bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Acts 11
Acts 11
Igbo 1988
← Chapter 10
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 12 →
1
Nꞌoge na-adịghị anya okwu a ruru ndị ozi na ụmụ Chineke ndị bi na Juda ntị. Ha nụrụ na ọtụtụ ndị mba ọzọ na-echegharị na-abịakwute Onyenwe anyị.
2
Mgbe Saimọn Pita laghachiri azụ na Jerusalem, ụfọdụ ndị Juu nꞌetiti ndị kwere ekwe malitere ịtamụ ntamụ megide Saimọn Pita.
3
Ha malitere ibo ya ebubo sị na o sooro ndị mba ọzọ na-enwekọ ihe, sorokwa ha na-eri ihe.
4
Ma otu ọ dị, Saimọn Pita kọwaara ha ihe nile mere.
5
Ọ gwara ha sị, “Otu ụbọchị, mgbe m nọ nꞌobodo Jopa, ahụrụ m ọhụ nꞌoge m na-ekpe ekpere. Nꞌime ọhụ a, ahụrụ m ihe yiri efere buru ibu. E budatara ya nꞌihu m. Efere a nwekwara ụkwụ igwe anọ. E sitekwara nꞌeluigwe zidata ya.
6
Nꞌime efere a ụmụ anụ ọhia dị iche iche dị ya. Anụ na-akpụ akpụ, na nnụnụ dị iche iche, nke anyị onwe anyị na-adịghị eri.
7
Mgbe ahụ kwa, anụrụ m olu gwara m okwu sị, ‘Bilie Pita, bilie gbuo anụ ndị a nile, riekwa ha!’
8
“Ma azaghachiri m sị, ‘Onyenwe anyị, ọ dịbeghị mgbe ọ bụla m riri anụ ọ bụla megidere omenala ndị Juu.’
9
“Ma olu ahụ zaghachiri m nke ugbo abụọ sị, ‘Ihe ọ bụla Chineke gụrụ na ọ bụ ihe dị ọcha, gị onwe gị asịkwala na ọ bụ ihe rụrụ arụ.’
10
“Ihe ndị a nile mere ugboro atọ. Emesịa, e wepụrụ efere ahụ ya na ihe nile dị ya nꞌime, weghachi ya nꞌeluigwe.
11
Mgbe ihe ndị a gasịrị, mmadụ atọ ahụ bịara izute m bịaruru nso nꞌụlọ ebe m nọ. Ha sitekwara nꞌobodo Sizaria bịakwute m.
12
Mmụọ Nsọ gwara m okwu sị, ‘Soro ha gaa!’ Ma o mekwara ka m mata nke ọma na o kwesịghị ka o wute m na ha bụ ndị mba ọzọ. Mgbe na-adịghị anya, mụ onwe m na ụmụnna isii ndị a, ndị so m gaa Sizarịa, bịarutere nso nꞌụlọ Kọniliọs onye zipụrụ ndị ozi ahụ.
13
Kọniliọs mere ka anyị mata otu mmụọ ozi siri bịakwute ya gwa ya ka o ziga ndị ozi ya ka ha gaa Jopa. Na ha ga-ahụkwa otu nwoke a na-akpọ Saimọn Pita.
14
Mmụọ ozi ahụ gwakwara ya sị, ‘Pita ga-akọwara gị ihe nile banyere nzọpụta nke gị na nke ndị ezinụlọ gị nile.’
15
“Nꞌihi ihe ndị a nile, mụ onwe m gwara ha ozi ọma Chineke. Mgbe m nọ na-ekwu okwu ahụ, Mmụọ Nsọ bịakwasịrị ha dị ka o siri bịakwasị anyị na mbụ.
16
Mgbe ahụ echetara m okwu ahụ Onyenwe anyị kwuru sị, ‘Nꞌezie Jọn ga-eji mmiri mee unu baptizim, ma mụ onwe m ga-eji Mmụọ Nsọ mee unu baptizim.’
17
Ebe anyị matara na Chineke nꞌonwe ya emeela ka ndị mba ọzọ nata onyinye Mmụọ Nsọ dị ka anyị si nata ya mgbe anyị kweere nꞌOnyenwe anyị Jisọs Kraịst, onye ka m bụ ịrụsị Chineke ụka?”
18
Mgbe mmadụ nile nụrụ nkọwa dị otu a, ha mechiri ọnụ ha nye Chineke otuto sị, “Nꞌezie, Chineke enyela ndị mba ọzọ kweere nꞌOnyenwe anyị Jisọs Kraịst onyinye Mmụọ Nsọ.”
19
Ndị kwere ekwe ahụ nile sitere Jerusalem gbapụ nꞌoge ahụ mkpagbu ahụ bidoro, mgbe a tụgburu Stivin na nkume, gara nꞌihu na-agbasa ozi ọma. Ụfọdụ ha gara Fonisia na Saiprọs na Antiọk. Ma ọ bụ nanị ndị Juu ka ha na-ekwusara ozi ọma ahụ.
20
Otu ọ dị, ụfọdụ zisakwaara ndị Griik ozi ọma. Ụfọdụ ndị a sitere nꞌobodo Saiprọs na Sirini gaa nꞌobodo a na-akpọ Antiọk kwusaa ozi ọma Onyenwe anyị Jisọs.
21
Onyenwe anyị gọziri mgbalị ha nile. Nꞌihi na ọtụtụ mmadụ sitere nꞌetiti ndị mba ọzọ chegharịa kwere nꞌOnyenwe anyị.
22
Mgbe nzukọ dị na Jerusalem nụrụ ihe ndị a, ha zipụrụ Banabas ka ọ gaa nyere ndị ahụ chegharịrị ọhụrụ aka ime ka ha guzosie ike.
23
Mgbe Banabas bịaruru Antiọk, ihe ọ hụrụ juru ya anya nke ukwuu. Ọ ṅụrịrị ọṅụ nꞌihi ihe ọ hụrụ. Ọ gwara ha okwu nkasịobi, meekwa ka ha mata na o kwesịrị ka ha jidesie okwukwe ha ike na-eleghị anya nꞌazụ.
24
Banabas bụ nwoke jupụtara nꞌọrụ ebere na nꞌike Mmụọ Nsọ. O nwekwara okwukwe dị ebube, nꞌihi ya ọtụtụ mmadụ chegharịkwara bịakwute Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.
25
Emesịa, Banabas hapụrụ Antiọk gaa obodo Tasọs ịchọ Sọl. Mgbe ọ chọpụtara ya, o duuru ya bịaghachi nꞌAntiọk. Nꞌebe ahụ ka ha abụọ nọ na-akụziri ndị ahụ chegharịrị ọhụrụ okwu Chineke. Ọ bụkwa nꞌobodo a ka e buru ụzọ kpọọ ndị kwere ekwe ndị Kraịst.
27
Nꞌoge ahụ, ụfọdụ ndị amụma sitere Jerusalem bịaruo Antiọk.
28
Otu nwoke nꞌime ha a na-akpọ Agabus biliri ọtọ nꞌetiti nzukọ ahụ buo amụma site nꞌike Mmụọ Nsọ banyere oke ụnwụ ahụ ga-abịakwasị ụwa nile. Amụma a mezukwara nꞌoge Kladiọs chịrị dị ka eze ndị Rom nile.
29
Nꞌihi nke a, ndị kwere ekwe nọ na nzukọ ahụ kwekọrịtara ịtụkọta na iziga onyinye dị iche iche nye ndị kwere ekwe nọ na Juda. Onye ọ bụla nyekwara ihe dị ka o nwere ike.
30
Ha nile bunyere Banabas na Pọl onyinye ndị a nile ka ha buru gaa Jerusalem nye ndị okenye na nzukọ Kraịst nọ nꞌebe ahụ.
← Chapter 10
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 12 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28