bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Revelation 18
Revelation 18
Igbo 1988
← Chapter 17
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 19 →
1
Mgbe ihe ndị a nile gasịrị, ahụrụ m mmụọ ozi ọzọ nke si nꞌeluigwe bịa nꞌụwa. E nyere mmụọ ozi a ike dị ukwuu. Ebube ya mekwara ka ìhè jupụta nꞌụwa.
2
Mmụọ ozi a jiri olu dị ukwuu tie mkpu sị, “Obodo ukwu ahụ bụ Babilọn adaala. Ọ ghọọkwala ọgba ndị mmụọ ọjọọ na ebe obibi ndị mmụọ ọjọọ, na ebe obibi ụmụ nnụnụ rụrụ arụ.
3
Nꞌihi na mba nile esorola ya ṅụọ site na mmanya ọnụma ahụ na-eweta ọnwụ, nke e mere ka ọ bịakwasị ya nꞌihi ịkwa iko ya. Ndị ọchịchị nile nke ụwa esorola nwanyị a nwekọọ obi ụtọ. Ndị na-azụ ahịa nꞌụwa aghọọkwala ndị ọgaranya site nꞌịba ụba nke nwanyị a.”
4
Mgbe ahụ anụkwara m olu ọzọ si nꞌeluigwe na-akpọ oku na-asị, “Ndị m, sitenụ nꞌobodo ahụ pụta, unu esola ya keta oke na mmehie ya, nꞌihi na a ghaghị ịta unu ahụhụ ma unu soro ya mehie.
5
Nꞌihi na mmehie ya amụbaala ruo eluigwe. Chineke ejikerekwala ikpe ya ikpe nꞌihi ajọ omume ya.
6
Mesonụ ya mmeso dị ka o si mesoo unu. Kwụọnụ ya ụgwọ ọrụ ọjọọ okpukpu abụọ karịa ka o mere. O wetaara ọtụtụ mmadụ iru uju, wetakwaranụ ya iru uju okpukpu abụọ karịa nke a o wetaara ndị ọzọ.
7
O biela ndụ ime onwe ya obi ụtọ, na inwezu ihe nile gụrụ ya agụụ, mee ka ọnọdụ ya ugbu a bụrụ nanị iru uju na ahụ mgbakasị. Ọ na-anya isi na-asị, ‘Abụ m eze nwanyị nọ nꞌelu ocheeze m. Abụghị m nwanyị ihe ọ bụla kọrọ, dị ka nwanyị di ya nwụrụ, iru uju ọ bụla adịghị nye m.’
8
Ebe okwu dị otu a si ya nꞌọnụ pụta, iru uju nke ọnwụ na-eweta, ya na obi ọjọọ, na ọnwụ ga-abịakwasị ya nꞌotu ụbọchị. A ga-eji ọkụ rechapụ ya, nꞌihi na Onyenwe anyị, onye na-ekpe ya ikpe, bụ onye pụrụ ime ihe nile.”
9
Ndị eze nke ụwa, ndị sooro ya mee mmehie ịkwa iko, ndị ṅụrịkwara ọṅụ nꞌihi ihe ọma nke mmekọta ha na ya na-eweta ga-eru uju nꞌihi ya, mgbe ha ga-ahụ anwụrụ ọkụ nke na-apụta mgbe a na-akpọ ya ọkụ.
10
“Ewoo Babilọn! Ọ bụ otu a ka ị si laa? Obodo ukwu a maara aha ya! Nꞌotu ntabi anya, ya bụ na ikpe Chineke adakwasịla gị?”
11
Ndị ahia nke ụwa ga-akwa akwa ruokwa uju nꞌihi ya, nꞌihi na ọ dịkwaghị onye fọdụrụ ga-azụ ihe ahia ha.
12
Nꞌihi na Babilọn a bụ nnọọ nnukwu obodo ebe a na-azụ ahia. Na Babilọn ka a na-azụ ọlaedo na ọlaọcha na nkume dị oke ọnụ ahia, na ọla, na ezi akwa rekereke, na akwa na-acha uhie uhie, na akwa dị ezi ọcha, na osisi ọ bụla na-esi isi ụtọ, ya na ihe nile ọ bụla e ji mpi enyi mee, na ihe nile ọ bụla e ji osisi pịa, ma ọ bụ ọla e ji igwe dị iche iche kpụọ, ma ọ bụ nkume.
13
Ha na ụda dị iche iche na mmanụ otite dị iche iche, na ọkpụrụkpụ eso osisi na-esi isi ụtọ, a na-akpọ frankinsensi, na mmanya na mmanụ olivu, na ụtụ ọka na ọka, na anụ ụlọ, na atụrụ, na inyinya na ụgbọ ala, na ndị ohu, na mkpụrụ obi mmadụ.
14
Ndị ahụ nọ na-ele Babilọn anya, ndị hụrụ ihe ndị a anya, kwakwara akwa sị, “Ihe ọma ahụ nile ị hụrụ nꞌanya agabigala. Ihe ọma nile i ji ebi ndụ, na ihe oke ọnụ ahia nile i ji azụ afọ gị, agaghị abụkwa nke gị! Lee ka ha si laa ruo mgbe ebighị ebi!”
15
Ya mere, ndị ahia ahụ ghọrọ ọgaranya site nꞌiresi ndị obodo Babilọn ahia ga-eguzo nꞌebe dị anya na-atụ egwu ihe ga-eme ha onwe ha, ma na-akwa akwa na-etikwa mkpu na-asị,
16
“Ewoo! obodo ukwu ahụ mara mma dị ka nwanyị yi uwe na-acha odo odo na uhie uhie, nke nya ihe olu e ji ọlaedo na nkume dị oke ọnụ ahia mee, na nke gbakwa mgba nꞌaka e ji nkume dị oke ọnụ ahia kpụọ,
17
ọ̀ bụ otu a ka i si laa? Ọ̀ bụ nꞌotu ntabi anya a ka akụ nile dị nꞌime gị ji laa nꞌiyi?” Ndị nile nwere ụgbọ na-aga nꞌoke osimiri, na ndị na-akwọ ụgbọ ndị ahia nꞌoke osimiri, na ndị nile na-eso ụgbọ mmiri ga-anọ nꞌebe tere anya
18
na-eti mkpu mgbe ha ga na-ele anya na-ahụ anwụrụ ọkụ na-ala elu, na-asị, “Olee ọzọ nꞌụwa ka a ga-ahụ obodo dị otu a?”
19
Ha ga-ekpokwasị aja nꞌisi igosi obi ọjọọ ha na-eti mkpu akwa na-asị, “Ewoo! Ewoo! Leenụ ka obodo a si laa nꞌiyi o! Obodo ukwu ahụ mere anyị ka anyị bụrụ ndị ọgaranya site nꞌakụ dị nꞌime ya. Ma ugbu a nꞌotu ntabi anya, ihe nile dị nꞌime ya erechapụla ọkụ!”
20
“Ma gị eluigwe ṅụrịa ọṅụ nꞌihi ihe a dakwasịrị obodo a, unu ụmụ Chineke, na unu ndị amụma ya na ndị ozi, ṅụrịakwanụ ọṅụ. Nꞌihi na Chineke ekpeela obodo a ikpe nꞌoge ikpeazụ a.”
21
Mgbe ahụ otu mmụọ ozi tụtụlitere otu nkume nke dị ka nkume e ji akwọ ihe, tụba ya nꞌime oke osimiri, tie mkpu sị, “Otu a ka a ga-esi tụfuo Babilọn obodo ukwu ahụ, dị ka m si tụfuo nkume a. A gaghị ahụkwa ya anya ọzọ ruo mgbe ebighị ebi.
22
Ọ dịghị mgbe ọzọ ụzụ egwu ga-adị nꞌebe ahụ. A gaghị anụkwa olu oja, na une, na ụbọ akwara na ndị na-akpọ ha. A gaghị ahụkwa ndị nka ọ bụla nꞌime ya. A gaghị ahụkwa ndị na-akwọ ọka ma ọ bụ igwe e ji akwọ ọka nꞌime ya.
23
Abalị nile ga-abụkwa nanị oge ọchịchịrị nꞌihi na a gaghị ahụ, ọ bụladị otu oriọna nꞌime ya. Ọṅụ nke oriri ọlụlụ di na nwụnye agaghị adịkwa ọzọ. Olu obi ụtọ nke nwoke na nwanyị na-alụ di na nwụnye agaghị adịkwa. Nꞌụwa nile ka a maara ndị ahia nile si nꞌobodo a, ọ bụkwa mgbaasị ya ka o ji ghọgbuo mba nile nke ụwa.
24
Nꞌime ya ka a chọtara ọbara ndị amụma nile, na ọbara ndị nsọ Chineke nile, na ọbara ndị ọzọ ahụ nile e gburu nꞌụwa.”
← Chapter 17
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 19 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22