bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Revelation 8
Revelation 8
Igbo 1988
← Chapter 7
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 9 →
1
Mgbe Nwa atụrụ ahụ nyakapụrụ akara nke asaa ahụ, akụkụ nile nke eluigwe dara jụụ ruo ihe dị ka iri nkeji atọ. Ọ dịkwaghị mkpọtụ ọ bụla dị site nꞌihe ọ bụla Chineke kere.
2
Nꞌoge na-adịghị anya, ahụrụ m ndị mmụọ ozi asaa, ndị na-eguzo nꞌihu Chineke. E nyere ha opi ike nꞌotu nꞌotu.
3
Mmụọ ozi ọzọ nke ji ite igwe ntakịrị e ji ọlaedo kpụọ bịara guzo nꞌakụkụ ebe ịchụ aja. E nyere ya ihe ịchụ aja na-esi isi ụtọ nke ọ ga-eji gwakọta ya na ekpere ụmụ Chineke, were ya chụọ aja nꞌihu Chineke nꞌebe ịchụ aja e jiri ọlaedo wuo nke dị nꞌihu ocheeze Chineke.
4
Mgbe ahụ, isisi ụtọ nke ihe ahụ a chụrụ nꞌebe ịchụ aja ahụ, ya na ekpere ahụ ụmụ Chineke kpere, sitere nꞌebe ịchụ aja ahụ mmụọ ozi ahụ jiri ya chụọ aja rigoro elu ruo nꞌebe Chineke nọ.
5
Mgbe ahụ kwa mmụọ ozi ahụ weere ọkụ sitere nꞌebe ịchụ aja ahụ tinye ya nꞌime ite igwe ntakịrị ahụ o ji chụọ aja, tụda ya, ka ọ danye nꞌime ụwa. Mgbe o mere nke a, ụzụ egbe eluigwe dara, amụma gbukwara nꞌụzọ dị oke egwu. Ala ọma jijiji dakwasịkwara ebe nile nꞌụwa.
6
Mgbe ahụ mmụọ ozi asaa ahụ jikeere onwe ha ịfụ opi ike ahụ.
7
Mgbe mmụọ nke mbụ fụrụ opi ike ya, a tụdara nkume ọkụ na ọkụ a gwakọtara ya na ọbara nꞌime ụwa. Nke a mere ka otu ụzọ nꞌime ụzọ atọ e kere ụwa nwuru ọkụ. Ihe nile dị nꞌime ya rechapụrụ ọkụ. E mere ka osisi ọhịa na ahịhịa nile rechapụ ọkụ.
8
Mgbe mmụọ ozi nke abụọ fụkwara opi ike ya, a tụdara ihe yiri ugwu dị ukwuu na-enwụ ọkụ nꞌime osimiri. Nke a mere ka otu ụzọ nꞌime ụzọ atọ e kere osimiri nile chagharịa ghọọ ọbara.
9
Ọzọ kwa, otu ụzọ nꞌime ụzọ atọ e kere ụgbọ mmiri nile dị nꞌelu osimiri lara nꞌiyi. Otu a kwa e mekwara ka otu ụzọ nꞌime ụzọ atọ nke azụ nile dị nꞌime osimiri nwụọ.
10
Mgbe mmụọ ozi nke atọ fụrụ opi ike ya, otu kpakpando dịkarịsịrị ukwuu sitere na mbara eluigwe danye nꞌime otu ụzọ nꞌime ụzọ atọ e kere iyi nile na isi iyi nile, ebe ndị mmadụ si ekute mmiri ha na-aṅụ.
11
Aha kpakpando ahụ bụ Ilu ilu. Nꞌihi na o mere ka ihe ilu bịakwasị otu ụzọ nꞌime ụzọ atọ nke iyi nile na isi iyi nile, mee ka ọtụtụ mmadụ nwụọ nꞌihi akpịrị ịkpọ nkụ.
12
Mgbe mmụọ ozi nke anọ fụrụ opi ike ya, e mere ka otu akụkụ nꞌime akụkụ atọ e kere anyanwụ gbaa ọchịchịrị. Otu a kwa otu akụkụ nꞌime akụkụ atọ e kere ọnwa gbara ọchịchịrị. Ya na otu akụkụ nꞌime akụkụ atọ e kere kpakpando nile. Nke a mere ka anyanwụ hapụ inyekwa ìhè ya nꞌuju dị ka o si eme na mbụ. Otu ụzọ nꞌime ụzọ atọ e kere ehihie ghọkwara oke ọchịchịrị.
13
Mgbe m nọ na-ele ihe ndị a anya, ahụrụ m otu ugo buru ibu ka ọ na-efegharị na mbara eluigwe na-eti mkpu na-asị, “Ahụhụ! Ahụhụ dịrị mmadụ nile bi nꞌụwa nꞌihi ihe ọjọọ dị iche iche gaje ịbịakwasị ha mgbe ndị mmụọ ozi atọ fọdụrụ fụrụ opi ike ha.”
← Chapter 7
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 9 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22