bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Acts 7
Acts 7
Igbo 1988
← Chapter 6
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 8 →
1
Onyeisi nchụaja jụrụ Stivin ajụjụ sị, “Ị̀ nụrụ ihe ndị a na-ekwu? Ọ bụ eziokwu?”
2
Stivin zara sị ya, “Ụmụnna m na ndị mụrụ m! Geenụ ntị! Chineke onye dị ebube gosiri nna nna anyị Eberaham onwe ya mgbe ọ nọ na Mesopotamia, tupuu ọ gaa biri na Haran.
3
Chineke gwara ya sị, ‘Site nꞌobodo gị na nꞌetiti ndị ikwu gị pụọ, gaa nꞌala m ga-egosi gị.’
4
Eberaham sitere nꞌobodo ndị Kaldia puọ, gaa biri na Haran. Mgbe nna ya nwụrụ, ọ hapaụrụ Haran bịa biri nꞌala a.
5
Nꞌoge ahụ, Chineke enyeghị ya òke ọ bụla nꞌala a. Chineke enyeghị ya ọ bụladị otu nzọ ụkwụ ka ọ bụrụ nke ya. Ma Chineke kwere ya nkwa na ọ ga-enye ya ala a. Chineke kwekwara nkwa na ụmụ ụmụ ya ga-eketa ala a. Ma nꞌoge ahụ Chineke kwere Eberaham nkwa a, Eberaham enweghị nwa ọ bụla.
6
Nke a bụ ihe Chineke gwara Eberaham, ‘Ùmụ ụmụ gị ga-ebi na mba ọzọ, ebe ha ga-anọ dị ka ohu. A ga-emejọkwa ha narị afọ anọ.
7
Ma aga m ekpe mba ahụ ikpe, bụ mba ahụ ebe ha ga-abụ ohu. Mgbe m kpesịrị ha ikpe, ụmụ ụmụ gị ga-ahapụ ala ahụ bịa biri nꞌebe a ife m ofufe.’
8
“Chineke mere ka ọgbụgba ndụ obibi ugwu dịrị nꞌetiti ya na Eberaham. Ọ bụ nꞌokpuru ọgbụgba ndụ ahụ ka Eberaham mụrụ Aizik. Aizik mụtara Jekọb. Ọ bụkwa ụmụ nke Jekọb mụtara bụ ndị isi ebo iri na abụọ nke Izirel.
9
Ụmụ Jekọb sitere nꞌekworo ree Josef dị ka ohu. A kpọọrọ Josef gaa nꞌala Ijipti. Ma Chineke nọnyeere ya nꞌebe ahụ.
10
Ọ dọpụtara ya site nꞌime nsogbu ya nile, nyere ya aka inweta ihuọma nꞌebe Fero nọ, site nꞌamamihe Chineke nyere ya. Fero mekwara Josef onye na-achị Ijipti na ezinụlọ ya.
11
“Nꞌoge ahụ, ụnwụ dị nꞌala Ijipti ma nꞌala Kenan. Ụnwụ a wetara ahụhụ dị ukwuu. Nna nna anyị ha enwekwaghị ike ịchọta nri.
12
Ma mgbe Jekọb nụrụ na nri dị nꞌala Ijipti, o ziri ụmụ ya bụ nna nna anyị ha ka ha gaa Ijipti ịzụta nri. Nke a bụ oge nke mbụ ha na-aga Ijipti.
13
Mgbe ha gara Ijipti nke ugboro abụọ Josef kọwaara ụmụnna ya onye ọ bụ, site na nke a, Fero nụrụ banyere ezinụlọ Josef.
14
Mgbe ahụ Josef ziri ozi gwa nna ya na ndị ikwu ya, ndị dị iri mmadụ asaa na ise nꞌoge a, ka ha bịa nꞌala Ijipti.
15
Jekọb gara Ijipti, birikwa nꞌebe ahụ. Ebe ahụ ka ọ nọkwa nwụọ. Ebe ahụ ka nna nna anyị ha nwụkwara.
16
E buuru ozu ha gaa Shekem, ebe e liri ha, nꞌime ala ahụ Eberaham zụrụ nꞌaka ụmụ Hamọ.
17
“Ma mgbe oge ahụ Chineke kwere ha na nkwa na-abịaru nso, ụmụ ụmụ Eberaham bara ụba nꞌọnụ ọgụgụ.
18
Tutuu eze ọzọ, nke na-amakwaghị ihe banyere Josef, ebido ịchị.
19
Eze a megburu ndị agbụrụ anyị, kpagbuokwa ha. O mere ka ha tụfuo ụmụ ọhụrụ ha, ka ha nwụsịa.
20
“Ọ bụ nꞌoge a ka a mụrụ Mosisi. Ọ bụkwa nwa mara mma, onye a zụrụ nꞌezinụlọ nna ya ọnwa atọ.
21
Mgbe ndị mụrụ ya tụfuru ya, Ada Fero kpọọrọ ya, zụọ ya dị ka nwa nke aka ya.
22
A zụrụ Mosis nꞌamamihe nile nke ndị Ijipti. Ọ bụ onye oke okwu, bụrụkwa onye dị gara gara.
23
“Mgbe ọ gbara iri afọ anọ, ọ batara ya nꞌuche iga ileta ụmụnna ya.
24
Nꞌụzọ, ọ hụrụ ka otu onye Ijipti na-emegbu otu nꞌime ụmụnna ya. Ọ gara nyere onye Juu ahụ aka, kwụghachi onye Ijipti ahụ ụgwọ ọrụ ọjọọ ya, site nꞌigbu ya.
25
Mosisi chere na ụmụnna ya ga-aghọta na nzube ya na ha bụ otu. O chere na ha ga-aghọta na Chineke ga-esite nꞌaka ya gbapụta ha. Ma ha aghọtaghị.
26
“Nꞌụbọchị nke abụọ ya, Mosisi hụrụ ụmụnna ya abụọ ka ha na-alụ ọgụ. Ọ gbalịrị ime ka udo dịrị nꞌetiti ha. Ọ gwara ha sị, ‘Unu bụ ụmụnna, gịnị mere unu ji emegburita onwe unu?’
27
“Ma nwoke ahụ na-emegbu nwanna ya nupụrụ Mosisi sị ya, ‘Ònye họpụtara gị mee gị onyeisi na onye ikpe nꞌebe anyị nọ?
28
Ị̀ chọrọ igbu m dị ka i si gbuo onye Ijipt ụnyaahụ?’
29
“Okwu a mere ka Mosisi gbaa ọsọ. Ọ gbapụrụ gaa biri nꞌala Midian. Nꞌebe ahụ ka ọ nọ mụta ụmụ nwoke abụọ.
30
“Mgbe iri afọ anọ ọzọ gafere, mmụọ ozi Onyenwe anyị gosiri Mosisi onwe ya nꞌọzara dị ugwu Saịnaị gburugburu. Mmụọ ozi a bịakwutere Mosisi nꞌime ire ọkụ na-ere nꞌotu osisi.
31
Okụ a nke na-enwụ tụrụ Mosisi nꞌanya. Nꞌihi ya, ọ bịaketara nso ilezi ya anya na ịmata ihe ọ bụ. Ma mgbe ọ na-abịa nso, Chineke gwara ya okwu site nꞌetiti ọkụ ahụ sị,
32
‘Abụ m Chineke nna nna gị ha. Chineke Eberaham, na Aizik na Jekọb.’ Ụjọ tụrụ Mosisi nke ukwuu. Ọ makwara jijiji. O nwekwaghị ike ilegide ọkụ ahụ anya ọzọ.
33
“Ma Onyenwe anyị gwara ya sị, ‘Yipụ akpụkpọ ụkwụ gị. Nꞌihi na ebe ahụ i guzo bụ ala dị nsọ.
34
Ahụla m otu e si akpagbu ndị m nọ nꞌala Ijipti. Anụkwala m ịsụ ude ha. Abịakwala m ịzọpụta ha site nꞌala Ijipti. Ya mere, aga m eziga gị Ijipti. Ị ga-abụkwa onyeozi m.’
35
Mosisi a m na-ekwu ihe banyere ya bụ otu Mosisi ahụ ụmụnna ya jụrụ nꞌala Ijipti. Ee, ọ bụ otu Mosisi ahụ ha jụrụ ajụjụ sị, ‘Ònye mere gị onyeisi na onye ikpe nꞌebe anyị nọ?’ Ọ bụkwa Mosisi a ka Chineke zigara ịzọpụta na ịchị ndị ya. Chineke nyekwara Mosisi ike ime nke a site nꞌọnụ mmụọ ozi ahụ gwara ya okwu nꞌime ọkụ ahụ na-enwụ nꞌosisi ahụ dị nꞌọzara.
36
Mosisi a sitere nꞌala Ijipti kpọpụta ha. Tupuu ọ kpọpụta ha ọ rụrụ ọrụ ebube na ọrụ ịtụnanya nꞌala Ijipti. Mgbe ọ hapụrụ Ijipti ọ rụkwara ọrụ ebube nꞌosimiri uhie na nꞌime ọzara.
37
“Ọ bụkwa otu Mosisi a gwara ụmụ Izirel okwu sị, ‘Chineke ga-akpọlitere unu onye amụma ọzọ. Chineke ga-esite nꞌetiti unu kpọlite ya. Chineke ga-akpọlitekwa ya dị ka o si kpọlite m.’
38
Ọ bụkwa otu Mosisi a bụ onye kwuchitere ọnụ nna nna anyị ha nꞌihu mmụọ ozi ahụ, nꞌugwu Saịnaị, mgbe mmụọ ozi ahụ nyere ha iwu Chineke.
39
“Ma nna nna anyị ha jụrụ ige ntị! Ha chọrọrị nꞌobi ha ịlaghachi azụ nꞌala Ijipti!
40
Nꞌihi ya, ha gwara Erọọn sị, ‘Meere anyị chi ọzọ, nke ga-edu anyị, nꞌihi na anyị amaghị ihe mere nwoke a bụ Mosisi, onye sitere nꞌala Ijipti dupụta anyị.’
41
Ha meere onwe ha nwa ehi e ji ọlaedo kpụọ, chụọkwa aja nye ya. Ha ṅụrịrị ọṅụ nꞌihi chi ahụ ha ji aka ha mee.
42
“Nꞌihi nke a Chineke chepụrụ ihu ya site nꞌebe ha nọ, gbaketa ha azụ. Ọ hapụrụ ha ka ha fee kpakpando na anwụ na ọnwa. Nꞌakwụkwọ Emos onye amụma, Chineke na-ajụ ajụjụ sị, ‘Ụlọ Izirel, unu chụrụ aja jirikwa anụ e gburu egbu nye onyinye nꞌọzara iri afọ anọ. Ọ̀ bụ m ka unu chụụrụ aja ahụ?
43
É,è, obi unu dịrịị nꞌarụsị unu. Unu na-eche ihe banyere Molok na Refan, bụ chi kpakpando. Echiche unu dị na chi ahụ unu kpụrụ. Nꞌihi nke a, aga m esite nꞌala a wezụga unu, burukwa unu gafee obodo Babilọn.’
44
“Mgbe nna nna anyị ha gara ije ha nꞌọzara, ha bu igbe ọgbụgba ndụ. Mosisi mere igbe a nꞌụsoro ahụ Chineke gosiri ya.
45
Mgbe ọtụtụ afọ gasịrị, Joshua duuru nna nna anyị ha merie ndị ala Kenan. E butere igbe ọgbụgba ndụ a nꞌala a. Ọ nọgidekwara nꞌala a tutuu ruo nꞌoge Devidi eze Izirel.
46
“Chineke gọziri Devidi nke ukwuu. Nꞌihi ya Devidi rịọrọ Chineke ka o wuore ya ebe a ga-anọ na-efe ya bụ Chineke Jekọb ofufe.
47
Ma ọ bụ Solomọn wuuru Chineke ụlọ a.
48
Otu ọ dị, Chineke, onye kachasị ihe nile elu, adịghị ebi nꞌụlọ e ji aka wuo, dị ka ya onwe ya kwuru site nꞌọnụ ndị amụma ya.
49
Chineke kwuru sị, ‘Eluigwe bụ ebe ocheeze m dị. Ụwa bụkwa ebe izuike nye ụkwụ m. Ụdị ụlọ dị aṅaa ka unu ga-ewu? M ga-ebi nꞌime ya? Ana m achọ ebe m ga-anọ zuo ike?
50
Ọ bụghị m mere eluigwe na ụwa?’
51
“Unu ndị isi ike! Lee ka obi unu si sie ike dị ka nkume. Lee ka ntị unu si kpọchie ịnụkwa eziokwu! Ruo ole mgbe ka unu ga-anọgide na-enupụ isi megide Mmụọ Nsọ? Nna nna unu nupụrụ isi megide ya! Unu onwe unu na-emekwa otu ihe ahụ taa!
52
Kpọọ onye amụma ahụ aha nke nna nna unu na-akpagbughị! Ha gburu ndị ahụ buru amụma banayere ọbịbịa onye ezi omume ahụ, bụ Onye nzọpụta ahụ unu raara nye, onye e gbukwara.
53
Karịsịa, ọ dịbeghị oge unu ji rube isi nꞌiwu Chineke, iwu ahụ mmụọ ozi ya wetaara unu!”
54
Mgbe ndị isi Juu nụrụ ihe ndị a, o wutere mmụọ ha. Ha tara ikikere eze nꞌiwe na nꞌọnụ ma.
55
Ma Stivin, nꞌihi na o jupụtara na Mmụọ Nsọ, lere anya nꞌeluigwe hụ ebube Chineke. Ọ hụkwara Jisọs ka o guzoro nꞌaka nri Chineke.
56
Ọ gwara ndị Juu ahụ okwu sị, “Lee! Ahụrụ m ka eluigwe meghere, hụkwa Jisọs Onye nzọpụta ka o guzo nꞌaka nri Chineke!”
57
Mgbe ha nụrụ okwu a, ha mere ụzụ dị ukwuu, were mkpịsị aka ha rụchie ntị ha. Ha nile biliri ọtọ nꞌiwe, gbara ọsọ gaa nꞌebe Stivin guzo.
58
Ha dọkpụụrụ ya pụọ nꞌazụ obodo ịtụ ya nkume. Ndị akaebe yipụrụ uwe ha chinye ya otu nwokorọbịa nọ nꞌebe ahụ. Aha nwokorọbịa ahụ bụ Sọl.
59
Mgbe ha na-atụ Stivin nkume ahụ, o kpere ekpere sị, “Onyenwe anyị Jisọs, nara mmụọ m.”
60
O gburu ikpere nꞌala kwuo sị, “Onyenwe anyị, biko, agụnyekwarala ha mmehie nke a!” Mgbe o kwusịrị okwu a, ọ dara nꞌala nwụọ.
← Chapter 6
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 8 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28