bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Acts 10
Acts 10
Igbo 1988
← Chapter 9
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 11 →
1
Nꞌoge ahụ, o nwere otu nwoke bi na Sizaria, aha ya bụ Kọniliọs. Ọ bụ ọchịagha na-elekọta ndị agha si na mpaghara Itali.
2
Nwoke a ji obi ya nile na-efe Chineke, ya na ezinụlọ ya. Ọ na-enyekwara ụfọdụ ndị Juu mkpa na-akpa aka. Ọ bụkwa mmadụ na-ekpe ekpere.
3
Otụ ụbọchị, nꞌihe dị ka elekere atọ nke ehihie, ọ hụrụ ọhụ. Nꞌime ọhụ ahụ, ọ hụrụ mmụọ ozi Chineke ka ọ bịakwutere ya, kpọọ ya sị, “Kọniliọs!”
4
Ụjọ tụrụ Kọniliọs. O legidere mmụọ ozi ahụ anya jụọ ya sị, “Onyenwe anyị, ọ̀ bụ gịnị ka ị na-achọ?” Mmụọ ozi ahụ zara sị, “Chineke anụla ekpere gị. Ọ hụkwala, ma cheta ọrụ ọma gị nile.
5
Ugbu a zie ndị ozi ka ha gaa nꞌobodo Jopa. Ka ha chọpụta otu nwoke aha ya bụ Saimọn Pita, gwa ya ka ọ bịakwute gị.
6
Saimọn Pita bụ ọbịa nꞌụlọ otu nwoke a na-akpọ Saimọn, onye na-edozi akpụkpọ anụ. Ụlọ Saimọn dị nso nꞌakụkụ osimiri.”
7
Mgbe mmụọ ozi ahụ lara, Kọniliọs kpọrọ mmadụ abụọ nꞌime ndị na-ejere ya ozi nꞌụlọ ya. Ọ kpọkwara otu nꞌime ndị agha na-eche ya nche. Onye agha a bụkwa onye na-atụ egwu Chineke.
8
Kọniliọs kọọrọ ha ihe nile mmụọ ozi ahụ kwuru. Emesịa o zigara ha Jopa.
9
Nꞌụbọchị nke abụọ ya, mgbe ndị ozi Kọniliọs nọ nso nꞌebe na-adịghị anya site na Jopa, ebe ha na-aga, Pita rigooro nꞌelu ụlọ ahụ ikpe ekpere. Oge ahụ bụ ihe dị ka elekere iri na abụọ nke ehihie.
10
Mgbe Pita nọ na-ekpe ekpere, agụụ bidoro ịgụ ya. Ọ chọrọ ihe ọ ga-eri. Ma nꞌụlọ ahụ, a na-akwado ihe oriri nꞌoge ahụ. Nꞌoge Pita nọ na-eche ka e sichaa nri, ọ hụrụ ọhụ.
11
Ọ hụrụ ka eluigwe meghere, hụkwa efere buru ibu ka o sitere nꞌeluigwe na-arịdata nꞌebe ọ nọ.
12
Nꞌime efere a, anụmanụ dị iche iche dị ya, dị ka agwọ na nnụnụ. Ha bụ anụmanụ ndị Juu na-asọ nsọ iri.
13
Ma Pita nụrụ olu gwara ya okwu sị, “Bilie Pita! Bilie! Gbuo, ka i riekwa nke ọ bụla ị chọrọ.”
14
Ma Pita zara sị, “É, e, Onyenwe anyị, ọ dịbeghị oge m riri ihe ọ bụla a na-asọ nsọ dị ka iwu ndị Juu si dị.”
15
Olu ahụ gwara Pita okwu ọzọ sị, “Ihe ahụ Chineke gụrụ nꞌihe dị ọcha, dị ọcha. Asịkwala na ihe dị otu a adịghị ọcha.”
16
E mere ka Pita hụ ọhụ ahụ ugboro atọ. Ma mgbe nke a gasịrị, a napụrụ efere ahụ site nꞌebe ọ nọ, weghachikwa ya nꞌeluigwe.
17
Ma o juru Pita anya nke ukwuu ihe ọhụ ahụ pụtara. Ọ malitekwara iche echiche ihe ọ ga-eme banyere ya. Ma mgbe ọ na-atule ihe ndị a nꞌobi ya, lee, ndị ozi ahụ Kọniliọs zipụrụ abịarutela. Ha guzokwa nꞌọnụ ụzọ ụlọ ahụ ebe Pita nọ.
18
Ha malitekwara ịjụ ajụjụ sị, “Ọ̀ dị onye ọbịa nọ nꞌụlọ a a na-akpọ Pita?”
19
Ma Pita nọ rị na-atụgharị uche nꞌihe ọhụ ahụ ọ hụrụ ga-abụ. Nꞌoge a, Mmụọ Nsọ gwara Pita okwu sị, “Lee, mmadụ atọ guzo nꞌọnụ ụzọ ugbu a. Ha chọkwara ịhụ gị.
20
Jekwuru ha ngwangwa, sorokwa ha gaa ebe ọ bụla ha na-aga. Atụkwala egwu. Ọ bụ m zitere ha.”
21
Saimọn Pita biliri jekwuru ha, gwa ha okwu sị, “Mụ onwe m bụ Pita onye unu na-achọ, gịnị ka unu na-achọrọ m?”
22
Ha zara sị ya, “Ọ bụ Kọniliọs onyeisi agha anyị zitere anyị. Nwoke a bụ ezi mmadụ, bụrụkwa onye na-atụ egwu Chineke. Ọ bụkwa onye ndị Juu nile na-asọpụrụ. Otu ụbọchị, mmụọ ozi bịakwutere ya, gwa ya ka o zie ozi kpọọ Pita ka ọ bịakwute ya. Na Pita bụ onye ga-eme ka Kọniliọs mata ihe nile Chineke chọrọ ka o mee.”
23
Saimọn Pita kpọbatara ha nꞌụlọ. Nꞌebe ahụ ka ha dinara nꞌabalị ahụ. Nꞌechi ya, Pita sooro ha gaa. Ọtụtụ ndị kwere ekwe sokwaara ya gaa, site nꞌobodo ahụ a na-akpọ Jopa.
24
Nꞌụbọchị nke ọzọ ya, ha bịaruru Sizaria ebe Kọniliọs nọ rị, ya na ndị ezinụlọ ya, na ndị enyi ya, na-eche ọbịbịa Pita.
25
Mgbe Kọniliọs hụrụ Pita, ọ gbaara ọsọ jekwuru ya, daa nꞌala nꞌihu ya, ịkpọ isi ala nye ya.
26
Ma Saimọn Pita selitere ya elu sị ya, “Bilie! Abụ m mmadụ efu dị ka gị. Abụghị m Chineke!”
27
Kọniliọs bilitere, ya na Pita kparịtara ụka nwa oge nta. Emesịa ha banyere nꞌụlọ jekwuru ndị zukọtara na-eche ha.
28
Saimọn Pita gwara ndị nọ nꞌụlọ ahụ okwu sị, “Unu maara nke ọma na o megidere omenala ndị Juu na m ga-abata nꞌụlọ Kọniliọs. Ma Chineke gosiri m site nꞌọhụ, na o kwesịghị ka m leda mmadụ ibe m ọ bụla anya, ma ọ bụ gụọ onwe m dị ka onye karịrị ndị ọzọ mma.
29
Ọ bụ nꞌihi nke a ka m jiri bịakwute unu. Ugbu a, ọ̀ bụ gịnị mere unu ji zie ozi ka a kpọọ m?”
30
Kọniliọs sịrị ya, “Nꞌụbọchị anọ gara aga, mgbe m nọ na-ekpe ekpere nꞌoge ehihie, nꞌihe dị ka elekere atọ, na mberede, ahụrụ m otu nwoke ka o guzoro nꞌihu m. O yikwasịrị onwe ya uwe dị ọcha, nke na-egbukwa amụma.
31
“Nwoke a gwara m okwu sị, ‘Kọniliọs, Chineke anụla ekpere gị. Ọ hụkwala ọrụ ọma gị nile.
32
Ugbu a ziga ndị ozi gị ka ha gaa nꞌobodo Jopa, nꞌụlọ otu nwoke a na-akpọ Saimọn, onye na-edozi akpụkpọ anụ. Nꞌebe ahụ ha ga-ahụkwa otu onye aha ya bụ Saimọn Pita.’
33
Ọ bụkwa nꞌihi nke a ka m jiri zite ndị ozi m. Obi tọrọ m ụtọ nke ukwuu na ị bịara. Anyị nile ezukọtaala ugbu a nꞌihu Chineke ịnụrụ ihe Chineke chọrọ ka anyị mata site nꞌọnụ gị. Ọ bụkwa nke a ka anyị nile chọrọ ịnụ ugbu a.”
34
Mgbe ahụ Saimọn Pita zara ha sị, “Nꞌezie, amaara m ugbu a na ọ bụghị nanị ndị Juu ka Chineke na-anabata.
35
Kama nꞌime obodo ọ bụla, ndị ọ bụla na-akpọ isi ala nye ya, na ndị na-arụ ọrụ ezi omume ka ọ na-anabata.
36
Ana m eche na unu anụla ihe banyere ozi ọma ahụ Chineke zigaara ndị Juu. Ozi ọma nke na-asị na udo dị ugbu a nꞌetiti Chineke na mmadụ site nanị na Jisọs, Onye nzọpụta na Onyenwe ihe nile.
37
E mekwara ka ozi ọma a gbasaa ruo obodo Juda nile. Ọ malitekwara nꞌoge Jọn omee baptizim bidoro ọrụ ya na Galili.
38
Ana m echekwa na unu nile maara ihe banyere Jisọs onye Nazaret, Onye Chineke mejupụtara nꞌike Mmụọ Nsọ. O jegharịrị nꞌebe nile dị iche iche na-arụ ọrụ ebere, chụpụkwa mmụọ ọjọọ, nꞌihi na Chineke nọnyeere ya.
39
“Anyị onwe anyị bụkwa ndị akaebe ihe ndị a nile. Anyị hụzukwara ọrụ nile ọ rụrụ nꞌala Izirel nile na nꞌime Jerusalem ebe a nọ kpọgide ya nꞌelu obe.
40
Ma Chineke mere ka o si nꞌọnwụ bilite mgbe ụbọchị atọ gasịrị. E mekwara ka ọtụtụ mmadụ hụ ya anya.
41
Kama ọ bụghị mmadụ nile hụrụ ya. Ọ bụ anyị ndị Chineke họpụtara hụrụ ya. Anyị sokwa ya rikọọ nri, sorokwa ya ṅụkọọkwa ihe ọṅụṅụ mgbe o si nꞌọnwụ bilie.
42
Ọ bụkwa anyị ka o zipụrụ ka anyị gaa zisaa ozi ọma nꞌebe nile. O ziri anyị ka anyị mee ka onye ọ bụla mata na Jisọs bụ onye ahụ Chineke họpụtara ka ọ bụrụ onye ga-ekpe ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ ikpe.
43
Ndị amụma nile Chineke zitere nꞌoge gara aga kwuru ihe banyere ya na-asị na onye ọ bụla kweere na ya nwere mgbaghara mmehie site nꞌaha ya.”
44
Mgbe Saimọn Pita nọ na-ekwu okwu ndị a, Mmụọ Nsọ bịakwasịrị ndị nile na-ege ntị nꞌokwu ya.
45
Nke a juru ndị Juu ahụ sooro Pita bịa anya. Ọ gbakwara ha gharịị nke ukwuu otu Chineke si mee ka ndị mba ọzọ nata onyinye Mmụọ Nsọ ahụ.
46
Nꞌihi na nke a pụtara ìhè nye mmadụ nile nọ nꞌebe ahụ. Ha nile nụkwara ka Kọniliọs na ndị nọ nꞌụlọ ahụ bidoro na-ekwu okwu nꞌasụsụ dị iche iche na-eto Chineke. Mgbe ahụ kwa, Pita jụrụ ajụjụ sị,
47
“Gịnị ọzọ dị nke ga-egbochi anyị ime ndị a baptizim? Ugbu a ha anatala Mmụọ Nsọ dị ka anyị onwe anyị bụ ndị Juu kwere ekwe si nata ya.”
48
Nꞌihi nke a, Saimọn Pita mere ha baptizim nꞌaha Jisọs Kraịst Onye nzọpụta. Mgbe ihe ndị a gasịrị, Kọniliọs rịọrọ Pita ka o soro ya bikọọ ụbọchị ụfọdụ.
← Chapter 9
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 11 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28