bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Acts 20
Acts 20
Igbo 1988
← Chapter 19
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 21 →
1
Mgbe ọgba aghara ndị a kwụsịrị, Pọl zipụrụ ozi ka a kpọọrọ ya ndị kwere ekwe nile. Mgbe ha bịara, ọ gwara ha okwu ịgba ume ikpeazụ iji kelee ha. Emesịa, ọ hapụrụ gawa Griis.
2
Mgbe ọ na-aga ije ya, ọ na-agba ndị kwere ekwe nile ume, nꞌobodo nile ha gafere tutuu ruo mgbe ha rutere Griis.
3
Ọ nọgidere na Griis ruo ọnwa atọ. Emesịa, mgbe o kpebiri isoro ụgbọ mmiri gaa Siria, ọ chọpụtara izuzu ọjọọ ndị Juu banyere ndụ ya. Ya mere, o kpebiri isite ụzọ ọzọ ka o buru ụzọ rute Masidonia.
4
Sopata onye Boria bụ ọkpara Pirọs, na Aristakọs, na Sekundus ndị si na Tesalonaịka, na Gaiọs onye Debi, na Timoti, na Tikikọs, na Trofimọs, ndị na-alaghachi nꞌụlọ ha na Tọki sokwa ya na-aga ije a.
5
Ebe ha buru anyị ụzọ malite, ha nọrị na-eche anyị mgbe anyị rutere na Troas.
6
Mgbe mmemme ngabiga ahụ gwụsịrị, anyị banyere ụgbọ mmiri rute Filipai nke dị nꞌugwu Griis. Ma mgbe ụbọchị ise gafere, anyị rutere Troas nꞌime Tọki ebe anyị nọdụrụ otu izu ụka.
7
Nꞌabalị mbụ nꞌizu ụka, anyị zukọrọ ife Chineke ofufe na ịnata oriri nsọ. Pọl bụ onye kwuru okwu Chineke nꞌebe a. Ebe ọ na-akwado ịla ma chi bọọ, o kwugidere okwu ruo nꞌetiti abalị.
8
E tinyere ọkụ nꞌọtụtụ oriọna nke nyere ìhè nꞌụlọ ahụ anyị nọ na-ezukọ.
9
Mgbe Pọl kwuru okwu ruo oge dị anya ụra bidoro ịtụ otu nwokorọbịa a na-akpọ Yutikọs. Emesịa, o siri na windo dapụ daa nꞌala. Mgbe ọ daruru ala, ọ bụụrụ onye nwụrụ anwụ.
10
Pọl mere ngwangwa rituo nꞌala selite Yutikọs elu jikụọ ya. Ọ gwara ndị gbakọrọ nꞌebe ahụ sị, “Ka obi hapụ ịlọ unu mmiri ọ dị ndụ.” Nꞌezie, Yutikọs dịkwara ndụ.
11
Ha nie laghachikwara nꞌụlọ elu ahụ ebe ha nọ rikọọ oriri nsọ. Ha kwugidere okwu tutuu chi abọọ mgbe Pọl ji hapụ ha bilie ije ya.
12
Nwokorọbịa ahụ ha kulitere na ndụ mere ka ọṅụ jupụta ha nꞌobi. Ọ gbakwara ha ume nke ukwuu.
13
Anyị banyere nꞌụgbọ mmiri chee ihu ịga Asọs. Ma Pọl esoghị anyị nꞌihi na o zubere iji ụkwụ ruo Asọs, ebe ọ ga-abanye nꞌụgbọ anyị.
14
Ọ bụkwa nꞌAsọs ka o zutere anyị. Emesịa, anyị nile sooro gaa Mitilen.
15
Nꞌụbọchị nke ọzọ ya, anyị rutere Kiọs, nꞌụbọchị nke ọzọ kwa, anyị rutere Samọs. Ma mgbe otu ụbọchị ọzọ gasịrị, anyị rutere Melitọs.
16
Nꞌoge a Pọl kpebiri na ọ gaghị akwụsị nꞌEfesọs nꞌihi na ọ na-eme ngwangwa ka o nwee ike irute Jerusalem nꞌụbọchị mmemme Pentikọọsụ.
17
Ma nꞌoge anyị rutere Melitọs, Pọl zipụrụ ozi ka a kpọọrọ ya ndị okenye chọọchị Efesọs.
18
Oge ha bịaruru, Pọl bidoro ịgwa ha okwu sị, “Unu maara nke ọma na site nꞌụbọchị mbụ ụkwụ m zọkwasịrị nꞌala Tọki tutuu ruo ugbu a,
19
arụrụ m ọrụ Onyenwe anyị site nꞌobi umeala na anya mmiri. Anatakwara m ntaramahụhụ dị ukwuu site nꞌizu ọjọọ ndị Juu nwere maka ịnapụ m ndụ m.
20
Unu matakwara na akwụsịghị m ịgwa unu eziokwu ahụ ga-enyere unu aka nꞌezi ma ọ bụ nꞌụlọ aka unu.
21
Ọ bụ nanị otu ozizi ahụ ka m nyere ndị Juu na ndị mba ọzọ, ozizi mkpa ọ dịrị mmadụ nile ịhapụ mmehie ha ma lọghachikwute Chineke site nꞌokwukwe nꞌime Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.
22
“Ma otu ọ dị, ana m aga Jerusalem dị ka iwu Mmụọ Nsọ nyere m si dị, ma amaghị m ihe ọnọdụ m ga-abụ nꞌebe ahụ.
23
Karịakwa na Mmụọ Nsọ na-ekpughere m nꞌebe ọ bụla na mkpọrọ na ntaramahụhụ na-eche m nꞌebe ahụ.
24
Ma akpọghị m ndụ m ihe ọ bụla karịa na m ji ya arụrụ Onyenwe anyị ọrụ, ọrụ izisa ozi ọma nye ndị ọzọ banyere oke ebere na ịhụnanya Chineke.
25
“Ma ugbu a, amaara m na o nweghị onye ọ bụla nꞌime unu, bụ ndị m jegharịrị nꞌetiti ha na-ezi ihe banyere alaeze a ga-ahụ m anya ọzọ.
26
Ya mere, ana m agwasị unu ike taa na ọ bụrụ na onye ọ bụla efuo nꞌetiti unu agaghị ajụta ọbara ya nꞌaka m.
27
Nꞌihi na esepụghị m aka ikwupụta nzọpụta Chineke nye unu.
28
“Ma ugbu a kpacharanụ anya! Leziekwanụ anya ịzụzi igwe atụru Chineke bụ chọọchị ya, nke Mmụọ Nsọ tinyere nꞌaka unu. Chineke emeela igwe atụrụ ndị a ihe nke aka ya, nꞌihi na o ji ọbara Ọkpara ọ mụrụ nanị ya zụọ ha.
29
Nꞌihi na amaara m na mgbe m si nꞌetiti unu pụọ, ndị ozizi ụgha yiri ọdụm ga-apụta nꞌetiti unu mee ka igwe atụrụ Chineke site nꞌeziokwu kpafuo.
30
“Ụfọdụ nꞌime unu ga-elefu eziokwu ahụ anya ka unu dọtara onwe unu mmadụ.
31
Ya mere, lezienụ anya! Chetakwanụ na nꞌime afọ atọ m nọ nꞌetiti unu, ehihie na abalị, eji m ịkwa akwa na anya mmiri zi unu ihe bụ eziokwu.
32
“Ugbu a ana m etife unu nꞌaka Chineke na nlekọta ya. Ana m etifekwa unu nꞌaka okwu amara ya nke pụrụ ịgba okwukwe unu eme na inyekwa unu akụ na ụba o kwadobeere ndị ahụ ọ họpụtara ka ha dị iche nye onwe ya.
33
“Ọ dịghị mgbe ọ bụla agụụ ịdọtara onwe m akụ na ụba ma ọ bụ uwe nke onye ọ bụla ji gụọ m.
34
Ọ bakwaghị uru ịgwa unu na ọ bụ aka m rụpụtara ọrụ gbooro m mkpa m nile, na nke gbokwara mkpa ndị ahụ mụ na ha so.
35
Nꞌoge ọ bụla, abụkwa m ihe ilere anya nye unu banyere inyere ndị ogbenye aka. Nꞌihi na echetara m okwu ahụ Onyenwe anyị kwuru mgbe ọ sịrị, ‘Ọ̀ dị mma inye enye karịa ịnara anara.’ ”
36
Mgbe Pọl kwusịrị okwu ndị a, o soro ha nile gbuo ikpere nꞌala kpeekwa ekpere.
37
Ha kwara akwa nke ukwuu, jikụọ ya, sutụkwa ya ọnụ mgbe ha na-ekele ya ekele ikpeazụ.
38
O wutere ha karịa na o kwuru na ha agaghị ahụ ya anya ọzọ. Emesịa, ha duuru ya ruo ebe ọ banyere ụgbọ mmiri.
← Chapter 19
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 21 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28