bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Acts 1
Acts 1
Igbo 1988
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 2 →
1
Ezi enyi m Teofilọs, nꞌakwụkwọ mbụ m deere gị, agwara m gị ihe banyere Jisọs Kraịst. Agwara m gị ihe banyere ndụ ya, ọrụ ọ rụrụ, na ihe o ziri.
2
Agwakwara m gị otu o siri laghachi nꞌeluigwe mgbe o nyesịrị ndị na-eso ụzọ ya ndụmọdụ site nꞌike Mmụọ Nsọ. Ndị ahụ bụ ndị na-eso ụzọ ya ọ họpụtara.
3
O gosiri ha onwe ya mgbe o si nꞌọnwụ bilie. Ihe ruru iri ụbọchị anọ site na mgbe a kpọgburu ya, ha hụrụ ya na ndụ site nꞌoge ruo nꞌoge. Nꞌụzọ doro anya, o gosiri ha na ọ bụ ya onwe ya ka ha na-ahụ. Nꞌoge a ọ gwara ha okwu banyere alaeze Chineke.
4
Nꞌoge ọ nọnyeere ha o nyere ha iwu ka ha hapụ isite na Jerusalem pụọ. Ọ sịrị ha, “Nọgidenụ na Jerusalem tutuu ruo mgbe unu sị nꞌaka Nna m nata onyinye ahụ o kwere na nkwa dị ka m gwara unu.”
5
Jisọs gwakwara ha sị, “Ọ bụ ezie na Jọn ji mmiri mee unu baptizim, ma tupuu abali ole na ole agafee, a ga-eji Mmụọ Nsọ mee unu baptizim.”
6
Oge ọzọ ya na ndị na-eso ụzọ ya nọkọrọ, ha jụrụ ya ajụjụ sị, “Onyenwe anyị, o ruola oge ị ga-eme ka Izirel nọdụrụ onwe ha dị ka alaeze nwere onwe ya?”
7
Ma Jisọs zara sị ha, “Ọ bụghị ọrụ unu ịmata ihe Nna m na-ezube ime, na mgbe ọ na-akwado ime ihe o zubere ime.
8
Ma mgbe Mmụọ Nsọ bịakwasịrị unu, unu ga-anata ike. Mgbe ahụ unu ga-agwa ndị mmadụ nọ na Jerusalem, na Judia, na Sameria, na mmadụ nile nọ na nsọtụ ụwa nile, ihe banyere m.”
9
Ọ dịghị anya, mgbe o kwusịrị okwu ndị a, mgbe ha nọ na-ele ya anya, e weliri ya elu, igwe ojii kpuchiri ya, mee ka ha ghara ịhụkwa ya anya ọzọ.
10
Mgbe ha na-elegide anya ha nꞌelu na-ele ya anya ka ọ na-arịgo, na mberede, ha hụrụ mmadụ abụọ yi uwe ọcha ka ha guzoro nꞌakụkụ ha.
11
Mmadụ abụọ ndị a jụrụ ha sị, “Ndị Galili, gịnị mere unu ji guzo nꞌebe a na-ele anya nꞌeluigwe? Jisọs alaala nꞌeluigwe. Otu ụbọchị unu ga-ahụkwa ya anya ọzọ, ka ọ na-alọta dị ka unu hụrụ ya taa, ka ọ na-ala nꞌeluigwe!”
12
Ha nọ nꞌugwu olivu mgbe ihe ndị a na-eme. Emesịa, ha sitere nꞌebe ahụ laghachikwa na Jerusalem. Ugwu olivu adịghị anya site na Jerusalem. Ọ bụ ihe dị ka kilomita abụọ site nꞌebe ahụ.
13
Mgbe ha lọghachiri Jerusalem, ha rigooro nꞌelu ụlọ ahụ ha nọ nꞌime ya. Ndị a bụ ndị nọ nꞌụlọ ahụ: Pita, na Jọn, na Jemes, na Anduru, na Filip, na Tọmọs, na Batalomi, na Matiu, na Jemes nwa Alfiọs, na Saịmọn onye aha ya bụkwa Zilọt, na Judas nwa Jemes.
14
Ha nile jikọtara onwe ha ọnụ na-ekpe ekpere site nꞌoge ruo nꞌoge. Ndị sonyere ha bụ ụfọdụ ndị inyom na Meri nne Jisọs, na ụmụnna Jisọs.
15
Ọ bụ nꞌoge a, mgbe ihe dị ka narị ndị kwere ekwe na iri abụọ zukọtara ka Pita biliri ọtọ nꞌetiti ha gwa ha okwu sị,
16
“Ụmụnna m, ọ dị mkpa ka ihe e dere nꞌakwụkwọ nsọ mezuo banyere Judas onye duuru ndị jidere Jisọs bịa. Mmụọ Nsọ kwuru na nke a ga-eme mgbe o sitere nꞌọnụ Devidi kwuo okwu nꞌoge gara aga.
17
Judas bụ otu nꞌime anyị. O nwere òke nꞌime ọrụ a, nꞌihi na a họpụtara ya dị ka e si họpụta anyị.
18
Ma ego ọ natara nꞌihi ọrụ ọjọọ ya ka o ji zụọ ala. Nꞌime ala ahụ ka ọ nọkwa daa ada, afọ ya etipuo, eriri afọ ya awụsịakwa.
19
Ndị nile bi na Jerusalem nụrụ akụkọ banyere ya. Nꞌihi ya ha kpọrọ ala ahụ Judas zụrụ Ala Ọbara.
20
E dere ya nꞌakwụkwọ Abụ Ọma sị, ‘Ka ebe obibi ya tọgbọrọ nꞌefu. Ka mmadụ ọ bụla hapụ ibi nꞌime ya. Ka onye ọzọ narakwa ọrụ ya.’
21
“Nꞌihi ya, anyị ga-ahọpụta onye ọzọ nꞌọnọdụ ya. Ka ọ bụrụ otu nꞌime anyị. Ka o soro anyị gbakọọ ama banyere mbilite nꞌọnwụ Jisọs. Ka anyị site nꞌetiti anyị họpụta onye naara eso anyị na-ejegharị site na mbụ, site nꞌoge Jọn mere baptizim ya tutuu ruo nꞌụbọchị ahụ Jisọs laghachiri nꞌeluigwe.”
23
Ụmụnna ahụ họpụtara mmadụ abụọ, Matayas na Josef Jọstus. Aha ọzọ a na-akpọ Josef Jọstus bụ Basabas.
24
Ha kpere ekpere rịọ Chineke ka o gosi ha onye ha ga-ahọrọ nꞌime mmadụ abụọ ahụ. Otu a ka ha si kpee ekpere ahụ: “Onyenwe anyị, ị maara obi mmadụ nile. Gosi anyị onye ị họpụtara nꞌime mmadụ abụọ ndị a ka ọ bụrụ onyeozi ga-anọchi anya Judas Iskariọt, onye gara ebe o kwesịrị ka ọ gaa.”
26
Mgbe ha kpesịrị ekpere, ha fere nza. Nza ahụ makwara Matayas. Ọ bụ ya ka ha họpụtara, gụnye ya ka ọ bụrụ otu nꞌime ndị ozi iri na abụọ ahụ.
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 2 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28