bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Revelation 3
Revelation 3
Igbo 1988
← Chapter 2
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 4 →
1
“Dee akwụkwọ a nye mmụọ ozi ụlọ nzukọ dị na Sardis. Ọ bụkwa ozi a ka a na-ezi gị site nꞌaka onye ahụ nwe mmụọ asaa ahụ na kpakpando asaa ahụ. Amaara m ihe banyere ama ahụ a na-agbara gị na ị bụ nzukọ dị ezi ndụ, na nzukọ dị ike nke ukwuu, ma nꞌeziokwu ị bụ nzukọ nwụrụ anwụ.
2
Ugbu a, si nꞌụra bilite! Mee ka ihe ntakịrị fọdụrụ dịrị ike. Nꞌihi na ọ bụladị ihe ntakịrị ahụ fọdụrụ na-achọ ịnwụ anwụ. Ọrụ gị nile etozughị oke dị ka ihe Chineke chọrọ ka i mee si dị.
3
Ugbu a, laghachi mee ihe nile ahụ ị nụrụ na nke i kwenyere mgbe ị malitere na mbụ. Jidesie ya aka ike ma chigharịkwute m site nꞌụzọ ọjọọ gị nile. Ọ bụrụ na i meghị otu a, lee, aga m abịakwute gị na mberede dị ka onye ohi, taa gị ahụhụ dị ukwuu.
4
“Ee, ọ bụladị otu a, ụfọdụ mmadụ nꞌime nzukọ gị emerụbeghị onwe ha site na njehie ụwa. Nꞌihi nke a, ha ga-esoro m jee ije nꞌime uwe ọcha ahụ, nꞌihi na ha kwesịrị ịnata nkwụghachi ziri ezi dị otu a.
5
Onye ọ bụla na-emeri emeri ka a ga-eyikwasị uwe mwụda ọcha dị otu a. Agaghị m ehichapụ aha ha nꞌakwụkwọ ndụ ahụ. Aga m ekwupụtakwa na ha bụ ndị m nꞌihu Nna m na nꞌihu ndị mmụọ ozi nile.
6
“Nꞌihi nke a, ka onye ọ bụla chọrọ ịnụ ihe gee ntị nꞌihe Mmụọ Nsọ na-agwa nzukọ ya nile.
7
“Dee akwụkwọ a nye mmụọ ozi nzukọ dị na Filadelfia. Nke a bụ ozi e ziri gị site nꞌaka onye ahụ dị nsọ na onye eziokwu, onye ahụ ji igodi Devidi, nke o ji emeghepụ ihe onye ọ bụla na-apụghị imechi, na nke o ji emechi ihe onye ọ bụla na-apụghị imeghe.
8
“Amaara m gị nke ọma dị ka onye na-adịghị ike ma ọlị. Ma i jisịrị ike na-enye m nsọpụrụ. Ị gọnarịkwaghị aha m. Nꞌihi nke a, emegheelara m gị ụzọ nke onye ọ bụla na-apụghị imechi.
9
“Achọrọ m ka ị mata na aga m eme ka ndị ahụ na-akwagide ụzọ ekwensu ma na-asị na ha bụ ndị dị nsọ mata na mụ onwe m họpụtara gị nye onwe m. Ha ga-abịa kpọọ isi ala nye m, kwupụta na ha aghọtala na ọ bụ gị ka m hụrụ nꞌanya.
10
“Nꞌime nsogbu ndị a ha na-enye gị nꞌihi aha m, i sitela na ntachi obi sọpụrụ okwu m nile. Nꞌihi nke a, aga m ekpuchi gị site nꞌoke mkpagbu ahụ, ya na oke ọnwụnwa ahụ ga-abịakwasị ụwa. Ihe ndị a bụ ihe ga-anwapụta okwukwe ndị ga-adị ndụ.
11
Ma mata nke a, na ana m abịa ọsịịsọ. Jidesiekwa okwukwe nta ahụ i nwere aka ike, ka onye ọ bụla ghara ịnapụ gị okpu eze ahụ a kwadobere inye gị.
12
“Ma onye ọ bụla na-emeri emeri ka m ga-eme ka ọ bụrụ onyeisi nꞌime ụlọ nsọ Chineke m. A ga-ekpuchi ya nke ọma nꞌụzọ zuru oke. Ọ gaghị apụkwa apụ. Aga m edekwasịkwa aha Chineke m nꞌahụ ya. Ọ ga-ebikwa nꞌime obodo nsọ Chineke m, nke bụ obodo Jerusalem ọhụrụ ahụ si nꞌeluigwe rịdata. Aha ọhụrụ m ka a ga-edekwasịkwa nꞌihu ya.
13
“Ka onye ọ bụla chọrọ ịnụ ihe gee ntị nꞌihe Mmụọ Nsọ na-ekwuru ụlọ nzukọ ya.
14
“Dee akwụkwọ a nye mmụọ ozi nzukọ dị na Laodisia. Ọzi a sitere nꞌaka onye ahụ a na-apụghị iwezụga nꞌọnọdụ ya. Ọ bụkwa onye àma kwesịrị ntụkwasị obi banyere ihe nile dị ugbu a, na nke dịrị na mgbe ochie, na nke gaje ịdị ruo mgbe ebighị ebi. Ya onwe ya bụkwa onye kachasị ihe nile elu, bụrụkwa isi mmalite ihe nile Chineke kere.
15
“Amaara m gị nke ọma, na ị naghị ekpo ọkụ, ị jụkwaghị oyi. Ọ gaara adị m nnọọ mma ma asị na ị na-ekpo ọkụ ma ọ bụkwanụ na ị na-ajụ oyi.
16
Nꞌihi nke a, ebe ị na-ajụghị oyi, i kpokwaghị ọkụ, ihe ị dị bụ naranara. Nꞌihi ya, aga m esi nꞌọnụ gbụpụ gi.
17
“Nꞌihi na ị na-asị, ‘Abụ m ọgaranya, nwezuo ihe nile. Mkpa ihe ọ bụla akpakwaghị m.’ Ma ị ghọtaghị na onye gba aka ka ị bụ nꞌihe banyere ndụ ime mmụọ gị. Ị bụ onye e kwesịrị imere ebere. Ị bụkwa ogbenye na onye kpuru ìsì na onye gba ọtọ.
18
“A sị na ị maara ihe ị gaara achọsi ike ịzuta ezigbo, ọlaedo nꞌaka m. Bụ ọlaedo a nụchara anụcha nꞌime ọkụ. Mgbe ahụ ị ga-abụkwa ọgaranya nꞌezie. Ị gaara esitekwa nꞌaka zụta ezi akwa ọcha na-enweghị ntụpọ ka ị ghara ịgba ọtọ, ka ihere gharakwa ime gị. Ị gaara abịakwute m ka m nye gị ezi ọgwụ ga-agwọ ọrịa anya gị, ka i bido ịhụ ụzọ nke ọma.
19
Onye ọ bụla m hụrụ nꞌanya ka m na-ezi ihe site nꞌịta ya ahụhụ. Nꞌihi nke a, aghaghị m ịta gị ahụhụ pụrụ iche ma ọ bụrụ na i chegharịghị site nꞌọrụ ọjọọ gị na enweghị nghọta dị nꞌime gị bụrụ onye nwere ịnụ ọkụ nꞌobi nꞌihe Chineke.
20
“Lee, ana m eguzo ugbu a nꞌọnụ ụzọ obi gị na-akụ aka. Ọ bụrụ na onye ọ bụla anụ olu m mgbe m na-akpọ oku meghepụrụ m ụzọ, aga m abata bịakwute ya, sorokwa ya nwekọọ ihe. Ya onwe ya ga-esorokwa m nwekọọ ihe.
21
Onye ọ bụla na-emeri emeri ka mụ na ya ga-anọkọ nꞌocheeze m. Ọ bụladị dị ka m si soro Nna m nọdụ nꞌocheeze ya mgbe m meriri.
22
Ka ndị nile chọrọ ịnụ ihe gee nti nꞌihe Mmụọ Nsọ kwuru nye nzukọ Onyenwe anyị.”
← Chapter 2
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 4 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22