bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Revelation 14
Revelation 14
Igbo 1988
← Chapter 13
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 15 →
1
Mgbe ahụ elere m anya hụ Nwa atụrụ ahụ ka o guzo nꞌugwu Zayọn nke dị na Jerusalem. Ya na narị puku mmadụ na iri puku mmadụ anọ na anọ ahụ, bụ ndị e dekwasịrị aha Nwa atụrụ ahụ na aha Nna ya nꞌegedege ihu ha.
2
Anụkwara m olu si nꞌeluigwe na-ada. Olu a na-ada ụda dị ka ụda mmiri si nꞌime nkume na-asọpụta, ma ọ bụ dị ka ụda nke oke egbe eluigwe. Olu a bụ olu ndị na-abụ abụ, ndị ji ụbọ akwara na-abụ abụ.
3
Narị puku mmadụ na iri puku mmadụ anọ na anọ ndị a, bụ ndị na-abụ abụ ahụ. Ọ bụkwa abụ ọhụrụ ka ha na-abụ. Ha nọkwa nꞌihu ocheeze Chineke na nꞌihu ihe e kere eke anọ ahụ dị ndụ, na nꞌihu iri ndị okenye abụọ na anọ ahụ na-abụ abụ a. O nweghị onye ọzọ maara abụ a karịa ndị a na-abụ ya. Nꞌihi na ha bụ ndị e si nꞌụwa gbapụta.
4
Ndị a bụkwa ndị na-emerụghị onwe ha nꞌebe ụmụ nwanyị dị, ndị dị nsọ nꞌime mmụọ ha dị ka ụmụ agbọghọ na-amaghị nwoke. Ha na-eso Nwa atụrụ ahụ na-aga ebe ọ bụla ọ na-aga. Ha bụ ndị e si nꞌetiti ndị mmadụ bi nꞌụwa gbapụta, ka ha bụrụ onyinye e doro iche nye Chineke na Nwa atụrụ ahụ.
5
Ọ dịkwaghị okwu ụgha ọ bụla a hụrụ nꞌọnụ ha. Ha bụkwa ndị na-enweghị ịta ụta.
6
Ahụkwara m mmụọ ozi ọzọ ka ọ na-efegharị nꞌime eluigwe. O bu ozi ọma nke ebighị ebi ahụ nꞌaka, nke ọ na-aga ikwusara mba nile, na ebo nile na asụsụ nile na mmadụ nile nọ nꞌụwa.
7
Mmụọ ozi a were oke olu kwuo okwu sị, “Tụọnụ egwu Chineke, nyekwanụ ya otuto. Nꞌihi na oge ahụ eruola mgbe ọ ga-anọdụ dị ka onye ikpe. Kpọọkwanụ isi ala nye ya, bụ onye kere eluigwe na ala, na oke osimiri na isi iyi mmiri nile.”
8
Mgbe ahụ mmụọ ozi ọzọ bịara soro ya, na-efegharị na-asị, “Obodo ukwu ahụ bụ Babilọn adaala, lee, ọ daala, nꞌihi na o meela ka mba nile soro ya ṅụrụ mmanya nke ọnụma na ịkwa iko ya na mmehie ya.”
9
Mgbe ahụ mmụọ ozi nke atọ bịakwara soro ha na-eti mkpu na-asị, “Onye ọ bụla na-akpọ isi ala nye anụ ọhia ahụ si nꞌime mmiri rịpụta, na oyiyi ya ahụ a kpụrụ akpụ, na onye na-anarakwa akara ahụ nꞌegedege ihu ma ọ bụ nꞌaka ya,
10
aghaghị isoro ṅụọ ihe si nꞌiko iwe Chineke. Iwe Chineke ahụ ka a ga-awụnyekwa, na-agwaghị agwa, nꞌime iko ọnụma Chineke. A ga-ejikwa ọkụ na nkume ọkụ mekpaa ha ahụ nꞌihu ndị mmụọ ozi dị nsọ na nꞌihu Nwa atụrụ ahụ.
11
Anwụrụ ọkụ si nꞌebe a na-emekpa ha ahụ apụta na-arigo elu ruo mgbe nile ebighị ebi. Izuike agaghị adịrị ha ehihie na abalị nꞌihi na ha kpọrọ isi ala nye anụ ọhia ahụ na oyiyi ya a kpụrụ akpụ, kwerekwa ka a kakwasị ha akara nke ọnụ ọgụgụ ya.
12
Ka nke a bụrụ ihe ịgba ume nye ndị Chineke, ime ha ka ha nwee ntachi obi nꞌọnwụnwa na nsogbu nile, nꞌihi na ha bụ ndị nsọ ya, ndị na-eguzosi ike bụrụ ndị na-erube isi nꞌiwu ya, na nꞌokwukwe ha nꞌime Jisọs ruo ọgwụgwụ ihe nile.”
13
Anụkwara m olu nke si nꞌeluigwe daa gwa m okwu sị, dee ihe a nꞌakwụkwọ, “Oge eruola mgbe ndị nile e gburu nꞌihi okwu Chineke ga-anatazu ụgwọ ọrụ ha zuru oke. Nꞌezie, Mmụọ Nsọ na-ekwu na ha bụ ndị a gọziri agọzi, nꞌihi na ugbu a ha ga-ezu ike site nꞌọrụ ha nile na ahụhụ ha nile, nꞌihi na ezi ọrụ ha rụrụ ga-eso ha baa nꞌeluigwe.”
14
Mgbe ahụ ihe nile gbanwere. Na mberede ahụrụ m igwe ọcha, hụkwa otu onye na-anọkwasị nꞌelu ya. Onye a dị ka Jisọs onye a kpọrọ Nwa nke mmadụ. O kpu okpu eze e jiri nanị ọlaedo mee, jirikwa mma e ji ewe ihe ubi dị nkọ, nꞌaka ya.
15
Mgbe ahụ otu mmụọ ozi sitere nꞌụlọ nsọ pụta, tikuo onye ahụ na-anọkwasị nꞌigwe ọcha sị ya, “Ngwa, bido iji mma iwe ihe ubi gị rụọ ọrụ, nꞌihi na oge owuwe ihe ubi eruola. Ihe a ga-aghọ aghọ nꞌụwa achaala.”
16
Ya mere, onye ahụ na-anọkwasị nꞌigwe ọcha ahụ rụnyere mma owuwe ihe ubi ya nꞌime ụwa, ghọta ihe dị nꞌụwa dị ka ihe ubi.
17
Mgbe nke a gasịrị, mmụọ ozi ọzọ sitekwara nꞌụlọ nsọ dị nꞌeluigwe pụta. Ya onwe ya jikwa mma owuwe ihe ubi dị nkọ.
18
Otu mgbe ahụ, mmụọ ozi ahụ e nyere ike iji ọkụ mebie ụwa tikuru mmụọ ozi ahụ ji mma owuwe ihe ubi dị nkọ sị ya, “Were mma owuwe ihe ubi gị bipụ ụyọkọ osisi oroma nile dị nꞌụwa, nꞌihi na ha nile achaala ikpe ikpe.”
19
Ya mere, mmụọ ozi ahụ rụnyere mma owuwe ihe ubi ya nꞌụwa, bipụsịa ụyọkọ oroma ahụ chịkọtaa ha, kpojupụta ha ebe Chineke ga-eji iwe zọchaa ha.
20
A zọchakwara mkpụrụ ndị a nꞌime mbadamba ala a na-anọ azọcha oroma nke dị nꞌazụ obodo. Ọbara sitere nꞌebe ahụ sọọ dị ka idee mmiri, ruo ihe dị ka narị kilomita atọ. Ịla elu nke ọbara a, ya bụ omimi ya, dịkwa ka site nꞌala ruo nꞌọnụ inyinya.
← Chapter 13
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 15 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22