bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Acts 28
Acts 28
Igbo 1988
← Chapter 27
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
1
Ọ dịghị anya anyị chọpụtara na anyị nọ nꞌagwa etiti Malta.
2
Ndị obodo a nwere ọmiko nꞌahụ anyị. Ha kwanyeere anyị ọkụ nke dị ka ọkụ e ji esi ite, nꞌakụkụ mmiri ahụ iji ịchụrụ anyị oyi na iji sị anyị “Unu abịala.”
3
Nꞌoge Pọl na-achịkọta nkụ itinye nꞌọkụ a otu agwọ ọjọọ sitere nꞌime nkụ na-enwụ ọkụ mapụta nꞌihi okpomọkụ. Agwọ a tụhịkọtara onwe ya nꞌaka Pọl, tagidesiekwa ya eze ike nꞌaka.
4
Mgbe ndị obodo a hụrụ agwụ ahụ ka ọ tụhịkọtara onwe ya nꞌaka Pọl ha gwarịtara onwe ha sị, “Onye a bụ ogbu mmadụ, anaghị eji ọkụ enyo ya! Ọ bụ ezie na ọ gbanarịrị mmiri, ma ikpe ziri ezi aghaghị ikpe onwe ya.”
5
Ma Pọl hụpụrụ agwọ ahụ nꞌaka ya, mee ka ọ daba nꞌọkụ. Ma ọ dịghị ihe mere ya.
6
Mmadụ ndị a na-ele anya ma aka Pọl ga-aza, ma ọ bụ na Pọl ga-ada nwụọ. Ma mgbe ha chegidere hụ na ihe abụọ ndị a emeghị, ha gbanwere obi ha banyere ihe ha na-eche. Ha bidoro iche na Pọl bụ chi.
7
Na nso ọnụ mmiri a ebe anyị kwụsịrị, otu ubi dị ya. Ọ bụ ubi Pọbiliọs onye na-achị agwa etiti ahụ. Nwoke a nabatara anyị nke ọma zụọkwa anyị nri ụbọchị atọ.
8
Nꞌoge ahụ nna Pọbiliọs nwere ahụ ọkụ na afọ ọsisa. Pọl banyere nꞌime obodo gaa leta ya kpeere ya ekpere bikwasịkwa ya aka. Ahụ dịrị ya mma ọsịịsọ.
9
Mgbe ahụ, ndị nile nwere nrịrịa nꞌagwa etiti ahụ bịakwutere Pọl. Ọ gwọkwara ha.
10
Nꞌihi ọrụ ebube Chineke ndị a, anyị natara ọtụtu onyinye. Mgbe oge ịnyapụ ụgbọ anyị ruru, ha nyere anyị ọtụtụ ihe dị anyị mkpa nke pụrụ idu anyị nꞌije ahụ.
11
Anyị nọrọ ihe dị ka ọnwa atọ nꞌagwa etiti ahụ tutuu anyị anyalie ụgbọ. Nꞌoge a ọ bụ ụgbọ a na-akpọ Ejima nke sitere Alegzandria bịa nọọ nꞌagwa etiti ahụ nꞌoge oyi ka anyị soro pụọ.
12
Ebe isi mbụ anyị kwụsịrị mgbe anyị hapụrụ bụ na Sirakọs. Nꞌebe a anyị nọrọ ụbọchị atọ.
13
Site na Sirakọs anyị gara gburugburu tutuu rute Rejiọm. Mgbe otu ụbọchị gafere ikuku bidoro ife site na ndịda. Nꞌụbọchị nke ọzọ ya, anyị rutere Pọteọli.
14
Nꞌebe a anyị chọpụtara ụfọdụ ndị kwere ekwe ndị rịọrọ ka anyị nọnyere ha ụbọchị asaa. Site nꞌebe a anyị rutere Rom.
15
Ụmụmma anyị nọ na Rom nụrụ na anyị na-abịa. Ha pụtara chere anyị nꞌebe a na-akpọ Forum, nꞌahịa dị nꞌụzọ Apịa. Ndị ọzọ zutere anyị nꞌebe ọzọ a na-akpọ Ụlọ ndị ije. Mgbe Pọl hụrụ ha o kelere Chineke ma nweekwa obi ike.
16
Na Rom e nyere Pọl ohere ibiri onwe ya dị ka o si chọọ nꞌebe masịrị ya. Ma otu onye agha na-eche ya nche.
17
Mgbe ụbọchị atọ gasịrị, Pọl ziri ozi ka a kpọọrọ ya ndị isi ndị Juu bi nꞌobodo a. Ọ gwara ha okwu sị, “Ụmụnna m, ọ bụ ndị Juu bi na Jerusalem jidere m nyefee m nꞌaka ndị ọchịchị obodo Rom ka e kpee m ikpe. Ọ bụ ezie na emekpaghị m onye ọ bụla ahụ, emerụkwaghị m omenala nna anyị ha.
18
Ndị ọchịchị Rom lenyere anya nꞌikpe m chọọ ịhapụ m ka m laa. Nꞌihi na ha achọtaghị ihe kwesịrị ịma m ikpe ọnwụ dị ka ndị anyị chọrọ.
19
Ma mgbe ndị Juu jụrụ na a ga-ahapụ m, ahụrụ m na ọ dị mkpa ibutere Siza ikpe m. Ma o nweghị ihe ọjọọ m bu nꞌuche megide ha.
20
Akpọrọ m unu taa ka mụ na unu hụkọọ ka unu matakwa na anọ m nꞌagbụ nꞌihi okwukwe m kweere na Onye nzọpụta abịala.”
21
Ndị Juu ahụ zara ya sị, “Anyị anataghị ozi ọ bụla banyere gị. Anyị anụbeghị akụkọ ọ bụla site na Judia ma ọ bụ okwu ọjọọ ọ bụla site nꞌọnụ ndị isi na Jerusalem banyere gị.
22
Otu ọ dị, anyị ga-achọ ịmata ihe i kwenyere na ya. Nꞌihi na anyị maara na a na-ekwujọ ndị na-eso ụzọ a nꞌebe nile.”
23
Ha yiri ọnụ mgbe ha ga-abịaghachi. Nꞌụbọchị ahụ, ọtụtụ mmadụ bịara nꞌụlọ ya. Ọ gwara ha banyere alaeze Chineke na Jisọs site nꞌakwụkwọ nsọ. O mere nke a site nꞌakwụkwọ Mosisi na nke ndị amụma. O bidoro izi ha ihe site nꞌụtụtụ ruo anyasị.
24
Ụfọdụ kweere, ma ụfọdụ mechiri ntị ha na obi ha.
25
Ma mgbe ha tụlechara okwu ndị a nꞌobi ha, ha hapụrụ Pọl laa, ma ha bukwa okwu a Pọl kwuru nꞌobi:
26
“Eziokwu ka Mmụọ Nsọ Chineke kwuru mgbe o sitere nꞌọnụ Aịzaya onye amụma kwuo okwu sị, ‘Jekwuru ndị a gwa ha okwu sị, Unu ga-anụ ma unu agaghị aghọta, unu ga-ele anya, ma o nweghị ihe unu ga-ahụ.
27
Nꞌihi na obi unu mara abụba, ntị unu adịkwaghị anụ ihe. Unu mechikwara anya unu nꞌebe nghọta dị. Nꞌihi na unu achọghị ịhụ, unu achọghị ịnụ, unu achọkwaghị ịghọta ma lọghachikwute m ka m gwọ unu.’ ”
28
Pọl kwukwara sị, “Ya mere, achọrọ m ka unu ghọta na okwu nzọpụta a si nꞌaka Chineke bịa dịkwaara ndị mba ọzọ. Ha ga-anatakwa ya.”
30
Pọl biri obi nke onwe ya afọ abụọ nꞌụlọ ọ na-akwụ ụgwọ ya. Ọ nabatakwara ndị nile bịara ileta ya,
31
na-akọrọ ha, na-atụghị egwu, ihe banyere alaeze Chineke na banyere Onyenwe anyị Jisọs Kraịst. Ọ dịkwaghị onye ọ bụla gbalịrị igbochi ya.
← Chapter 27
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28