bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Acts 2
Acts 2
Igbo 1988
← Chapter 1
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 3 →
1
Nꞌụbọchị mmemme owuwe ihe ubu, nke bụ Pentikọọsụ, ndị na-eso ụzọ Kraịst nile zukọrọ nꞌotu ebe.
2
Na mberede, ha nụrụ ụzụ si nꞌeluigwe. Ụzụ a dị nꞌụdị ifufe dị ike. Ụzụ ahụ jupụtara nꞌụlọ ahụ ha nọ.
3
Ndị na-eso ụzọ Kraịst hụrụ ihe yiri ire ọkụ. Ire ọkụ ndị a nọkwasịrị nꞌisi ha nile nꞌotu nꞌotu.
4
E mekwara ka ha jupụta na Mmụọ Nsọ, malite ịsụ asụsụ dị iche iche. Onye ọ bụla sụrụ asụsụ ọ bụla Mmụọ Nsọ nyere ya ike ịsụ.
5
Nꞌoge ahụ, ụfọdụ ndị Juu ji obi ọcha na-efe Chineke nọ na Jerusalem. Ha si na mba dị iche iche bịa Jerusalem.
6
Mgbe ha nụrụ ụzụ ahụ, ha nile gbakọtara. Ihe ha hụrụ juru ha anya! Nꞌihi na ha nụrụ ka ndị na-eso ụzọ Kraịst na-asụ asụsụ nke onye ọ bụla nꞌime ha na-aghọta. Ndị si ebe dị iche iche bịa, nụrụ ka ndị a na-ekwu okwu nꞌasụsụ nke ha.
7
Ihe ndị a juru ha anya. Ha jụrịtara onwe ha sị, “Ndị a ha esighị Galili?
8
Gịnị mere o ji bụrụ na anyị na-anụ okwu ha nꞌasụsụ anyị dị iche iche?
9
Anyị na-anụ ka ha na-asụ asụsụ ndị Patia, na nke ndị Mid, na nke ndị Elam, na nke ndị Mesopotamia, na nke ndị Judia, na nke ndị Kapadosia, na nke ndị Pọntus, na nke ndị Esia,
10
na nke ndị Frigia, na nke ndị Pamfilia, na nke ndị Ijipti, na asụsụ mba dị gburugburu Libiya, na nke ndị Sirini. Anyị ndị ọbịa site na Rom, ndị Juu na ndị na-abụghị ndị Juu,
11
ndị Krit, na ndị si Arebia, lee, anyị na-anụ okwu ha na-ekwu banyere ọrụ ebube Chineke na-arụ.”
12
O juru ha anya, gbaakwa ha gharịị. Ha sịrịtara onwe ha, “Gịnị ka nke a bụkwa?”
13
Ma ụfọdụ ndị ọzọ nọ na-achị ha ọchị na-asị, “Ndị a bụ ndị mmanya na-egbu.”
14
Ma Pita guzoro ọtọ nꞌoge ahụ. Ndị ozi iri na otu fọdụrụ guzokwara nꞌakụkụ ya. Nꞌoke olu Pita gwara igwe mmadụ ahụ nile okwu sị, “Ndị Judia! na unu ndị bi na Jerusalem, geenụ ntị ka m kọwaara unu ihe ndị a. Geekwanụ ntị nꞌokwu m chọrọ ikwu!
15
Anyị abụghị ndị mmanya na-egbu dị ka ụfọdụ nꞌetiti unu kwuru. Lee, ọ bụ nanị elekere toolu nke ụtụtụ na-akụ!
16
Kama ihe unu ji anya unu hụ taa bụ mmezu amụma ahụ Joel onye amụma buru nꞌoge ya.
17
Nꞌihi na Joel buru amụma sị, ‘Nꞌoge ikpeazụ, nke a bụ ihe na-aghaghị ime, dị ka Onyenwe anyị kwuru. Aga m awụkwasị mmadụ nile Mmụọ m. Nꞌoge ahụ ụmụ unu ndị ikom na ụmụ unu ndị inyom ga-ebu amụma. Ndị okorọbịa unu ga-ahụ ọhụ. Ndị okenye nꞌetiti unu ga-arọkwa nrọ.
18
Ndị bụ ohu nꞌetiti unu, nwoke ha na nwanyị nꞌime ha, ka m ga-awụkwasị Mmụọ m. Ha ga-ebukwa amụma.
19
A ga-eme ka ihe ịtụnanya dị iche nke anya unu ga-ahụ mee na mbara eluigwe. Aga m arụkwa ọrụ ebube nꞌụwa. Unu ga-ahụ ọbara na ọkụ, na anwụrụ ọkụ bara ụba, dị ka igwe ojii.
20
Nꞌụbọchị ahụ, anwụ agaghị enyekwa ìhè, kama ọ ga-aghọ ọchịchịrị. Ọnwa ga-adịkwa ka ọbara. Ihe ndị a nile ga-emezu tupuu o ruo ụbọchị ọbịbịa Onyenwe anyị.
21
Nꞌoge ahụ, ọ ga-abụkwa, na onye ọ bụla ga-akpọku aha Onyenwe anyị, ka a ga-azọpụta!’
22
“Ndị Izirel, geenụ ntị nꞌokwu m chọrọ ikwu. Jisọs onye Nazaret bụ nwoke Chineke gosiri unu na ọ bụ ya zitere ya. Chineke gosiri nke a site nꞌọrụ ebube nile Chineke rụrụ nꞌetiti unu site nꞌaka ya. Unu maara na nke a bụ eziokwu.
23
Ma ya ka e weere nye, site nꞌizu Chineke bururị ụzọ tụọ atụmatụ ya, dị ka Chineke siri mata na mbụ na a ga-arara ya nye. Ọ bụ ya ka unu kpọgidere nꞌobe site nꞌinye aka ndị na-amaghị Chineke.
24
Ma Chineke emeela ka ọ dịkwa ndụ ọzọ! Chineke tọpụrụ ya site nꞌagbụ nke ọnwụ, nꞌihi na ọ bụ ihe rara ahụ na ọnwụ ga-emeri ya.
25
“Devidi kwuru okwu a banyere Jisọs, ‘Ana m ahụ Onyenwe anyị ka ọ na-anọgidekwa nꞌihu m. Ọ nọkwa nꞌaka nri m. Obi m agaghị emekwa mkpatụ.
26
Nꞌihi nke a ọṅụ jupụtara m obi. Ire m na-agbakwa ama banyere obi ụtọ m. Nꞌihi na amaara m na anụ ahụ m agaghị anọgide na-enweghị olileanya.
27
Ị gaghị ahapụ mkpụrụ obi m nꞌala mmụọ. Ị gakwaghị ahapụ anụ ahụ nke onye gị dị nsọ ka o ree ure.
28
I gosila m ụzọ nke ndụ. I meekwala ka ọṅụ m gbaa ụfụfụ dị ka ụfụfụ mmanya dị ike, nꞌihi na anọ m nꞌihu gị.’
29
“Ụmụnna m, cheenụ echiche banyere nna nna anyị Devidi. Unu maara na ọ nwụrụ, e lie ya. Ebe e liri ya ka anyị nile mazuru taa.
30
Ma Devidi kwuru okwu ndị a dị ka onye amụma. Ọ maara na Chineke kwere ya nkwa na ọ ga-eme ka otu nꞌime ụmụ ya nọkwasị nꞌocheeze ya.
31
Ya mere Chineke jiri mee ka Devidi mata ihe ga-eme nꞌoge dị nꞌihu. Devidi hụrụ, kwuokwa okwu banyere mbilite nꞌọnwụ nke Kraịst. Ọ hụrụ na a hapụghị mkpụrụ obi Kraịst nꞌala mmụọ. Ọ hụkwara na anụ ahụ ya erekwaghị ure.
32
Ọ bụ Jisọs a, nke Devidi buru amụma banyere ya, ka Chineke kpọlitere site nꞌọnwụ! Anyị nile bụkwa ndị akaebe mbilite nꞌọnwụ ya.
33
“Ugbu a, e buliela Jisọs elu. Ọ nọdụrụ nꞌakụkụ Chineke nꞌocheeze ya nꞌeluigwe. Ọ natala nkwa nke Mmụọ Nsọ, site nꞌaka Chineke. Ugbu a ọ na-awụsịkwa ike Mmụọ Nsọ ahụ. Unu onwe unu bụkwa ndị akaebe na nke a bụ eziokwu.
34
“Ọ dịghị oge Devidi jiri rigoro gaa nꞌeluigwe. Ma ya onwe ya sịrị, ‘Chineke gwara Onyenwe m, nọdụ nꞌebe a nꞌaka nri m,
35
tutuu ruo mgbe m mere ka ndị iro gị bụrụ ihe ịtụkwasị ụkwụ nye gị.’
36
“Ya mere, ana m eme ka ndị Izirel nile mara nke ọma, na Chineke emeela Jisọs onye unu kpọgidere nꞌobe ka ọ bụrụ Onyenwe anyị na Onye nzọpụta!”
37
Mgbe ndị mmadụ nụrụ ihe ndị a Pita kwuru, akọnuche ha mara ha ikpe. Ha jụrụ Pita na ndị ozi iri na otu ahụ ajụjụ sị, “Ụmụnna, gịnị ka anyị ga-eme?”
38
Ma Pita sịrị ha, “Chegharịanụ! Sitekwanụ na mmehie unu tụgharịa bịakwute Chineke! Ka e mee unu baptizim baa nꞌaha Jisọs, nꞌihi mgbaghara mmehie unu. Unu mee nke a, unu ga-anata onyinye a, bụ Mmụọ Nsọ.
39
Nꞌihi na Chineke kwere unu nkwa a, unu na ụmụ ụmụ unu. Nkwa a dịkwara mmadụ nile nꞌebe nile. Ọ dịrị onye ọ bụla Onyenwe anyị Chineke ga-akpọ ka ọ bịakwute ya!”
40
Pita gwara ndị mmadụ ahụ okwu nꞌụzọ dị iche iche. Ọ gwara ha ihe ọzọ banyere Kraịst, rịọ ha na-asị, “Sitenụ nꞌetiti ndị ọjọọ jupụtara nꞌala a zọpụta onwe unu!”
41
Ndị nile nabatara okwu Pita sitere nꞌọgbakọ ahụ pụta. E mere ha baptizim. Nꞌụbọchị ahụ, ihe ruru puku mmadụ atọ nabatara Kraịst. Ha dịnyeere ndị kwere ekwe.
42
Ha jiri oge nile ha nwere na-anụ ihe ndị ozi Kraịst na-ezi ha. Ha kenyere ndị ọzọ ihe ha nwere.
43
Ha nile jupụtara nꞌegwu nꞌihi na Chineke mere ka ha mata na ọ nọ nꞌetiti ha. Nꞌihi na ndị ozi Kraịst rụrụ ọrụ ebube dị iche iche.
44
Ndị nile kwere ekwe zukọtara mgbe nile na-enwekọ ihe nile ọnụ. Mmadụ ọ bụla agụghị ihe ọ bụla dị ka nke aka ya nanị.
45
Ha rere ihe ha nwere, kee ego ọ bụla ha retara ka o ruo onye ọ bụla, dị ka o siri na-akpa ya.
46
Ụbọchị nile, ha na-ezukọ nꞌụlọ nsọ ukwu Chineke ikpe ekpere. Ha na-ezukọkwa nꞌụlọ ndị kwere ekwe dị iche iche, mmadụ ole na ole, iri oriri nsọ. Ha jiri ọṅụ na-eri nri ha, site nꞌobi ekele.
47
Ha nọgidere ito Chineke. Chineke mekwara ka udo dị nꞌetiti ha na ndị bị na Jerusalem. Chineke mekwara ka ọtụtụ mmadụ bụrụ ndị a na-azọpụta. Ndị a a zọpụtara na-ejikọ onwe ha nꞌọgbakọ ndị nile kwere ekwe.
← Chapter 1
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 3 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28