bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Acts 3
Acts 3
Igbo 1988
← Chapter 2
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 4 →
1
Nꞌotu ụbọchị, Pita na Jọn gara nꞌụlọ nsọ ukwu Chineke ikpe ekpere. Ihe a mere nꞌelekere atọ nke ehihie.
2
Mgbe ha ruru ọnụ ụzọ e si abanye, ha hụrụ otu nwoke e butere dote nꞌọnụ ụlọ nsọ ahụ. Nwoke a dara ngwụrọ. A mụkwara ya nꞌọnọdụ ngwụrọ, site nꞌafọ nne ya. Oge nile ka a na-ebute ya dote ya nꞌọnụ ụzụ ahụ, ka ọ na-arịọ arịrịo. Aha ọnụ ụzọ a, ebe e dotere ya bụ Ọnụ ụzọ ọma.
3
Mgbe onye ngwụrọ a hụrụ Pita na Jọn, o bidoro ịrịọ ha arịrịọ.
4
Ma Pita na Jọn legidere ya anya. Mgbe ahụ Pita sịrị ya, “Lee anyị anya!”
5
Nwoke ahụ letre anya. Ọ na-ele anya na ha ga-enye ya onyinye.
6
Ma Pita sịrị ya, “Enweghị ọlaọcha ma ọ bụ ọlaedo m ga-enye gị. Ma aga m enye gị ihe m nwere. Site nꞌaha Jisọs Kraịst onye Nazaret bilie ọtọ gaa ije!”
7
Mgbe ahụ Pita jidere ya nꞌaka dọlie ya elu. Nọtu mgbe ahụ, ụkwụ onye ngwụrọ ahụ gbasikwara ike ọzọ.
8
Ọ wụliri ọtọ, bido ịga ije! O sooro Pita na Jọn baa nꞌụlọ nsọ ukwu ahụ. Ọ na-aga, ọ na-awụli elu, na-eto Chineke.
9
Ndị nile nọ nꞌebe ahụ hụrụ nwoke ahụ ka ọ na-agagharị na-eto Chineke.
10
Ha ghọtara na ọ bụ onye ngwụrọ ahụ, nke na-arịọ arịrịọ nꞌọnụ ụzọ ụlọ nsọ ukwu Chineke. O juru ha anya ịhụ ya ka ọ na-aga ije ọzọ.
11
Ma dị ka nwoke ahụ siri jide Pita na Jọn aka, ndị mmadụ gbara ha gburugburu, nꞌakụkụ ụlọ nsọ ahụ a na-akpọ Mgbe ụlọ Solomọn. O juru ha anya nke ukwuu.
12
Mgbe Pita hụrụ ọtụtụ mmadụ ka ha gbara ya gburugburu, ọ gwara ha okwu sị, “Ndị Izirel, gịnị mere ọnọdụ nwoke a ji na-eju unu anya? Unu na-ele anyị anya dị ka ọ bụ anyị onwe anyị mere ka nwoke a gaa ije site nꞌike anyị na ịdị nsọ anyị.
13
Chineke nke Eberaham, na Aịzik na Jekọb, Chineke nna nna anyị ha, asọpụrụla onyeozi ya Jisọs. Ọ bụ Jisọs ahụ unu nyefere ka e kpee ya ikpe. Jisọs ahụ unu jụrụ nꞌihu Pailet mgbe Pailet kpebiri ịhapụ ya ka ọ laa!
14
Ma unu gọnarịrị onye dị nsọ na onye ezi omume ahụ. Unu rịọrọ Pailet ka ọ hapụrụ unu ogbu mmadụ kama Jisọs.
15
Ma unu gburu Jisọs bụ Onyenwe anyị na Onye na-enye ndụ. Ma Chineke akpọlitela ya site nꞌọnwụ. Anyị na-gbakwa ama na o biliri nꞌọnwụ nꞌezie!
16
Ọ bụ okwukwe nwoke a nwere nꞌaha Jisọs ka e ji mee ka ọ dịkwa ike ọzọ. Unu nile na-ahụ ya. Unu makwaara ya. Ee! Okwukwe ya mere ka ahụ dị ya mma, dị ka unu ji anya unu na-ahụ!
17
“Ugbu a ụmụnna m, amaara m na unu jụrụ Jisọs site na-amaghị ama. Amakwaara m na ọ bụ site na-amaghị ama ka ndị isi unu ji jụkwa ya.
18
Otu ọ dị, Chineke esitela nꞌọrụ na omume unu mezuo ihe o kwuru na ọ ghaghị imezu site nꞌọnụ ndị amụma nꞌoge gara aga. Nꞌihi na ndị amụma kwuru na Kraịst ga-ahụ ahụhụ.
19
“Chegharịanụ ugbu a, lọghachikwutenụ Chineke! Ọ ga-ehichapụ mmehie unu.
20
Onyenwe anyị ga-emekwa ka agbamume nke ime mmụọ rute unu aka. Ọ ga-ezitekwara unu Jisọs Onye nzọpụta ahụ unu na-ele anya ya.
21
Onye nọ nꞌeluigwe ugbu a. Ebe ahụ ka ọ ga-anọgide tutuu e dozie ihe nile. Nꞌihi na otu a ka Chineke kwuru site nꞌọnụ ndị amụma ya na mgbe ochie.
22
Mosisi nꞌonwe ya kwuru nꞌoge nke ya sị, ‘Onyenwe anyị Chineke unu ga-eme ka onye amụma ọzọ bilie site nꞌetiti unu. Chineke ga-ahọpụta ya dị ka o si họpụta m. Ọ bụ onye ahụ ka unu ga-ege ntị ime ihe ọ bụla ọ gwara unu.
23
Onye ọ bụla jụrụ ige onye amụma ahụ ntị ka a ga-ala nꞌiyi, site nꞌetiti ndị mmadụ.’
24
“Ee, ndị amụma nile site na Samuel, na ndị nile bịara nꞌazụ ya, ndị ziri ụmụ Izirel ihe, kwuru okwu banyere ihe ndị a.
25
Unu bụ ndị ketara ozi ndị amụma. Unu ketakwara ọgbụgba ndụ nna nna unu ha na Chineke gbara. Nꞌihi na Chineke gwara Eberaham sị, ‘Site nꞌotu nwa gị ka a ga-agọzi mba nile nke ụwa.’
26
Ọ bụ unu ka Chineke buru ụzọ zitere Okpara ya Jisọs ka ọ gọzie, mgbe o sitere nꞌọnwụ kpọlite ya. Ka o mee ka onye ọ bụla site na mmehie ya tụgharịa.”
← Chapter 2
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 4 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28