bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Acts 22
Acts 22
Igbo 1988
← Chapter 21
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 23 →
1
“Ụmụnna m na ndị nna anyị, geenụ m ntị mgbe m na-agọrọ onwe m nꞌihu unu.”
2
Mgbe ha nụrụ na ọ na-agwa ha okwu nꞌasụsụ Hiburu ha deere duu karịa.
3
“Abụ m onye Juu. Amụrụ m na Tasọs nꞌime Silisia. Azụrụ m na Jerusalem nꞌebe a nꞌụkwụ Gamaliel onye nkụzi m. Amụtara m nꞌaka ya usoro ịgbaso iwu anyị dị ka ndị Juu na ịsọpụrụ omenala anyị nꞌụzọ doro anya. Ọ na-anụ m ọkụ nꞌobi dị ka ọ na-anụkwa unu onwe unu taa.
4
Akpagburu m ndị nile na-eso ụzọ ọhụrụ a, na-etinye ha nꞌaka ọnwụ. Ejidere m ndị ikom na ndị inyom ha tụbakwa ha nụlọ mkpọrọ.
5
Ma onyeisi nchụaja na ụfọdụ nꞌime ndị nzukọ anyị nọ nꞌebe a pụrụ ịgba akaebe na okwu m bụ eziokwu. Anatara m nꞌaka ha akwụkwọ e deere ụmụnna anyị na Damaskọs. Nꞌime ya ka e nyere m ike ijide ndị na-eso ụzọ Jisọs na ịkpụta ha Jerusalem maka ịta ha ahụhụ.
6
“Ma mgbe m na-aga nꞌụzọ, nꞌebe dị Damaskọs nso, ìhè si nꞌeluigwe, nke na-enwụ karịa ìhè anyanwụ kpuchigidere m.
7
Adara m nꞌala ma nụkwa olu gwara m okwu sị m, ‘Sọl, Sọl, gịnị mere i ji na-esogbu m?’
8
“ ‘Ònye ka ị bụ Onyenwe m?’ Ka m jụrụ. Olu ahụ zara sị m, ‘Abụ m Jisọs onye Nazaret onye ị na-esogbu.’
9
Ndị mụ na ha so hụkwara ìhè ahụ, ma ha aghọtaghị ihe mere.
10
“Ma etiri m mkpu sị, ‘Gịnị ka m ga-eme Onyenwe anyị?’ Olu ahụ zaghachiri sị m, ‘Bilie banye Damaskọs. Ebe ahụ ka ị ga-amata ihe ị gaje ịhụ nꞌihi aha m.’
11
Enweghị m ike ịhụ ụzọ nꞌihi ìhè ahu chachiri m anya. Ya mere ndị mụ na ha so sekpụụrụ m nꞌaka bata na Damaskọs.
12
“Nꞌebe ahụ ka Ananayas bi, bụ onye anyị pụrụ ịgụ nꞌọnye ezi omume nꞌihi idebe iwu. O nwekwara ọgbụgba ama dị ukwuu site nꞌọnụ ndị Juu bi na Damaskọs.
13
Ọ bụkwa ya bịakwutere m. O guzoro nꞌakụkụ m kwuo okwu sị, ‘Nwanna anyị Sọl, hụụ ụzọ!’ Otu mgbe ahụ enwetara m ike ịhụkwa ụzọ ọzọ.
14
“Mgbe ahụ ka ọ gwara m sị, ‘Chineke nna anyị ha ahọpụtala gị ịmara uche ya na ịhụ Onye nzọpụta ahụ na ịnụ okwu ya.
15
A kpọpụtara gị ka i were okwu ya na-enye ndụ gaa ebe nile, gbaakwa ama banyere ihe ị hụrụ na ihe ị nụrụ.
16
Site ugbu a, atụfukwala mgbe. Gaa ka e mee gị baptizim ka a sachaakwa gị site na mmehie ka ị kpọkuokwa aha Onyenwe anyị.’
17
“Alọghachikwara m na Jerusalem. Ma mgbe m nọ na-ekpe ekpere nꞌụlọ nsọ ukwu ahụ otu ụbọchị ahụrụ Onyenwe anyị nꞌime ọhụ. Ọ gwara m sị,
18
‘Mee ngwa! Hapụ Jerusalem, nꞌihi na ndị bi nꞌala a agaghị anara ọgbụgba ama gị banyere okwu m.’
19
“Ma asịrị m ya, ‘Onyenwe anyị, ha matakwara nke ọma na m tụru ndị na-eso ụzọ Jisọs mkpọrọ, tiekwa ndị kweere nꞌaha gị ihe otiti nꞌụlọ nzukọ ha nile.
20
Nꞌoge e gburu onye ama gị bụ Stivin, eguzogidere m na-ekwe nꞌisi na ihe e mere dị mma, nꞌihi na ọ bụ m chịkọtara uwe ndị tụrụ ya nkume.’
21
“Ma Onyenwe anyị gwara m sị, ‘Hapụ Jerusalem! Nꞌihi na aga m ezipụ gị ebe dị anya ijekwuru ndị mba ọzọ!’ ”
22
Igwe mmadụ ahụ ṅara ntị ruo mgbe Pọl kwuru okwu a. Mgbe ahụ ha nile tiri mkpu nꞌotu olu sị, “Wepụ ya! Tigbuo ya! O kwesịghị ka onye dị otu a dịrị ndụ!”
23
Ha tiri mkpu akwa, na-atụli uwe mgbokwasị ha elu, na-achịlikwa aja nꞌala na-efesasị ya ebe nile igosi na iwe dị ukwuu na-ewe ha.
24
Ọchịagha ahụ kpọbatara Pọl nꞌụlọ nye iwu ka a pịa ya ụtarị, ka eziokwu pụta ya nꞌọnụ. Ọ chọrọ ịmata ihe mere igwe mmadụ a ji nwee obi ụfụ nꞌebe ọ nọ.
25
Ma mgbe ha na-eke Pọl agbụ ịpịa ya ụtarị, Pọl jụrụ onye agha guzo ya nso ajụjụ sị, “Ọ bụ ihe ziri ezi na unu ga-eti nwa diala Rom ihe na-ekpeghị ya ikpe?”
26
Mgbe onye agha a nụrụ okwu a o jekwuuru ọchịagha jụọ ya sị, “Gịnị ka ị na-achọ ime? Onye a bụ onye Rom!”
27
Ọchịagha a mere ngwangwa bịakwute Pọl jụọ ya sị, “Gwa m, ị bụ onye Rom?” Pọl zara ya sị, “Ee, agụgọ adịghị ya.”
28
“Abụkwa m,” ka ọchịagha kwuru, “ma o furu m ego dị ukwuu ịbụ onye Rom!” Pọl zara ya sị, “Abụ m nwa diala!”
29
Ndị agha ahụ chọrọ ịpịa ya ihe mere ngwangwa gbapụ mgbe ha nụrụ na Pọl bụ nwa diala Rom. Egwu tụkwara ọchịagha nꞌonwe ya nꞌihi na ọ bụ ya nyere iwu ka e kee ya eriri.
30
Nꞌechi ya, ebe ọchịagha ahụ chọrọ ịmata ihe bụ ebubo ndị Juu na-ebo Pọl, o nyere iwu ka ndị isi nchụaja na ndị ụlọ ikpe ha zukọọ. Mgbe ahụ ọ tọpụrụ agbụ e kere Pọl, duru ya gaa nꞌihu ha.
← Chapter 21
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 23 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28