bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Revelation 17
Revelation 17
Igbo 1988
← Chapter 16
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 18 →
1
Emesịa, otu nꞌime mmụọ ozi asaa ndị ahụ wụsara ihe dị nꞌefere ha nꞌelu ụwa bịara nꞌebe m nọ bido ịgwa m okwu. Ọ gwara m okwu sị, “Soro m ka anyị gaa, aga m egosi gị ihe ga-abịakwasị nwanyị ahụ ụwa nile maara dị ka akwụla, nwanyị ahụ na-anọkwasị nꞌelu ọtụtụ mmiri nke ụwa.
2
Ndị eze ụwa esorola ya dinakọọ nꞌotu ihe ndina. E meekwala ka ndị bi nꞌụwa bụrụ ndị mmanya ịkwa iko ya na-egbu.”
3
Mgbe ahụ mmụọ ozi ahụ duuru m nꞌime mmụọ baa nꞌọzara. Nꞌebe ahụ ka m nọ hụ otu nwanyị nọkwasịrị nꞌelu otu anụ ọhịa na-acha ọbara ọbara. Anụ ọhịa ahụ nwere isi asaa na mpi iri. Ihe e dere anụ ọhịa ahụ nꞌahụ bụ nanị okwu ikwulu Chineke.
4
Nwanyị ahụ yi akwa na-acha odo odo na nke na-achakwa ọbara ọbara. Ọ gbakwa ihe ịchọ mma e ji ọlaedo na nkume dị oke ọnụ ahịa kpụọ. O jikwa iko ọlaedo nꞌaka ya nke jupụtara nꞌihe arụ na ihe ure nile o ji na-akwa iko ya.
5
Aha gbagwojuru mmadụ anya ka e dekwasịrị ya nꞌegedege ihu. Nke a bụkwa ihe ahụ e dere: “Obodo ukwu ahụ bụ Babilọn nne ndị na-akwa iko na nne ndị nọ nꞌebe nile nꞌụwa na-ekpere arụsị.”
6
Ejikwa m anya m hụ na nwanyị ahụ aṅụjuola ọbara ndị nsọ afọ, ya na ọbara ndị àma Jisọs o gburu. Elere m ya anya nꞌoke egwu.
7
Ma mmụọ ozi ahụ jụrụ m ajụjụ sị, “Gịnị mere ihe ị hụrụ ji ju gị anya? Aga m agwa gị onye nwanyị a bụ, na ihe anụ a ọ na-anọkwasị nꞌelu ya nọchiri anya ya.
8
Anụ ọhịa ahụ ị hụrụ nwere mgbe o ji dị ndụ ma ugbu a ọ dịkwaghị ndụ. Ma ọ ga-emesịa site nꞌolulu ahụ na-enweghị nsọtụ pụta. Ma ọbịbịa ya ga-ewetara ya nanị ịla nꞌiyi. Ma nlọghachi ya ga-eju ndị ahụ a na-edeghị aha ha nꞌime akwụkwọ ndụ ahụ na-adị tupuu e kee ụwa anya.
9
“Ugbu a okwu a dịrị ndị nwere amamihe. Isi asaa anụ ọhịa ahụ nwere nọchiri anya otu obodo e wuru nꞌelu ugwu nta asaa ebe nwanyị a bi.
10
Ha na-anọchikwa anya ndị eze asaa. Ise nꞌime ha achịala gafee. Onye eze nke isii bụ onye na-achị achị ugbu a. Nke asaa ga-abịa ịchị nꞌoge dị nꞌihu. Ma ụbọchị ya agaghị adị tee anya.
11
Anụ ọhịa ahụ nwụrụ anwụ nke na-acha ọbara ọbara bụ onye eze nke asatọ. Ọ chịalarị achị na mbụ dị ka otu nꞌime ndị eze asaa ndị a. Mgbe ọ bịakwara ọzọ nke ugboro abụọ ya onwe ya ga-agakwa nꞌebe ịla nꞌiyi.
12
Mpi iri ahụ o nwere nọchiri anya eze ndị ahụ na-abịabeghị nꞌọchịchị. Ha ga-anata alaeze ha sorokwa anụ ọhịa ahụ chịa nwa oge nta.
13
Ha nile ga-etinye aka nꞌakwụkwọ nye anụ ọhịa ahụ ike ha na ume ha.
14
Mgbe he kwekọtarịtara, ha ga-ebu agha megide Nwa atụrụ ahụ. Kama Nwa atụrụ ahụ ga-emeri ha nꞌihi na ọ bụ onyeisi nꞌebe ndị nile nwe mmadụ nọ. Ọ bụkwa eze ndị eze nile. Ndị ya bụkwa ndị a kpọrọ na ndị a họpụtara, na ndị kwesịkwara ntụkwasị obi.”
15
Mmụọ ozi ahụ gwakwara m okwu si, “Osimiri ndi a, na iyi ukwu na iyi nta ndị a nwanyị a na-anọkwasị nꞌelu ha nọchiri anya ndị mmadụ dị iche iche, ndị si nꞌebe nile dị iche iche ma mba dị iche iche nke ụwa.”
16
Anụ ọhịa ahụ na-acha ọbara ọbara nke nwekwara mpi iri, nke mpi ndị a nọchiri anya ndị eze iri, ya na ndị eze a kpọrọ nwanyị a asị. Ha ga-agbakwa ya ọtọ, kwanyekwa ọkụ ga-erechapụ ya.
17
Nꞌihi na Chineke ga-eme ka ha zube ime otu ihe, ihe ga-emezu ọchịchọ obi ya. Ha nile ga-ekwekọtakwa iwere ike ọchịchị ha nyefee anụ ọhịa ahụ na-acha ọbara ọbara nꞌaka. A ga-esitekwa otu a mezuo okwu Chineke.
18
Ma nwanyị a ị hụrụ nꞌime ọhụ gị nọchiri anya obodo ukwu ahụ na-achị ndị eze nile dị nꞌụwa.
← Chapter 16
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 18 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22