bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Acts 18
Acts 18
Igbo 1988
← Chapter 17
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 19 →
1
Pọl hapụrụ Atens gaa obodo Kọrint.
2
Nꞌebe ahụ o zutere otu onye Juu a mụrụ nꞌobodo Pọntọs, onye a na-akpọ Akwila. Ya na nwụnye ya Prisila sitere Itali bịa Kọrint nꞌihi na a chụpụrụ ha na Rom mgbe eze ndị Rom bụ Klọdiọs nyere iwu ka a chụpụ ndị Juu site nꞌobodo Rom.
3
Pọl soro ha bikọọ, nꞌihi na ha bụ ndị na-akpa akwa e ji ama ụlọ ikwu, dị ka Pọl na-emekwa.
4
Ụbọchị izuike nile Pọl na-ejekwuru ndị Juu nꞌụlọ nzukọ ha na-agbalị ime ka ndị Juu na ndị Griik kwere.
5
Mgbe Sailas na Timoti sitere na Masidonia bịa izute Pọl, Pọl tinyere oge ya nile ikwu okwu Chineke na ịkọwara ndị Juu na Jisọs bụ Onye nzọpụta ahụ.
6
Ọtụtụ ndị Juu ekwereghị. Kama ha na-ekwulu Pọl. Nꞌihi nke a Pọl hichapụrụ aja dị nꞌuwe ya sị ha, “Ọbara unu dịkwasịkwa unu nꞌisi. Ikpe amakwaghị m banyere unu. Malite ugbu a, aga m ezisara ndị mba ọzọ ozi ọma a.”
7
Ọ hapụrụ ha gaa biri nꞌụlọ Taitọs Jọstọs, onye mba ọzọ na-asọpụrụ ma na-efekwa Chineke ofufe. Ụlọ ya dị nꞌakụkụ ụlọ nzukọ ndị Juu nꞌobodo ahụ.
8
Otu nwoke a na-akpọ Krispọs onyeisi nꞌụlọ nzukọ ndị Juu ahụ na ezinụlọ ya nile chegharịrị bịakwute Onyenwe anyị. E mekwara ha baptizim dị ka e mere ọtụtụ ndị ọzọ na Kọrint.
9
Onyenwe anyị gwara Pọl okwu nꞌọhụ nꞌotu abalị sị ya, “Atụla egwu Pọl! Kwusie okwu ike, emechila ọnụ gị ma ọlị.
10
Nꞌihi na anọnyeere m gị. Ọ dịkwaghị onye ọ bụla pụrụ imerụ gị ahụ. Enwekwara m ọtụtụ mmadụ nꞌime obodo a.”
11
Site na nke a, Pọl nọgidere nꞌobodo ahụ otu afọ na mkpirisi. Ọ na-ezikwa ndị mmadụ okwu Chineke.
12
Mgbe Galio malitere ịchị nꞌobodo Akaịa, ndị Juu bidoro omume ọjọọ megide Pọl. Nꞌikpeazụ ha duuru ya gaa nꞌihu Galio, ka e kpee ya ikpe.
13
Ha boro Pọl ebubo na ọ na-akwagide obodo ha nile ife Chineke ofufe nꞌụzọ megidere omenala na iwu ha.
14
Ma mgbe Pọl chọrọ ịkọwa onwe ya nꞌihu Galio, Galio chigharịrị ihu ya lee ndị ahụ na-ebo Pọl ebubo ụgha anya sị ha, “Ndị Juu, geenụ m ntị. Ọ bụrụ na nke a bụ okwu megidere iwu ndị Rom, obi ga-atọ m ụtọ ige unu ntị.
15
Ma ebe unu na-ekwu ihe banyere ihe mmụta dị iche iche na ịrụ ụka site nꞌiwu na-achị ndị Juu, gaanụ dozie ya nꞌonwe unu. Okwu ahụ agbasaghị m, achọghị m itinye ya ọnụ ma ọlị.”
16
Galio sitere nꞌime ụlọ ikpe ya chụpụ ha.
17
Mgbe ha pụtara nꞌezi, ha jidere Sostenis, onye bụ onyeisi ụlọ nzukọ ndị Juu ahụ tie ya ihe nke ukwuu nꞌọnụ ụzọ ụlọ ikpe ahụ. Ma Galio emeghị dị ka ọ maara ihe na-eme nꞌebe ahụ.
18
Ma Pọl nọgidere nꞌobodo ahụ ụbọchị ụfọdụ. Emesịa, ọ hapụrụ ndị kwere ekwe nọ nꞌobodo ahụ banye nꞌụgbọ mmiri gaa nꞌakụkụ Siria. Prisila na Akwila sokwaara ya gaa. Ma mgbe ha bịaruru obodo a na-akpọ Senkria, Pọl kpachara agịrị isi ya. Nke a bụkwa usoro omenala ndị Juu, nꞌihi na o kwere Chineke nkwa.
19
Ọ bịaruru nꞌọnụ mmiri Efesọs, hapụ anyị nꞌime ụgbọ ahụ, baa jekwuru ndị Juu nꞌụlọ nzukọ ha. Ọ gwara ha okwu Onyenwe anyị.
20
Ha rịọrọ ya ka ọ nọnyere ha ụbọchị ụfọdụ, ma ọ hapụrụ ha nꞌihi na ọ chọghị itufu oge ọ bụla.
21
Ọ gwara ha sị, “Achọrọ m ijeru Jerusalem nꞌoge izuike. Ma ọ bụrụ uche Onyenwe anyị aga m alọghachi ọzọ.” Emesịa, anyị gara nꞌihu nꞌije anyị.
22
Ebe ọzọ anyị kwụsịrị bụ nꞌọnụ mmiri a na-akpọ Sizaria. Pọl sitere nꞌebe a jeruo ileta nzukọ Kraịst dị na Jerusalem. Emesịa, anyị jerukwara Antiọk.
23
Mgbe anyị nọsịrị ụbọchị ụfọdụ nꞌebe ahụ, Pọl hapụrụ jeghachikwa obodo Tọki, jegharịa akụkụ Galetia na Frigia nile na-eleta ndị kwere ekwe, na-agwa ha okwu ga-agba ha ume.
24
Otu ọ dị e nwere otu nwoke onye Juu bịara ọhụrụ nꞌobodo Efesọs. Aha ya bụ Apọlọs. Ọ bụ onye ikuzi akwụkwọ nsọ were anya nke ọma. O sitere nꞌobodo Alegzanda nke dị nꞌIjipti ebe a mụrụ ya bịa Efesọs.
25
Nwoke a natara ozizi banyere Ụzọ Onyenwe anyị. O sitekwara nꞌịnụ ọkụ nke obi kuzie nnọọ ihe ziri ezi banyere Jisọs. Ma ihe ọ maara bụ nanị ihe gbasara baptizim Jọn mere.
26
Ma ọ nọgidesịrị ike na-ekwuwa okwu nꞌụlọ nzukọ ndị Juu. Mgbe Prisila na Akwila nụrụ okwu ya, ha jekwuru ya duru ya gaa nꞌụlọ, were nwayọọ kọwaara ya ihe nile banyere Ụzọ Chineke.
27
Ihe Apọlọs na-ezube nꞌuche ya bụ ijeru obodo Griis. Ụmụnna anyị kasịrị ya obi. Ha degaara ụmụnna nọ nꞌebe ahụ akwụkwọ ka ha lekọtaa Apọlọs anya nke ọma. Mgbe ọ bịaruru Griis, Onyenwe anyị jiri ya rụọ ọrụ dị ukwuu. E sitekwara nꞌaka ya gbaa ụmụ Chineke ume nꞌime nzukọ Kraịst nile dị nꞌobodo ahụ.
28
Nꞌihu ndị mmadụ nile, o guzoro kwuo okwu megide ozizi ọjọọ na ịrụ ụka nile nke ndị Juu. O gosiri ha site nꞌakwụkwọ nsọ na Jisọs bụ Onye nzọpụta ahụ.
← Chapter 17
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 19 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28