bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Acts 24
Acts 24
Igbo 1988
← Chapter 23
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 25 →
1
Mgbe abalị ise gasịrị, Ananayas na ndị okenye ndị Juu na lọya ha aha ya bụ Tatulọs bịara. Ha dum pụtara nꞌihu Feliks ịgbagide Pọl ama.
2
Mgbe a kpọbatara Pọl, Tatulọs pụtara guzo kwuo sị, “Onye a na-asọpụrụ ka gị Feliks bụ. I nyela anyị ndị Juu ahụ udo. I meela ka anyị hapụ ịbụkwa ndị a na-eleda anya.
3
Nꞌihi nke a ọnụ anyị jupụtara nꞌekele.
4
Kama iji oke okwu mee ka ike gwụ gị, ana m arịọ ka i gee ntị mgbe m ga-eji nwa oge kwuo okwu anyị nwere megide nwoke a.
5
Anyị chọpụtara na nwoke a bụ onye na-ewetakarị aghara, onye ọrụ ya bụ ikwagide ndị Juu nọ nꞌebe nile nꞌụwa a ka ha nupụ isi. Ọ na-akpali ọgba aghara megide ọchịchị ndị Rom. Ọ bụkwa onyeisi ajọ otu ahụ a na-akpọ Otu onye Nazaret.
6
Ewezugakwa nke a, ọ chọkwara imerụ ụlọ nsọ anyị nꞌoge anyị jidere ya. Ma anyị chọrọ ikpe ya ikpe dị ka omenala anyị si dị,
7
ma Lisias ọchịagha ahụ, bịara jiri ike napụ ya nꞌaka anyị.
8
Lisias nyere iwu ka e ekpee ya ikpe nꞌusoro iwu ndị Rom. Ị ga-achọpụta ma ama anyị ọ bụ eziokwu mgbe gị onwe gị jụrụ nwoke a ajụjụ.”
9
Mgbe ahụ ndị Juu nọ nꞌebe ahụ kwere nꞌisi na-akwagide okwu nile Tatulọs kwuru.
10
Emesịa, Feliks feere Pọl aka ka o bilie kwuo okwu. Pọl siri otu a bido. “Amaara m nna anyị, na ị bụrụla onye ọkaikpe nꞌihe gbasara ndị Juu site nꞌogologo afọ ndị a gara aga. Nke a na-enye m ntụkwasị obi mgbe m na-asa ọnụ m.
11
Ị pụrụ ịchọpụta na o rubeghị ụbọchị iri na abụọ ụkwụ m zọbatara na Jerusalem. Abịakwara m ife Chineke nꞌụlọ nsọ ukwu ya.
12
Ị ga-achọpụtakwa na ndị Juu ahụghị m ka mụ na onye ọ bụla na-ese okwu, ma ọ bụ na o nwere ebe m kpatara aghara nꞌime ụlọ nzukọ, ma ọ bụ ebe ọ bụla nꞌime obodo.
13
Ndị a enwekwaghị ihe ọ bụla ha ga-eji kwagide ama ha na-agba megide m.
14
“Ma otu ihe ka m na-ekwupụta, ya bụ, na m kweere nꞌụzọ nzọpụta ahụ ha na-akpọ Otu onye Nazaret. Ana m eso uzọ a na-efe Chineke nna anyị ha ofufe. Ma ekwenyesịrị m ike nꞌiwu Mosisi, tinyere ihe nile e dere nꞌiwu Mosisi na nꞌakwụkwọ ndị amụma.
15
Ma enwere m olileanya dị ka ha onwe ha nwekwara na mbilite nꞌọnwụ nke ndị ezi omume na nke ndị ajọ omume ga-adị.
16
Nꞌihi nke a ka m ji na-agbalị mgbe nile ibi obi dị ọcha nꞌihu Chineke na mmadụ.
17
“Mgbe m si Jerusalem pụọ nọọ ọtụtụ afọ, alọghachiri m Jerusalem iwetara ụmụnna m ego ha ga-eji gboo mkpa ha. Abịakwara m ịchụ aja nke ịnata ihuọma nꞌaka Chineke.
18
Ndị a na-agbagide m ama hụrụ m nꞌụlọ nsọ ukwu ahụ mgbe m na-enye onyinye ekele ahụ. Akpachara m isi m dị ka e siri nye nꞌiwu. Ọ dịkwaghị igwe mmadụ so m ma ọ bụ aghara ọ bụla e mere.
19
Ma ụfọdụ ndị Juu si Tọki nọ nꞌebe ahụ. Ha kwesịrị ịnọ nꞌebe a ma ọ bụrụ na ha nwere ihe ọ bụla megide m.
20
Ma jụọ ndị a nọ nꞌebe a ugbu a ihe ọjọọ ha chọtara nꞌime m mgbe m guzoro nꞌụlọ nzukọ ha.
21
Karịa na m kwuru nanị otu ihe mgbe m tiri mkpu sị, ‘Unu na-ekpe m ikpe taa nꞌihi okwukwe m na ndị nwụrụ anwụ ga-adị ndụ ọzọ.’ ”
22
Mgbe ahụ Feliks onye maara nke ọma ihe nile banyere ndị na-eso ụzọ Kraịst yigharịrị ikpe a. Ọ gwara Pọl na ndị na-ebo ya ebubo sị, “Aga m eleba anya nꞌikpe a mgbe Lisias onyeisi agha bịara.”
23
Emesịa, o nyere iwu ka ha tinyekwa Pọl nꞌụlọ mkpọrọ. Ma o nyere ndị nche iwu ka ha lezie ya anya nke ọma. Ka ha nye ya ohere inwere onwe ya ime ụfọdụ ihe, ka ha kwekwa ka ndị enyi ya bịa ileta ya.
24
Mgbe abalị ole na ole gasịrị, Feliks na nwụnye ya Drusila bụ onye Juu, batara nꞌụlọ ikpe. O ziri ka a kpọọ Pọl. Ya na nwụnye ya gere ntị mgbe Pọl gwara ha okwu banyere inwe okwukwe nꞌime Jisọs Kraịst.
25
Ma mgbe Pọl gara nꞌihu na-ekwu ihe banyere ezi omume na mkpa ọ dịrị mmadụ ijide onwe ya aka nꞌihe ọ bụla ọ na-eme, ya na ihe banyere ụbọchị ikpe nke na-abịa nꞌoge ikpeazụ, egwu jidere Feliks. Ọ gwara Pọl okwu sị ya, “Ị nwere ike ịpụ ugbu a, Aga m akpọkwa gị nꞌoge ọzọ mgbe m nwetara ohere.”
26
Feliks chekwara na Pọl ga-enye ya ego. Ya mere o jiri na-eziga ka a na-akpọ Pọl site nꞌoge ruo nꞌoge ka ya na ya na-akparịta ụka.
27
Mgbe afọ abụọ gasịrị, onye a na-akpọ Pọshiọs Festọs nọchiri anya Feliks. Ma ebe Feliks chọrọ inweta ihuọma nꞌaka ndị Juu, ọ hapụrụ Pọl nꞌụlọ mkpọrọ.
← Chapter 23
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 25 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28