bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Acts 17
Acts 17
Igbo 1988
← Chapter 16
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 18 →
1
Emesịa, ha malitere ijegharị nꞌobodo nile nke Amfipolis na Apolonia. Nꞌikpeazụ ha bịaruru Tesalonaịka, ebe ụlọ nzukọ ndị Juu dị.
2
Dị ka Pọl na-eme oge nile, ọ banyere nꞌime ụlọ nzukọ ahụ ikwu okwu Chineke. O mere nke a izu ụka atọ, na-ekpughekwa ihe e dere nꞌakwụkwọ nsọ.
3
Ọ na-akọwakwa ihe ndị amụma kwuru banyere ahụhụ nile Onye nzọpụta ga-ahụ na mbilite nꞌọnwụ ya. Site nꞌokwu ndị a o mekwara ka ha mata na Jisọs bụ Onye nzọpụta ahụ.
4
Ụfọdụ ndị Juu gere ntị nꞌokwu ahụ, ghọtara ihe ọ na-ekwu. Ha chegharịrị nabata Onyenwe anyị, ha na ndị Griik na-atụ egwu Chineke na ụmụ nwanyị ụfọdụ a maara aha ha.
5
Ma ndị isi Juu jupụtara nꞌekworo, nꞌihi ọrụ ndị a. Ha kwalitere obi ụfọdụ mmadụ efu nꞌetiti ha. Ndị a malitekwara ọgba aghara nꞌụzọ dị iche iche. Ha tikasịrị ụlọ Jesin, nꞌihi na ha chọrọ ịdọkpụta Pọl na Sailas, inyefe ha nꞌaka ụlọ ikpe obodo ahụ, ka e nye ha ntaramahụhụ.
6
Ma mgbe ha na-achọtaghị ha nꞌebe ahụ, ha dọkpụtara Jesin na ụmụnna anyị ụfọdụ, duru ha jekwuru ndị ikpe obodo ahụ. Ha boro ha ebubo sị, “Ndị a kpuru ụwa ihu nꞌala abịala inye obodo ukwu anyị nsogbu.
7
Ma nwoke a na-akpọ Jesin zoro ha nꞌụlọ ya. Ha na-emebi iwu Siza nꞌihi na ha na-asịkwa na ọ dị eze ọzọ dị nke a na-akpọ Jisọs.”
8
Okwu dị otu a wetara obi ịlọ mmiri nꞌetiti ndị ikpe na mmadụ nile.
9
Ha hapụrụ ha nanị mgbe ndị akaebe bịara kwụọ ụgwọ ịnapụta ha.
10
Ma nꞌabalị ahụ ndị kwere ekwe mere ngwangwa zipụ Pọl na Sailas ka ha gaa obodo Beria. Ma mgbe ha ruru nꞌebe ahụ, ha banyere nꞌụlọ nzukọ ndị Juu, na-ekwusa ozi ọma Chineke.
11
Ma ndị bi na Beria jiri obi ghere oghe nabata okwu Chineke karịa ndị bi na Tesalonaịka. Mgbe ha gere ntị nꞌokwu Chineke, ha jiri ọṅụ nyochaa akwụkwọ nsọ ịchọpụta ma ozizi Pọl na Sailas na-ezi ọ bụ eziokwu. Ha mere nke a ụbọchị nile.
12
Site nꞌụzọ dị otu a ọtụtụ mmadụ nꞌetiti ha chegharịrị. Ụfọdụ ụmụ nwanyị ndị Griik na ọtụtụ ndị ọzọ bụ ndị nwoke chegharịkwara.
13
Ma mgbe ndị Juu bi na Tesalonaịka nụrụ na Pọl na-ekwusa ozi ọma nꞌobodo Beria, ha bịara nꞌobodo ahụ webata ọgba aghara ọzọ.
14
Ndị kwere ekwe nọ nꞌebe ahụ mere ngwangwa izipụ Pọl ka ọ gaa nꞌakụkụ oke osimiri dị nꞌebe ahụ. Ma ha hapụrụ Sailas na Timoti ka ha na ha nọdụ nwa oge.
15
Ma ndị dupụrụ Pọl sooro ya ruo obodo Atens. Emesịa, ha laghachiri Beria zie Sailas na Timoti ozi na Pọl chọrọ ka ha bịakwute ya ngwangwa.
16
Pọl nọdụrụ nꞌAtens chere Timoti na Sailas. Nꞌoge a o wutere ya nke ukwuu nꞌihi arụsị nile ọ hụrụ, nke jupụtara nꞌobodo ahụ.
17
Nꞌihi ya, ọ banyere nꞌụlọ nzukọ ndị Juu soro ha kwuritaa okwu. Ụfọdụ ndị nọ nꞌime nzukọ a bụ ndị mba ọzọ na-atụ egwu Chineke. Ụbọchị nile Pọl na-ekwusara ndị nile na-abịakwute ya nꞌọgbọ ọha, ozi ọma.
18
O sokwaara ndị ọkachamara obodo ahụ, ndị a na-akpọ ndị Epikuri na ndị Stoik kwurita okwu. Kama ha enweghị afọ ojuju mgbe Pọl gwara ha ihe banyere Jisọs na mbilite nꞌọnwụ ya. Mgbe ha nụrụ ya ụfọdụ sịrị, “Nwoke a na-arọ nrọ.” Ndị ọzọ sịkwa, “Ọ na-ewebata ozizi ọhụrụ dị iche.”
19
Ndị ọkachamara ahụ kpọbatara ya nꞌebe ha zukọrọ, ebe a na-akpọ Ugwu Mas, sị ya, “Bịa kọwaara anyị ozizi ọhụrụ gị.
20
Ihe nile ị na-ekwu na-akọ anyị ọkọ na ntị. Ha na-agbagwoju anyị anya. Anyị chọrọ ịnụ ha nke ọma.”
21
Ihe e jiri mara ndị Atens bụ na ha na-achọ nanị ikwu okwu banyere ihe ọhụrụ. Nke a agwụchaala ọrụ ha, ịnụ ihe banyere ihe ọhụrụ na ikwu maka ya. Nke a bụkwa ọrụ ndị ọbia bi nꞌobodo ahụ.
22
Nꞌihi nke a Pọl guzoro nꞌelu ugwu ahụ gwa ha okwu sị, “Unu ndị nile bi nꞌAtens. Amatara m na ọ na-anụ unu ọkụ nꞌobi ịsọpụrụ mmụọ nke unu na-efe ofufe.
23
Nꞌihi na mgbe m na-ejegharị nꞌobodo unu, ahụrụ m ụlọ chi dị iche iche. Otu nꞌime ha ka e dekwasịrị ihe dị otu a nꞌelu ya, ‘E wuru ụlọ a nye chi ahụ a na-amaghị.’ Nke a pụtara na unu na-efe chi ahụ unu na-amaghị ofufe. Ma ugbu a, achọrọ m ka m kọwaara unu ihe banyere ya.
24
“Chineke bụ onye kere ụwa na ihe nile dị nꞌime ya. Ebe ọ bụ onye nwe eluigwe na ụwa, ọ dịghị ebikwa nꞌụlọ e jiri aka wuo.
25
Otu aka ahụ, mmadụ ọ bụla apụghị isite nꞌike aka ya jeere ya ozi nꞌụzọ kwesịrị. Nꞌihi na ọ dịghị ihe na-akpa Chineke mkpa. Ya onwe ya na-enye ndụ na ume na ihe nile. Ọ na-egbokwa mkpa nile.
26
Ọ bụ ya kere mmadụ nile site nꞌotu nwoke. O mere ka mba dị iche iche dị nꞌelu ụwa. Ọ bụkwa nanị ya na-ekpebi ihe banyere mbilite na ọdịda nke mba nile. Ọ matakwara ihe banyere oge nile a kara aka na njedebe ihe nile e kere eke.
27
“Ma nzube ya banyere ihe nile bụ ka onye ọ bụla chọsie ihu ya ike. Eleghị anya mmadụ nwere ike lezie ụzọ ya anya, si otu a chọta Chineke. Ọ nọkwaghị mmadụ ọ bụla nꞌebe dị anya.
28
Nꞌihi na nꞌime ya ka anyị na-adị ndụ, anyị na-ejegharịkwa nꞌime ya. Dị ka otu onye nꞌetiti unu na-ekwu sị, ‘Anyị onwe anyị bụkwa ụmụ Chineke.’
29
Ọ bụrụ na nke a bụ eziokwu, anyị ekwesịghị iche na Chineke dị ka ihe mmadụ jiri aka ya kpụọ. A pụkwaghị iwere ọlaọcha na ọlaedo ma ọ bụ nkume kpụọ Chineke!
30
Ma Chineke lefuru enweghị ngbọta mmadụ anya banyere ihe ndị a nile nꞌoge gara aga. Ma ugbu a, ọ chọrọ ka onye ọ bụla site nꞌikpere arụsị wezuga onwe ya. Ọ chọkwara ka mmadụ nile fee ya ofufe.
31
Nꞌihi na o debela otu ụbọchị mgbe ọ ga-ekpe ụwa nile ikpe nꞌụzọ ezi omume. Nke a bụ site nꞌaka Onye ahụ ọ họpụtara. O mekwara ka okwu a guzosie ike, mgbe o mere ka Onye ahụ si nꞌọnwụ bilie.”
32
Mgbe ha nụrụ ozizi Pọl banyere mbilite nꞌọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ, ha chịrị ya ọchị. Ma ụfọdụ nꞌime ha sịrị, “Nꞌoge ọzọ anyị ga-achọ ịnụ okwu ndị a.”
33
Mmadụ ole na ole sooro Pọl. Ha kweere nꞌOnyenwe anyị. Otu onye nꞌime ha bụ Dionisiọs. Ọ bụ otu nꞌime ndị isi obodo ahụ. Onye ọzọ bụ nwanyị a na-akpọ Damariọs na ndị ọzọ kwa.
← Chapter 16
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 18 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28