bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Acts 9
Acts 9
Igbo 1988
← Chapter 8
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 10 →
1
Ugbu a, Sọl, onye ume nile ọ na-ekupụta bụ nanị ịba mba na ịla nzukọ Kraịst nꞌiyi, gara hụ onyeisi nchụaja na Jerusalem.
2
Ọ rịọrọ ya ka o nye ya akwụkwọ ozi nke ọ ga-eji jekwuru nzukọ ndị Juu dị na Damaskọs. Akwụkwọ ozi a bụ ka nzukọ ndị a nyere Sọl aka ịkpagbu ndị kwere ekwe ọ bụla ọ chọpụtara nꞌebe ahụ, nwoke na nwanyị, ka o kee ha agbụ, kpụta ha na Jerusalem dị ka ndị mkpọrọ.
3
Mgbe Sọl na-aga nꞌụzọ, ọ bịaruru ebe dị Damaskọs nso. Na mberede, ìhè chakarịrị ìhè nke anyanwụ siri nꞌelu chaa ya gburugburu.
4
Sọl dara nꞌala, nụ olu na-akpọ ya oku sị, “Sọl, Sọl, gịnị mere i ji akpagbu m?”
5
Sọl zara sị, “Onyenwe anyị ị bụ onye?” Olu ahụ zaghachiri sị, “Abụ m Jisọs onye ị na-akpagbu!
6
Bilie, baa nꞌime obodo. Nọdụ nꞌebe ahụ tutuu ruo mgbe ị natara ozi m.”
7
Ndị nwoke ha na Sọl so guzoro nꞌebe ahụ, ma ha enweghị ike ikwu okwu. Ha nụrụ olu ahụ, ma ha ahụghị onye ọ bụla.
8
Sọl biliri ọtọ, chọpụta na ya bụ onye kpuru ìsì. Ndị ya na ha so sekpụụrụ ya nꞌaka tutuu ha abata Damaskọs.
9
Nꞌebe ahụ ka ọ nọrọ abalị atọ, na-ahụghị ụzọ. O rikwaghị nri ọ bụla. Mmiri abakwaghị ya ọnụ.
10
Na Damaskọs ahụ, otu onye kwere ekwe nọ ya. Aha ya bụ Ananayas. Ọ hụrụ ọhụ. Nꞌime ọhụ a, Onyenwe anyị kpọrọ ya oku sị, “Ananayas!” Ọ zara sị, “Anọ m nꞌebe a, Onyenwe anyị.”
11
Onyenwe anyị gwara ya okwu sị, “Bilie, gaa nꞌụzọ ahụ a na-akpọ Ama E Guzoziri, chọọ ụlọ nwoke a na-akpọ Judas. Nꞌụlọ nwoke a jụọ ajụjụ banyere nwoke a na-akpọ Sọl onye Tasọs. Ọ nọ nꞌebe ahụ na-ekpe ekpere.
12
Sọl ahụla ọhụ nke gwara ya na otu nwoke a na-akpọ Ananayas na-abịakwute ya, na ọ ga-ebikwasị aka nꞌisi ya ka ọ hụ ụzọ.”
13
Ma Ananayas zara sị, “Onyenwe anyị, anụla m akụkọ ihe ọjọọ nile nwoke a mere ndị kwere ekwe bi na Jerusalem!
14
Ugbu a, anyị nụrụ na ọ natara ike nꞌaka ndị nchụaja ka ọ bịa nꞌebe a jide onye kwere ekwe ọ bụla nọ na Damaskọs!”
15
Ma Onyenwe anyị gwara ya sị, “Gaa ozi m ziri gị. Nꞌihi na ahọpụtala m Sọl ka o were ozi ọma m gaa mba nile, ma nꞌihu ndị eze, ma nꞌihu ụmụ Izirel.
16
Nꞌihi na aga m egosi ya ụdị ahụhụ ọ na-aghaghị ịhụ nꞌihi m.”
17
Ananayas gara hụ Sọl dị ka Chineke nyere ya iwu. Ọ chọtakwara Sọl, bikwasị ya aka, gwa ya okwu sị ya, “Nwanna m Sọl, Onyenwe anyị Jisọs onye gosiri gị onwe ya nꞌụzọ, zitere m ka ị hụkwa ụzọ ọzọ, ma jupụtakwa na Mmụọ Nsọ.”
18
Otu mgbe ahụ, ihe dị ka akpịrịkpa sitere nꞌanya Sọl abụọ dapụta. O bidokwara ịhụ ụzọ ọzọ. Ananayas mekwara ya baptizim.
19
Emesịa, o rituru nri, nweghachikwa ike ya. Ya na ndị kwere ekwe sooro nọdụ na Damaskọs ụbọchị ụfọdụ.
20
Ọ dịghị anya Sọl bidoro ikwusa Kraịst nꞌụlọ nzukọ ndị Juu. Ọ na-ekwusa na Kraịst bụ Ọkpara Chineke.
21
O juru ndị nile nụrụ okwu ya anya. Nꞌihi ya ha na-asị, “Nwoke a ọ̀ bụghị onye ahụ kpagburu ndị kwere ekwe na Jerusalem? Ọ bịakwaghị Damaskọs ijide ndị nile kwere ekwe, ịkpụgara ha ndị isi nchụaja nọ na Jerusalem?”
22
Ma Sọl akwụsịghị ikwusa ozi ọma! Kama ike ikwusa ozi ọma ya na-aba ụba. Ọ gara nꞌihu imeri ndị Juu site nꞌụzọ o siri gosi ha site nꞌakwụkwọ nsọ na Jisọs bụ Onye nzọpụta ahụ.
23
Mgbe ọtụtụ ụbọchị gasịrị, ndị Juu gbara izu igbu ya.
24
Ma Sọl chọpụtara ihe ha zubere ime. Ehihie na abalị, ndị a nọ na-eche ụzọ nile e si apụ obodo ahụ, ka ha gbuo ya.
25
Ndị kwere ekwe nọ na Damaskọs nyeere Sọl aka ịgbapụ. Nꞌotu abalị, ha tinyere ya nꞌime nkata buru ibu, site nꞌoghere dị na mgbidi obodo ahụ wetuo ya nꞌofe nke ọzọ.
26
Site nꞌebe ahụ, Sọl gbapụrụ gaa Jerusalem. Mgbe o ruru Jerusalem, ọ gbalịri ịdịnyere ndị kwere ekwe nọ nꞌebe ahụ. Ma ha tụrụ egwu. Ha ekwenyeghị na ọ bụrụla onye kwere ekwe dị ka ha onwe ha.
27
Ma Banabas duuru ya gaa nꞌebe ndị ozi nọ. Ọ kọọrọ ha akụkọ otu Sọl siri zute Onyenwe anyị nꞌụzọ Damaskọs. Ọ kọkwara ha akụkọ otu Sọl siri kwusaa ozi ọma Kraịst na Damaskọs na-atụghị egwu.
28
Site nꞌoge ahụ, Sọl nọdụrụ na Jerusalem. Ya na ndị kwere ekwe mekọrịtakwara na-enweghị nsogbu ọ bụla.
29
O kwusara okwu nꞌaha Onyenwe anyị na-atụghị egwu. Ya na ndị Juu na-asụ asụsụ Griik rụrịtara ụka. Nꞌihi ya ndị a gbara izu igbu ya.
30
Mgbe ndị kwere ekwe nụrụ banyere nzube ha, ha mere ngwangwa zipụ Sọl obodo Tasọs.
31
Nꞌihi na Sọl ghọrọ onye kwere ekwe mere ka a kwụsị ịkpagbu ndị kwere ekwe. Nzukọ Kraịst nile, ndị dị na Judia, Galili na Sameria, nọọrọ nꞌudo, guzosiekwa ike nꞌokwukwe ha. Ndị kwere ekwe biri ndụ ịsọpụrụ Chineke site nꞌinyeaka nke Mmụọ Nsọ. Ha gakwara nꞌihu na-amụba.
32
Otu oge, mgbe Pita na-ejegharị site nꞌobodo ruo nꞌobodo, ọ gara ileta ndị kwere ekwe nọ nꞌobodo Lida.
33
Nꞌebe ahụ ọ hụrụ otu nwoke aha ya bụ Ainias. Nwoke a anọọla nꞌute ọrịa afọ asatọ. Ọ bụ onye ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ.
34
Pita bịakwutere nwoke a sị ya, “Ainias, Kraịst agwọọla gị! Bilie mezie ihe ndina gị!” Otu mgbe ahụ Ainias biliri bụrụ onye ahụ dị mma.
35
Ndị nile bi na Lida na Sharọn hụrụ Ainias. Nꞌihi ya ha nabatara Onyenwe anyị.
36
Ma nꞌotu obodo a na-akpọ Jopa, otu nwanyị bi ya. Ọ bụ onye kwere ekwe aha ya bụ Tabita. Ndị mmadụ na-akpọkwa ya Dọkas. Nwanyị a jupụtara nꞌọrụ ọma. Ọ na-enyekwa ndị nọ na mkpa ihe o nwere.
37
Nꞌoge a, nwanyị a rịara ọrịa, nwụọ. Mgbe ha sachara ya ahụ, ha nyibere ya nꞌụlọ dị nꞌelu.
38
Jopa dịkwa nso na Lida. Mgbe ndị kwere ekwe nụrụ na Pita nọ na Lida, ha ziri ozi ka a kpọọ ya. Ụmụ nwoke abụọ gara ịgwa ya sị, “Atufula oge ịbịakwute anyị.”
39
Pita sooro mmadụ abụọ ahụ gaa ngwangwa. Mgbe o ruru Jopa, ha duuru ya gaa nꞌụlọ ebe ha nyibere ozu Dọkas. Ụmụ nwanyị nile di ha nwụrụ nọ nꞌebe ahụ na-akwa akwa. Ha gosiri Pita uwe Dọkas dụụrụ ha mgbe ọ dị ndụ.
40
Pita gwara mmadụ nile ka ha pụọ nꞌụlọ ahụ. O gburu ikpere nꞌala kpee ekpere. Mgbe o kpesịrị, o chere ihu ya nꞌebe ozu nwanyị ahụ dina kwuo okwu sị, “Dọkas, bilie!” Nwanyị ahụ nwụrụ anwụ meghere anya ya. Mgbe ọ hụrụ Pita, o biliri ọtọ, nọdụ ala.
41
Pita nyeere ya aka iguzo ọtọ. Ọ kpọrọ ndị nile kwere ekwe nọ nꞌebe ahụ, ha na ụmụ nwanyị ahụ di ha nwụrụ gosi ha Dọkas onye dị ndụ.
42
Ndị nile nọ na Jopa nụrụ akụkọ a. Ọtụtụ mmadụ nabatara Onyenwe anyị.
43
Mgbe nke a gasịrị, Pita nọgidere na Jopa ọtụtụ ụbọchị. Ọ nọdụrụ nꞌụlọ Saimọn, onye ọrụ ya bụ idozi akpụkpọ anụ.
← Chapter 8
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 10 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28