bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Acts 12
Acts 12
Igbo 1988
← Chapter 11
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 13 →
1
Nꞌoge ahụ, eze Herọd bidoro ịkpagbu ndị nile na-akpọku aha Onyenwe anyị.
2
O nyere iwu ka e gbuo Jemes, otu nꞌime ndị ozi Kraịst. Jemes bụkwa nwanne Jọn.
3
Mgbe Herọd chọpụtara na ọtụtụ ndị isi Juu kwagidere omume ya, o jidekwara Pita nꞌoge mmemme ngabiga,
4
tụba ya nꞌụlọ mkpọrọ, O zipụrụ ndị agha iri na isii ka ha chee ya nche. Ihe Herọd bu nꞌobi bụ ka o nyefee Pita nꞌaka ndị Juu, ka ha gbuo ya mgbe mmemme ngabiga gafere.
5
Ma nzukọ Kraịst ezughị ike site nꞌikpe ekpere nye Chineke. Ha rịọsịrị Chineke arịrịọ ike ka o debe Pita nke ọma nꞌime ụlọ mkpọrọ ahụ.
6
Ma nꞌabalị ahụ na-eso ụbọchị ahụ a ga-egbu ya, Pita, nọ na-arahụ ụra ebe e ji eriri igwe kee ya nꞌụkwụ na aka. E kegidekwara ya nꞌahụ otu onye agha. Ndị nche ọzọ nọkwa ya gburugburu na-eche ya nche.
7
Na mberede, ìhè dị ukwuu nwụrụ nꞌime ụlọ mkpọrọ ahụ. Mmụọ ozi batara guzo nꞌakụkụ Pita metụ ya aka. Pita tetara nꞌụra. Ọ nụrụ ka mmụọ ozi ahụ sịrị ya, “Pita! Bilie ngwangwa!” Nꞌotu oge ahụ, eriri igwe ahụ dapụrụ nꞌala.
8
Mmụọ ozi ahụ gwara Pita okwu sị, “Kee ihe okike nꞌukwu gi, yirikwa akpụkpọ ụkwụ gị.” Pita mere otu ahụ. Mmụọ ozi ahụ sịkwa ya, “Yirikwa uwe ukwu gi, sokwa m nꞌazu.”
9
Pita sooro mmụọ ozi ahụ nꞌazụ site nꞌụlọ mkpọrọ ahụ pụta. Ma Pita chere na ihe ndị a na-eme na nrọ, ma ọ bụ na ọ bụ ọhụ ka ọ na-ahụ. O kwenyeghị na ihe ndị a nile pụrụ imezu. O jukwara ya anya nke ukwuu.
10
Ha pụtara site nꞌime ụlọ mkpọrọ ahụ. Ọ dịghị anya, ha bịaruru nꞌogige e ji igwe wuo. Ụzọ dị nꞌebe ahụ meghekwara nꞌonwe ya. Mmụọ ozi ahụ jidekwara Pita nꞌaka tutuu ruo mgbe ha gafesịrị ọnụ ụzọ nile nke ụlọ mkpọrọ ahụ. Mgbe ha pụtara nꞌezi, mmụọ ozi ahụ hapụrụ Pita aka. Pita ahụkwaghị ya anya ọzọ.
11
Mgbe ahụ kwa ka Pita ghọtara ihe nile mere. O kwuru sị, “Nꞌezie, Onyenwe anyị ezitela mmụọ ozi ya ka ọ bịa napụta m site nꞌaka eze Herọd. Ugbu a ọ napụtakwala m site nꞌọchịchọ ọjọọ nile nke ndị Juu.”
12
Mgbe Pita tụgharịsịrị ihe nile ndị a nꞌobi ya, ọ malitere ịga nꞌụlọ Meri nne Jọn Mak. Ọtụtụ ndị kwere ekwe zukọtara nꞌebe ahụ na-ekpe ekpere banyere Pita.
13
Mgbe Pita rutere nꞌụlọ ahụ, ọ kụrụ aka nꞌọnụ ụzọ. Ma otu nwagbọghọ a na-akpọ Roda bịara ka o meghee ụzọ ahụ.
14
Mgbe Roda nụrụ olu onye na-akụ aka, mata na ọ bụ olu Pita, o chetakwaghị imeghe ụzọ. Kama ọ gbaara ọsọ laghachi nꞌime ụlọ gwa ndị ọzọ sị, “Ọ bụ Pita na-akụ aka nꞌọnụ ụzọ.”
15
Ma ọ dịghị onye ọ bụla kwenyere nꞌihe o kwuru. Kama ha sịrị ya na ọ na-ekwu okwu dị ka onye anya na-adịghị mma. Mgbe Roda nọgidesịrị ike kwuo na ọ bụ Pita, ha zara sị ya, “Eleghị anya ọ ga-abụ mmụọ ozi Pita ka ị hụrụ, nꞌihi na ndị Juu egbuola ya.”
16
Nꞌoge ahụ kwa, Pita kụsịrị aka ike nꞌụzọ. Emesịa, ha meghere ụzọ ahụ. Mgbe ha hụrụ na ọ bụ Pita nꞌezie, ha ṅụrịrị ọṅụ nke ukwuu.
17
Ma Pita feere ha aka ka ha jiri nwayọọ kwuo okwu. Ọ kọọrọ ha ihe nile Onyenwe anyị mere site nꞌaka mmụọ ozi ya. Nꞌikpeazụ, Pita gwara ha sị, “Meenụ ka Jemes na ụmụnna anyị nile mata ihe ndị a.” Ọ hapụrụ ha gaa nꞌebe ọzọ.
18
Nꞌisi ụtụtụ echi ya, ọgba aghara dị nꞌụlọ mkpọrọ ahụ. O jukwara mmadụ nile anya ihe mere Pita.
19
Eze Herọd zigara ndị agha ya nꞌụlọ mkpọrọ ahụ ka ha kpụpụta Pita, ma ha ahụghị ya. Nꞌihi nke a Herọd nyere iwu ka ha jide ndị agha ahụ e tinyere iche Pita nche. E gbukwara ha nile. Emesịa Herọd hapụrụ Juda gaa Sizaria.
20
Mgbe Herọd nọ na Sizaria, ndị obodo Taịa na Saidọn zipụrụ ndị ozi ha izute ya nꞌihi na Herọd na-eweso ha iwe. Ma ndị ozi a buru ụzọ mee ka ha na Blastọs ode akwụkwọ eze bụrụ enyi. Ha rịọrọ ya ka o mee ka udo dịrị. Nꞌihi na ndị obodo ahụ na-esite nꞌobodo nke Herọd na-achị na-enweta ihe oriri ha.
21
Ha kpebiri na ha na eze Herọd ga-enwe nzukọ. Nꞌụbọchị nzukọ ahụ, Herọd gbokwasịrị onwe ya uwe ndị eze ya nọkwasị nꞌocheeze ya. O weere oke olu dị iche gwa nzukọ ahụ nile okwu.
22
Mgbe Herọd nọ na-ekwu okwu, igwe mmadụ ahụ nile toro ya otuto. Ha tiri mkpu sị, “Nke a abụghị olu mmadụ, ọ bụ olu Chineke!”
23
Nꞌotu oge ahụ, mmụọ ozi Onyenwe anyị tiri Herọd ihe otiti dị egwu. Ikpuru jupụtakwara ya nꞌahụ, nke mere ka ọ nwụọ. Ma ihe ndị a nile dakwasịrị ya nꞌihi na Herọd naara ofufe ahụ e kwesịrị inye nanị Chineke, dị ka a ga-asị na ọ bụ Chineke nꞌonwe ya. O nyekwaghị Chineke otuto ma ọlị.
24
Site nꞌoge ahụ gaa nꞌihu, nsogbu ọ bụla adịghị nye ndị na-ekwusa ozi ọma. Ọtụtụ mmadụ chegharịkwara biakwute Onyenwe anyị.
25
Mgbe ihe ndị a gasịrị, Sọl na Banabas bịara Jerusalem. Emesịa, ha laghachikwara Antiọk. Ha kpọọrọ Jọn Mak ka o soro ha nꞌije ha.
← Chapter 11
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 13 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28