bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Acts 6
Acts 6
Igbo 1988
← Chapter 5
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 7 →
1
Nꞌoge ahụ, mgbe ọnụ ọgụgụ ndị kwere ekwe na-aba ụba, esemokwu dapụtara nꞌetiti ndị kwere ekwe na-asụ asụsụ Griik na ụmụnna ha ndị Juu. Esomokwu a dapụtara nꞌihi na ụfọdụ ụmụ nwanyị di ha nwụrụ anwụ adịghị eketa nri kwesịrị ịbụ nke ha oge nile a na-eke ya.
2
Nꞌihi nke a, ndị ozi iri na abụọ ahụ kpọrọ nzukọ ndị nile kwere ekwe sị ha, “O zighị ezi na anyị ga-akwụsị ikwusa ozi ọma Chineke bido na-eke nri.
3
Nꞌihi nke a ụmụnna anyị, sitenụ nꞌetiti unu họpụta ụmụ nwoke asaa unu tụkwasịrị obi nke ọma. Ha ga-abụ ndị jupụtara na Mmụọ Nsọ, bụrụkwa ndị maara ihe. Anyị ga-enyefe ha ọrụ a nꞌaka.
4
Ma anyị ga-ewerekwanụ ọrụ ikpe ekpere, na ọrụ nile metụtara izisa ozi ọma.”
5
Mmadụ nile nabatara atụmatụ a nke ọma. Ha họpụtara Stivin, nwoke tozuru oke nꞌokwukwe, bụrụkwa onye jupụtara na Mmụọ Nsọ. Ha họpụtakwara Filip, na Prokorọs, na Nikanọ, na Timọn, na Pamenas, na Nikolas, onye Antiọk. Na mbụ Nikolas bụrị onye Griik na-efe Chineke nꞌụzọ ndị Juu si efe ya.
6
Ha kpọtaara ndị ozi mmadụ asaa ndị a ha họpụtara. Ndị ozi kpeere ha ekpe, bikwasịkwa ha aka nꞌisi.
7
Okwu Chineke gbasara. Ọnụ ọgụgụ ndị kwere ekwe bakwara ụba. Nꞌoge a ọtụtụ ndị nchụaja nabatara Jisọs Kraịst.
8
Stivin, nwoke jupụtara nꞌamamihe na ike Chineke, rụrụ ọtụtụ ọrụ ebube na ụrụ ịtụnanya dị ukwuu.
9
Ma ụfọdụ ndị Juu, ndị na-aga ụlọ nzukọ ndị Juu a na-akpọ Nzukọ ndị nweere onwe ha, na ụfọdụ mmadụ ndị si Sisilia nke dị nꞌakụkụ Esia, bidoro ịrụsị Stivin ụka.
10
Ma Stivin maara ihe nke ukwuu, bụrụkwa onye jupụtara na Mmụọ Nsọ. Ya mere, ndị Juu a enweghị ike imegide ya.
11
Nꞌihi ya ha zụrụ ụfọdụ mmadụ, ndị boro ya ebubo ụgha sị, “Anyị nụrụ ka Stivin na-ekwu okwu ọjọọ banyere Mosisi na Chineke.”
12
Site nꞌokwu a, ha kpasuru ndị mmadụ iwe, ma ndị okenye ma ndị ozizi iwu. Ha bịakwutere Stivin jide ya, kpụrụ ya gaa nꞌụlọ ikpe ndị Juu.
13
Ha kpọtakwara ndị bịara gbaa ama ụgha megide Stivin sị, “Oge nile ka nwoke a na-ekwu okwu ọjọọ banyere ụlọ nsọ ukwu Chineke na iwu Mosisi nyere anyị.
14
Nꞌezie, anyị nụrụ ka o kwuru sị, ‘Jisọs onye Nazaret ga-akwatu ụlọ a, gbanwee omenala Mosisi nyere anyị.’ ”
15
Ndị nile nọ nꞌụlọ ikpe ahụ legidere Stivin anya. Ha hụrụ ihu ya ka ọ na-enwụ dị ka ihu mmụọ ozi.
← Chapter 5
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 7 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28