bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Acts 26
Acts 26
Igbo 1988
← Chapter 25
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 27 →
1
Mgbe ahụ Agripa gwara Pọl sị, “Gaa nꞌihu kọọrọ anyị ihe nile i maara.” Pọl gbasara aka ya abụọ kwuo okwu ịgọrọ onwe ya sị,
2
“Ana m agụ onwe m dị ka onye nwere ihuọma, eze Agripa, inwe ohere ọma dị otu a, ịsara ọnụ m nꞌihu gị nꞌihe nile metụtara ebubo ndị Juu na-ebo m.
3
Nꞌihi na amatara m na ị bụ ọkachamara nꞌihe gbasara iwu na omenala ndị Juu. Biko ana m arịọ gị ka i jiri ndidi gee m ntị.
4
“Dị ka ndị Juu maara nke ọma, esitere m na nwanta nwee ọzụzụ nke ibi obi ndị Juu nꞌobodo anyị bụ Tasọs, emesịakwa, na Jerusalem. Ebikwara m obi dị ka onye Juu.
5
Ọ bụrụ na eziokwu dị ha nꞌọnụ ha maara na dị ka iwu na omenala ndị Juu siri dị, abụ m onye idebe iwu nile na omenala nile nꞌusoro ndị Farisii na-anụkarị ọkụ nꞌobi karịa ndị ibe m nile.
6
Ma ugbu a, a na-ekpe m ikpe nꞌihi na enwere m olileanya na nkwa ahụ Chineke kwere nna nna anyị ochie ha.
7
Nkwa nke ebo iri na abụọ nile nke Izirel na-ele anya ịnata mgbe ha na-efe Chineke ehihie na abalị. Ọ bụ nꞌihi olileanya a ka ndị Juu ji na-ebo m ebubo.
8
“Gịnị mere unu, ndị Juu, jiri na-eche na ọ rara Chineke ahụ ime ka mmadụ site nꞌọnwụ bilie ọzọ?
9
“Na mbụ, anara m eche na apụrụ m imeso ndị nile kweere na Jisọs onye Nazaret mmeso ọjọọ nile.
10
Etinyere m ọtụtụ ndị na-eso ụzọ a bi na Jerusalem nꞌụlọ mkpọrọ, site nꞌike m natara nꞌaka ndị isi nchụaja. Mgbe a mara ndị ha ikpe ọnwụ, ana m akwagide ka e gbuo ha.
11
Ọtụtụ mgbe atara m ndị na-eso ụzọ a ahụhụ, mekpaa ha ahụ nꞌebe nzukọ ha nile, ime ka ha gọnarị Kraịst. Nꞌihi na iwe m dị ọkụ megide ha, esogburu m ha nꞌobodo dị iche iche nke na-abụghị obodo ndị Juu.
12
“Ọ bụkwa nꞌihi ịkpagbu ndị na-eso ụzọ a ka m ji gaa Damaskọs. Anatakwara m ike nꞌaka ndị isi nchụaja.
13
Otu ụbọchị nꞌoge ehihie, mgbe mụ na ndị otu m na-aga nꞌụzọ Damaskọs, ìhè dị ka amụma egbe eluigwe sitere nꞌeluigwe chaa anyị gburugburu.
14
Anyị nile dara nꞌala. Ma anụrụ m olu na-agwa m okwu nꞌasụsụ Hiburu sị, ‘Sọl! Sọl! Gịnị mere i ji na-esogbu m? Ị na-enye mkpụrụ obi gị nsogbu!’
15
“Ajụrụ m onye na-ekwu okwu ahụ ajụjụ sị, ‘Ị bụ onye, Onyenwe anyị?’ Onyenwe anyị zaghachiri, ‘Abụ m Jisọs onye gị onwe gị na-esogbu.
16
Ugbu a, bilie ọtọ! Nꞌihi na ahọpụtala m gị ka ị bụrụ onyeozi m na onye akaebe m. Ị ga-emekwa ka ụwa nile mara ihe banyere nzute i zutere m taa, na ọtụtụ mgbe ọzọ m ga-ezute gị.
17
Aga m echebe gị site nꞌaka ndị Juu na nꞌaka ndị mba ọzọ kwa, ndị m na-eziga gị ka i jekwuru.
18
Imeghe anya ha ka ha hụ ọnọdụ ha. Ka ha chegharịa biekwa ndụ nꞌime ìhè nke Chineke, kama ịwagharị nꞌọchịchịrị bụ ụzọ nke ekwensu. Ka ha soro ndị ọzọ nꞌebe nile nata mgbaghara mmehie na nketa nke Chineke na-enye ndị nile a sachapụrụ mmehie na ndị e sitere nꞌokwukwe ha mee ka ha bụrụ ndị Chineke doro iche.’
19
“Ya mere, eze Agripa, enupụghị m isi nꞌọhụ nke eluigwe ahụ.
20
Ebidoro m izisa ozi ọma a nye ndị anyị bi na Damaskọs. Emekwara m otu a na Jerusalem na nꞌime Judia nile na nꞌetiti ndị mba ọzọ. Ana m ekwusa mkpa ọ dị ka mmadụ nile nwee nchegharị lọghachikwute Chineke. Ka ha gosikwa nchegharị ha site nꞌezi ọrụ nke ha na-arụ.
21
Ọ bụ nꞌihi nke a ka ndị Juu jiri nwụchie m nꞌụlọ nsọ ukwu ahụ ma chọsiekwa ụzọ ike ịnapụ m ndụ m.
22
Ma Chineke chebere m mee ka bụrụ onye dị ndụ taa ịkọrọ mmadụ nile akụkọ a, ndị ukwu na ndị nta. Ihe m na-ekwu bụkwa ihe ndị amụma na Mosisi kwuru na ọ ga-emezu.
23
Na Onye nzọpụta ahụ ga-ahụ ahụhụ bụrụkwa onye ga-esi nꞌọnwụ bilie iwetara ndị Juu na ndị mba ọzọ nzọpụta!”
24
Mgbe Pọl na-ekwu okwu ndị a, na mberede Festọs tiri mkpu sị, “Pọl, ị bụ onye isi mebiri! Oke mmụta gị na-achọ iwetara gị isi mmebi!”
25
Ma Pọl zaghachiri sị, “Isi emebighị m ezigbo nna anyị Festọs. Ihe m na-ekwu bụ nanị eziokwu.
26
Eze Agripa nꞌonwe ya makwaara ihe ndị a nile. Ana m ekwu eziokwu nꞌihi na o doro m anya na emeghị ihe ndị a nile na nzuzo.
27
Gị eze Agripa, i kwenyeghị na ndị amụma? Amaara m na i kweere.”
28
Agripa gbochiri ya ikwu okwu ọzọ sị ya, “Pọl, ọ bụ site nꞌokwu ndị a na-erijughị afọ ka ị chọrọ isite na ya mee ka m bụrụ onye kweere na Kraịst?”
29
Ma Pọl zara ya sị, “Ọ gaara atọ m ụtọ ma ọ bụrụ na Chineke ga-ekwe ka e site nꞌokwu m ndị a, ma ha rijuru afọ, ma ha erijughị afọ, mee ka gị na ndị nile nọ nꞌebe a bụrụ ihe mụ onwe m bụ nꞌime Kraịst ma ewezuga agbụ ndị a!”
30
Mgbe ahụ eze Agripa na Festọs na Benaisị nwụnye ya na ndị ọzọ biliri pụọ.
31
Mgbe ha gbarịtara izu banyere Pọl nꞌetiti onwe ha, ha kwekọrịtara sị, “Nwoke a ekwesịghị ọnwụ ma ọ bụ mkpọro.”
32
Agripa gwara Festọs sị, “A gaara ahapụ ya ma ọ bụrụ na o nyefeghị Siza ikpe ya.”
← Chapter 25
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 27 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28