbe ndị bi nꞌụwa ga-ahụ nke a, ha nile ga-amalitekwa ịtụ oke egwu.
12
Mgbe ahụ otu olu dị ukwuu ga-esi nꞌeluigwe tie mkpu gwa mmadụ abụọ ahụ okwu sị, “Bilienụ, rigota nꞌelu.” A ga-ewelite ha elu na mbara eluigwe baa nꞌime igwe ojii. Ma ndị iro ha ga-anọ na-ele ha anya ka ha na-arigo nꞌeluigwe.
13
Ma nꞌotu oge ahụ, nꞌotu awa ahụ, ala ọma jijiji dịkarịsịrị oke egwu ga-adị, nke ga-eme ka otu akụkụ nꞌime akụkụ iri nke obodo ahụ nile daa. Ndị ga-anwụ nꞌoge ala ọma jijiji a ga-adịkwa puku mmadụ asaa. Ma ndị nile fọdụrụ ga-esite nꞌoke egwu ga-atụ ha nye Chineke nke eluigwe otuto.
14
Ugbu a ahụhụ nke abụọ ahụ agafeela. Ma mgbe na-adịghị anya kwa, ahụhụ nke atọ na-amalite.
15
Nꞌihi na mgbe ahụ kwa ka mmụọ ozi nke asaa fụrụ opi ike ya. Mgbe ọ fụrụ opi ya oke olu dị iche iche sitere nꞌeluigwe na-ada nꞌike nꞌike na-asị, “Alaeze nile nke ụwa abụrụla alaeze Onyenwe anyị, ya na Kraịst ya. Ya onwe ya ga-achịkwa achị nꞌebe ihe nile e kere eke dị ruo mgbe nile ebighị ebi.”
16
Mgbe ahụ kwa iri ndị okenye abụọ na anọ ahụ na-anọkwasị nꞌocheeze ndị ahụ dị nꞌihu ocheeze Chineke na-ada nꞌala, na-akpọ isi ala nye Chineke. Ha na-enyekwa ya otuto site nꞌife ya ofufe na-asị,
17
“Anyị na-enye gị otuto, gị Onyenwe anyị, Chineke, Onye pụrụ ime ihe nile. Onye na-adị site na mmalite, onye dịkwa ugbu a, nꞌihi na i werela ike nile nꞌaka gị. Ị malitekwala ọchịchị gị.
18
Ụwa nile were oke iwe megide gị, ma ugbu a bụ oge gị iweso ha iwe dị ọkụ. Ugbu a bụ oge ikpe ndị nwụrụ anwụ ikpe, na ịkwụghachi ndị na-ejere gị ozi ụgwọ ọrụ ha, bụ ndị nile na-ezisa ozi ọma gị na ndị gị nile, bụ ndị na-atụ egwu gị. Ndị dị nta na ndị dị ukwuu. Oge eruokwala mgbe ịla nꞌiyi ga-abịakwasịkwa ndị nile e siri nꞌaka ha webata mmebi nꞌebe ihe Chineke kere dị.”
19
Mgbe ahụ kwa e meghere ụlọ nsọ Chineke nke dị nꞌeluigwe. Ahụkwara m igbe ọgbụgba ndụ Chineke nꞌime ya. Nꞌotu oge ahụ kwa, egbe eluigwe malitere ịgba, amụma gbukwara. Oke ifufe nke na-ala ihe nꞌiyi bidokwara ife. Oke ala ọma jijiji dị egwu bidoro nꞌebe dị iche iche, mee ka ụwa nile mee mkpọtụ nke ukwuu.
← Chapter 10
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 12 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22