bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Revelation 20
Revelation 20
Igbo 1988
← Chapter 19
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 21 →
1
Mgbe ahụ kwa ahụrụ m otu mmụọ ozi ka o si nꞌeluigwe rịda. O ji mkpịsị igodo e ji atụghe olulu ahụ na-enweghị nsọtụ. O jikwa mkpọrọ igwe dị arọ nꞌaka ya.
2
Mmụọ ozi a jidere agwọ ochie ahụ, bụ agwọ ochie ahụ aha ya bụkwa Onye ọnwụnwa na Ekwensu. O ji mkpọrọ igwe kee ya agbụ. Ọ ga-anọkwa nꞌọnọdụ a otu puku afọ.
3
Emesịa, mmụọ ozi ahụ tụnyere agwọ ochie ahụ nꞌime olulu ahụ na-enweghị nsọtụ, tụchie ụzọ ya. Ọ kakwara akara nꞌelu ya ka agwọ ochie ahụ hapụ inwekwa ike iduhie mba nile dị nꞌụwa ọzọ tutuu ruo mgbe puku afọ gasịrị. Mgbe afọ ndị a zuru, a ga-atọghepụ ya hapụ ya ka ọ gagharịa nwa ntịntị oge.
4
Mgbe ahụ ahụkwara m ocheeze, hụkwa ndị nọ nꞌelu ya. Ha bụ ndị e nyere ike ikpe ikpe. Ahụkwara m mkpụrụ obi ndị ahụ e bipụrụ isi nꞌihi ịgba ama banyere Jisọs na nꞌihi ikwusa okwu Chineke, na ndị ahụ e bipụrụ isi nꞌihi na ha akpọghị isi ala nye anụ ọhịa ahụ na oyiyi ya a tụrụ atụ, ma ọ bụ kwere ka a kaa ha akara ya nꞌegedege ihu ha, ma ọ bụ nꞌaka ha. Ha esitela nꞌọnwụ ghọọ ndị dị ndụ ọzọ, sorokwa Kraịst ugbu a na-achị isi otu puku afọ.
5
Nke a bụ mbilite nꞌọnwụ nke mbụ. Ndị fọdụrụ nꞌetiti ndị nwụrụ anwụ esoghị bilite nꞌọnwụ nꞌoge a, kama ha ga-anọ nꞌọnọdụ ọnwụ ha tutuu ruo mgbe puku afọ gafesịrị.
6
Ndị a gọziri agọzi na ndị dị nsọ bụ ndị ahụ ketara oke na mbilite nꞌọnwụ nke mbụ ahụ, nꞌihi na ụjọ ọnwụ nke ugboro abụọ adịghị atụ ha, nꞌihi na ha ga-abụ ndị nchụaja Chineke na nke Kraịst, sorokwa ya chịa achịa puku afọ.
7
Mgbe puku afọ ahụ gafesịrị, a ga-emekwa ka ekwensu si nꞌụlọ mkpọrọ ya pụta.
8
Ọ ga-apụkwa jegharịa iduhie mba nile nọ nꞌakụkụ nile nke ụwa. Ọ ga-akpọkọta ha nꞌotu ebe. Gọg na Magọg ga-eso ha. Ha nile ga-ezukọ ibu agha. Ndị agha ha ga-adị nnọọ ukwuu, a pụghị ịgụta ọnụ ọgụgụ ha nꞌihi na ha ga-adị ukwuu dị ka aja dị nꞌọnụ mmiri osimiri.
9
Ha nile ga-esi nꞌakụkụ nile nke ụwa zukọọ, gbaa obodo ndị Chineke gburugburu, ya bụ obodo Jerusalem ahụ Chineke hụrụ nꞌanya. Ma Chineke ga-eme ka ọkụ si nꞌeluigwe daa dakwasị ha, repịa ndị agha ahụ nile.
10
Mgbe ahụ ekwensu ahụ dufuru ha ka a ga-atụnye nꞌọdọ ọkụ e ji nkume na-enwụ ọkụ kwanye. Ebe ahụ ka ọ ga-anọ, ya na anụ ọhịa ọjọọ ahụ, na onye amụma ụgha ya. Ha ga-anọkwa nꞌọnọdụ ahụ mgbu ehihie na abalị ruo mgbe ebighị ebi.
11
Ahụkwara m otu ocheeze ọcha buru ibu, nke otu onye nọkwasịrị nꞌelu ya. Mgbe ụwa na mbara eluigwe nile hụrụ onye a nọ nꞌelu ocheeze ahụ ha gbara barịị fuo. Ma ha achọtaghị ebe ha ga-ezo onwe ha.
12
Mgbe ahụ ahụrụ m ndị nwụrụ anwụ nile, ndị ukwu na ndị nta, ka ha guzo nꞌihu Chineke. E meghere akwụkwọ, megheekwa akwụkwọ ọzọ, nke bụ akwụkwọ nke ndụ. E sitekwara nꞌihe nile e dere nꞌakwụkwọ ahụ kpee ndị a nile nwụrụ anwụ ikpe, dị ka ọrụ ha rụrụ si dị.
13
Oke osimiri nile nyeghachiri ndị nile nwụrụ anwụ nọ nꞌime ha. Otu a kwa ọnwụ na ala mmụọ nyeghachikwara ndị nwụrụ anwụ dị nime ha. E kpekwara onye ọ bụla ikpe dị ka ọrụ ya si dị.
14
Emesịa, a tụnyere ọnwụ na ọkụ ala mmụọ nꞌime ọdọ ọkụ ahụ. Nke a bụ ọnwụ nke ugboro abụọ.
15
Onye ọ bụla a na-achọtaghị aha ya nꞌakwụkwọ nke ndụ ahụ ka a tụnyere nꞌime ọdọ ọkụ ahụ.
← Chapter 19
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 21 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22