bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Revelation 16
Revelation 16
Igbo 1988
← Chapter 15
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 17 →
1
Mgbe ahụ anụrụ m oke olu si nꞌụlọ nsọ ahụ na-ada na-agwa ndị mmụọ ozi asaa ahụ okwu sị, “Ngwanụ, gaanụ wụsa ihe dị nꞌefere ọnụma asaa Chineke ahụ nꞌelu ụwa.”
2
Mmụọ ozi nke mbụ hapụrụ ụlọ nsọ ahụ gaa wụsa ihe dị nꞌefere nke ya nꞌelu ụwa. Mgbe ọ wụsara ya, ọnya ọjọọ na-egbu oke mgbu bịakwasịrị ndị nile bi nꞌụwa, bụ ndị a kakwasịrị akara anụ ọhịa ahụ, na nꞌelu ndị na-akpọrọ oyiyi ya isi ala.
3
Mmụọ ozi nke abụọ pụrụ gaa wụsa ihe dị nꞌime efere nke ya nꞌelu osimiri nile. Otu mgbe ahụ osimiri nile chagharịrị na-acha dị ka ọbara onye nwụrụ anwụ. Nke a mere ka ihe nile dị nꞌime ha nwụọ.
4
Mmụọ ozi nke atọ pụrụ gaa wụsa ihe dị nꞌefere nke ya nꞌelu iyi na nꞌelu isi iyi nile. Nke a mere ka ha nile ghọọ ọbara.
5
Mgbe ahụ anụrụ m ka mmụọ ozi ahụ mmiri nile dị nꞌaka ya kwuru okwu sị, “I kpere ikpe ziri ezi, ebe i mere ka isi iyi ndị a ghọọ ọbara. Gị onye dị nsọ na onye na-adị site na mmalite, na onye na-adịkwa ugbu a.
6
Nꞌihi na e gbuola ndị nsọ gị na ndị amụma gị, wụsakwa ọbara ha nꞌelu ụwa. Ma ugbu a gị onwe gị a wụsala ọbara ndị ahụ gburu ha. Nke a bụkwa ezi ụgwọ ọrụ ha kwesịrị ịnata.”
7
Mgbe ahụ kwa, anụrụ m ka mmụọ ozi ahụ na-anọ nꞌebe ịchụ aja kwuru okwu sị, “Ee, Onyenwe anyị Chineke pụrụ ime ihe nile, ntaramahụhụ i nyere ha ziri ezi, bụrụkwa eziokwu.”
8
Mgbe ahụ mmụọ ozi nke anọ pụrụ wụsa ihe dị nꞌefere nke ya nꞌelu anwụ si otu a mee ka anwụ were okpomọkụ ya chagbuo mmadụ nile.
9
Okpomọkụ ahụ si nꞌanwụ bịa rere onye ọ bụla ọkụ nꞌahụ. Nke a mere ka ndị mmadụ bido ịkọcha aha Chineke, onye zidatara ihe otiti ndị a. Ma ihe otiti a emeghị ka ha chegharịa nꞌobi ha, o meghị ka ha bido inye Chineke otuto.
10
Mgbe ahụ kwa, mmụọ ozi nke ise pụrụ wụkwasị ihe dị nꞌiko nke ya nꞌelu ocheeze anụ ọhia ahụ si na mmiri pụta. Nke a mere ka ọchịchịrị jupụta nꞌalaeze ya. O mekwara ka ndị ọ na-achị tabie ire ha nꞌihi oke ahụ ụfụ.
11
Ha kọchara Chineke nke eluigwe nꞌihi ihe ụfụ na ọnya bịakwasịrị ha. Ma ha jụrụ ichegharị site nꞌajọ ọrụ ha nile.
12
Mmụọ ozi nke isii pụkwara wụkwasị ihe dị nꞌefere ya nꞌelu mmiri ukwu ahụ bụ Yufretis si otu a mee ka mmiri dị nꞌime ya taa. Nke a mere ka ọ dịrị eze ahụ si nꞌọwụwa anyanwụ mfe ịchịrị ndị agha ya jeruo nꞌakụkụ ọdịda anyanwụ na-enweghị mgbochi ọ ụla.
13
Mgbe ahụ kwa, ahụrụ mmụọ ọjọọ atọ ndị pụtara ìhè nꞌọdịdị awọ. Ha si nꞌọnụ agwọ ochie ahụ na nꞌọnụ anụ ọhịa ahụ nwere ike ịrụ ọrụ ịtụnanya pụta.
14
Ha bụ mmụọ nke ajọ mmụọ ndị ahụ na-arụ ọrụ ịrịba ama. Ọ bụ ha na-ejekwuru ndị eze ụwa nile ịchịkọta ha maka ibu agha nꞌụbọchị ukwu ahụ bụ ụbọchị Chineke Onye pụrụ ime ihe nile.
15
“Lezie anya! Ana m abịa dị ka onye ohi! Ọṅụ dịrị ndị nile nọ na-eche maka ọbịbịa m, ndị na-edebe uwe ha na njikere, ndị na-agaghị ejegharị nꞌọṅọdụ ịgba ọtọ, nke na-eweta ihere.”
16
Mgbe ahụ mmụọ ọjọọ ndị ahụ chịkọtara ndị eze ahụ nile nꞌotu ebe a na-akpọ Amagidọn nꞌasụsụ Hiburu.
17
Mgbe ahụ kwa, mmụọ ozi nke asaa wụpụrụ ihe dị nꞌefere nke ya nꞌikuku. Mgbe ọ wụpụrụ ya, otu olu sitere nꞌocheeze dị nꞌụlọ nsọ ukwu ahụ daa ụda sị, “E mezuola ya!”
18
Mgbe ahụ egbe eluigwe bidoro na-agba na-eme mkpọtụ, amụma bidokwara na-egbu, oke ala ọma jijiji dịkwara nꞌụwa, ụdị nke na-adịbeghị site na mgbe e kere ụwa. Ọ bụ ala ọma jijiji kachasị ala ọma jijiji ndị ọzọ njọ.
19
Obodo ahụ bụ Babilọn kewara ụzọ atọ. Obodo ukwu nile dị nꞌụwa dara. Mgbe ahụ Chineke chetara obodo ukwu ahụ bụ Babilọn. O mere ka ọ ṅụrụ site nꞌihe dị nꞌiko ọnụma nke oke iwe ya.
20
Mgbe ahụ agwa etiti nile mikpuru, ugwu nile ghọrọ ala dị larịị.
21
Mkpụrụ mmiri nke ịdị arọ otu nꞌime ha ruru iri kilogram ise, sitere nꞌeluigwe na-adakwasị ndị mmadụ. Nke a mekwara ka ha kọchaa Chineke nꞌihi ihe otiti mkpụrụ mmiri ahụ, nꞌihi na ihe otiti ahụ dị nnọọ njọ nke ukwuu.
← Chapter 15
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 17 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22