bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Acts 13
Acts 13
Igbo 1988
← Chapter 12
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 14 →
1
Ndị amụma na ndị nkuzi ụfọdụ nọkwa na nzukọ Kraịst dị nꞌAntiọk. Ụfọdụ nꞌime ha bụ Banabas na Simiọn onye a na-akpọ Nwoke ojii, na Lusiọs onye Sirini, na Menien onye sitere nꞌezinụlọ Herọd pụta, na Sọl.
2
Otu mgbe, ndị a zukọrọ ibu ọnụ na ikpe ekpere. Mmụọ Nsọ gwara ha okwu sị, “Kewapụnụ Banabas na Sọl ka ha nọdụ iche. Nꞌihi na enwere m ọrụ dị ukwuu ha ga-arụ nꞌaha m.”
3
Ya mere, mgbe ha busịrị ọnụ nꞌime ekpere ha, e bikwasịrị Sọl na Banabas aka nꞌisi, zipụ ha ijere Chineke ozi.
4
Mmụọ Nsọ duuru ha gaa obodo Selusia. Emesịa, ha sitere nꞌebe ahụ jeruo Saiprọs.
5
Mgbe ha bịaruru obodo Salamis, ha banyere nꞌụlọ nzukọ ndị Juu. Jọn Mak sokwa ha dị ka onye na-ejere ha ozi.
6
Emesịa, ha kwusara ozi ọma nꞌobodo nta nile dị nꞌala ahụ. Nꞌikpeazụ, ha batara nꞌobodo a na-akpọ Pafọs. Ọ bụkwa nꞌebe a ka ha zutere otu onye amụma ụgha aha ya bụ Bajisọs.
7
Bajisọs bụkwa enyi ọchịagha obodo ahụ, onye a na-akpọ Sajiọs Pọlọs. Ha abụọ na-anọkọ oge nile. Ọchịagha ahụ nwere amamihe na mmụọ nke ịṅomi ihe. O ziri ozi ka a kpọọ Banabas na Sọl, nꞌihi na ọ chọrọ ịnụ okwu Chineke site nꞌọnụ ha.
8
Ma Bajisọs onye mgbaasị ahụ, onye aha ọzọ a na-akpọ ya nꞌasụsụ Griik bụ Elimas, malitere inye ọtụtụ nsogbu, ime ka ọchịagha ahụ hapụ ịghọta ihe Banabas na Sọl na-agwa ya. Ọ chọkwaghị ka ọchịagha ahụ chegharịa kwere nꞌOnyenwe anyị Jisọs.
9
Ma Sọl, ebe o jupụtara nꞌike Mmụọ Nsọ, legidere onye mgbaasị ahụ anya nꞌoke iwe,
10
sị ya, “Gị nwa ekwensu! Ị jupụtara nꞌaghụghọ na ihe ọjọọ dị iche iche! Ị bụkwa onye iro ezi omume nile! Ugbu a, ahụrụ m na ị chọghị ịkwụsị ibu agha megide Onyenwe anyị.
11
Nꞌihi ya lee, aka Chineke na-adakwasị gị ugbu a. Ọ ga-emekwa ka ị baa nꞌikpe na ahụhụ. Ya mere, malite ugbu a, ị ga-abụ onye kpụrụ ìsì! Ị gaghị ahụkwa ìhè anya ụbọchị ụfọdụ!” Nꞌotu oge ahụ, nwoke a kpuru ìsì. Ọ malitekwara ijegharị nꞌime ọchịchịrị, na-achọkwa onye ga na-edugharị ya.
12
Mgbe Sajiọs Pọlọs hụrụ ihe nile mere, o kweere nꞌOnyenwe anyị Jisọs. O jukwara ya anya nke ukwuu bụ ike ahụ dị nꞌokwu Chineke.
13
Pọl na ndị otu ya banyere ụgbọ mmiri na Pafọs jeruo obodo Pega nke dị nꞌakụkụ Tọki. Nꞌebe a ka Jọn Mak hapụrụ ha laghachi Jerusalem.
14
Ma Sọl na Banabas gara bịaruo Antiọk, obodo nke dị na Pisidia. Nꞌụbọchị izuike, ha banyere nꞌụlọ nzukọ ndị Juu ife Chineke.
15
Mgbe a gụpụtasịrị site nꞌakwụkwọ Mosisi na nke ndị amụma ndị isi ụlọ nzukọ ahụ gwara Pọl na Banabas okwu sị, “Ụmụnna anyị, ọ bụrụ na unu nwere okwu ndụmọdụ unu chọrọ inye anyị, bịanụ ka unu gwa anyị ya.”
16
Ya mere, Pọl guzoro ọtọ nꞌetiti ha feere ha aka ya abụọ. Mgbe o kelesịri ha, ọ gwara ha okwu sị, “Unu ndị Izirel, na unu ụmụnna m ndị mba ọzọ na-atụ egwu Chineke. Geenụ m ntị!
17
“Chineke nke Izirel họpụtara nna nna anyị ha mee ha mba dị ukwuu nꞌoge ha nọ nꞌobodo Ijipti. Chineke sitere nꞌike ya dị ukwuu gbapụta ha site nꞌọnọdụ ịbụ ohu ha.
18
Ọ zụrụ ha dị ka atụrụ nꞌime ọzara ihe dị ka iri afọ anọ, mgbe ha na-awagharị nꞌime ọzara ahụ site nꞌotu ebe ruo nꞌebe ọzọ.
19
Emesịa, o mebiri mba asaa dị ukwuu nꞌime ala Kenan nꞌihi ha, nyekwa ndị ya obodo ndị a ka ha bụrụ nke ha.
20
O mere ka ndị ikpe dị iche iche chịa ha ihe dị ka narị afọ anọ na iri afọ ise. Emesịa, Samuel onye amụma soro bụrụ otu nꞌime ndị chịrị ụmụ Izirel.
21
“Mgbe ahụ ụmụ Izirel rịọrọ ka Chineke nye ha eze ga-achị ha. Chineke nyekwara ha Sọl nwa Kish, ka ọ bụrụ eze ha. Sọl, onye si nꞌagbụrụ Benjamin pụta, chịrị dị ka eze iri afọ anọ.
22
Ma Chineke wepụrụ Sọl, họpụta Devidi ka ọ bụrụ eze nꞌọnọdụ ya. Chineke kwuru okwu banyere Devidi sị, ‘Devidi nwa Jeesi bụ nwoke a họpụtara site nꞌọchịchọ obi m. Ọ bụkwa onye na-eme ihe nile m chọrọ ka o mee mgbe nile.’
23
Jisọs, onye si nꞌezinụlọ Devidi pụta, bụkwa Onye nzọpụta ahụ Chineke kwere nkwa izite.
24
“Ma tupuu Jisọs abịa, e mere ka Jọn omee baptizim buru ụzọ bịa, idoziri ya ụzọ. Jọn kọwaara ụmụ Izirel nile mkpa ọ dị na ha ga-esite na mmehie ha chegharịa bụrụ ndị e mere baptizim.
25
Nꞌoge Jọn omee baptizim na-akwado ịrụsị ọrụ ya, ọ jụrụ ndị Juu nile ajụjụ sị, ‘Unu chere na abụ m Onye nzọpụta ahụ? Ọ dịghị, abụghị m ya. Kama lezienụ anya, nꞌihi na ọ ga-abịa nꞌoge na-adịghị anya. A pụkwaghị iji m tụnyere ya, nꞌihi na etozughị m oke ịtọpụ akpụkpọ ụkwụ o yi nꞌụkwụ ya.’
26
“Ya mere ụmụnna m, unu ụmụ Eberaham, na unu bụ ndị mba ọzọ na-asọpụrụ Chineke. Nzọpụta a dịịrị anyị nile.
27
Ndị Juu bi na Jerusalem na ndị isi ha amataghị na Jisọs bụ Onye nzọpụta ahụ. Ha aghọtakwaghị okwu nile ndị amụma dere, okwu nke a na-agụpụta na ntị ha kwa izu. Ma ha mere ka okwu ahụ ndị amụma kwuru mezuo, mgbe ha mara Jisọs ikpe ọnwụ.
28
Ọ bụ ezie na ha achọtaghị ihe kwesịrị ọnwụ nꞌime ya. Ma ha rịọrọ Pailet ka o nye ike ka e gbuo ya.
29
Ma mgbe ha mezusịrị ihe nile ndị amụma kwuru banyere ọnwụ ya, ha budatara ya site nꞌelu obe lie ya.
30
Ma Chineke mere ka o si nꞌọnwụ bilie ọzọ!
31
E mekwara ka ọtụtụ mmadụ hụ ya anya ọtụtụ mgbe nꞌime ụbọchị ụfọdụ. Ndị nile soro ya jegharịa hụkwara ya, bụ ndị ahụ soro ya jegharịa site na Galili ruo Jerusalem. Ndị a bụkwa ndị na-agba ama nꞌihu ọtụtụ mmadụ banyere ihe ndị a.
32
“Ugbu a mụ onwe m na Banabas bịara nꞌetiti unu iwetara unu ozi ọma a. Nꞌihi na Chineke emezuola nkwa ahụ o kwere nna nna anyị ha nꞌọgbọ a. Nꞌihi na Chineke mere ka Jisọs si nꞌọnwụ bilie.
33
Nke a bụ ihe akwụkwọ Abụ Ọma isi abụọ na-ekwu banyere ihe ndị a. O kwuru ihe banyere Jisọs sị, ‘Taa ebuliela m gị elu dị ka nwa m.’
34
“Chineke kwererị nkwa ime ka Jisọs site nꞌọnwụ bilie. Ọ gaghị anwụkwa ọzọ. Nke a bụ ihe akwụkwọ nsọ na-agwa anyị mgbe e kwuru nꞌime ya sị, ‘Aga m emezuru gị nkwa ahụ nile m kwere Devidi.’
35
Nꞌabụ Ọma, a kọwakwara nke ọma sị, ‘Chineke agaghị ekwe ka Onye nsọ ya ree ure.’
36
E kwughị ihe ndị a banyere Devidi. Nꞌihi na anyị maara na Devidi nwụrụ mgbe ọ rụzuru ọrụ Chineke chọrọ ka ọ rụọ. E liri ya, o rekwara ure.
37
Kama ihe nile ndị a na-ekwu ihe banyere onye ahụ Chineke mere ka o site nꞌọnwụ bilite. Onye anụ ahụ ya na-erekwaghị ure.
38
“Ụmụnna m, biko geenụ ntị. Mgbaghara mmehie nile dịkwa nꞌime onye a a na-akpọ Jisọs.
39
Onye ọ bụla tụkwasịrị ya obi ga-enweta mgbaghara mmehie ya nile. A ga-agụkwa onye ahụ nꞌonye ezi omume. Nke a bụ ihe iwu ndị Juu na-apụkwaghị imezuru onye ọ bụla.
40
Lezienụ anya! Ka ihe nile ndị amụma kwuru hapụ imezu nꞌisi unu.
41
Nꞌihi na ndị amụma kwuru sị, ‘Lee! unu ga-ala nꞌiyi! Unu ndị na-enupụ isi nꞌeziokwu. Aga m eme ihe ga-agbagwoju ọtụtụ mmadụ anya nꞌọgbọ unu. Ihe unu na-agaghị ekwenye na ọ bụ eziokwu mgbe unu nụrụ ya.’ ”
42
Mgbe igwe mmadụ ahụ si nꞌụlọ nzukọ na-ala nꞌụbọchị ahụ, ha rịọrọ Pọl ka ọ bịakwa nꞌizu ụka ọzọ ịgwa ha okwu ndị a.
43
Ma ọtụtụ ndị Juu na ndị mba ọzọ na-atụ egwu Chineke sitere nꞌụlọ nzukọ ahụ soro Pọl na Banabas. Ma mgbe ha na-aga nꞌụzọ, Pọl na Banabas riọsịrị ha arịrịọ ike sị ha nọgide nꞌamara Chineke.
44
Nꞌizu ụka ọzọ, ọtụtụ ndị bi nꞌobodo ahụ pụtara ịnụrụ okwu Onyenwe anyị nke Pọl na Banabas ga-ekwu.
45
Mgbe ndị isi ndị Juu hụrụ igwe mmadụ ndị a, ndị gbakọrọ ịnụ okwu Pọl na Banabas, ha bidoro inwe anya ụfụ megide Pọl na Banabas bidokwa ikwu okwu ọjọọ megide okwu nile ha na-ekwu.
46
Ma Pọl na Banabas jiri olu ike na-ekwu okwu Onyenwe anyị. Ha na-ekwukwa sị, “Ọ dị mkpa na ozi ọma a ga-ebu ụzọ rute ndị Juu. Ma dị ka unu siri jụ ịnabata ya nke ọma, unu na-egosi na unu ekwesịghị ịnata ndụ ebighị ebi nke Chineke na-enye unu. Ugbu a, anyị ga-ewerekwa ozi ọma ahụ jekwuru ndị mba ọzọ.
47
Nꞌihi na nke a bụ ihe Chineke nyere nꞌiwu mgbe o kwuru sị, ‘E meela ka unu bụrụ ìhè nye ndị mba ọzọ, ka unu site nꞌebe nile ụwa sọtụrụ dubata ha nꞌụzọ nzọpụta.’ ”
48
Mgbe ndị mba ọzọ nọ nꞌebe ahụ nụrụ ihe ndị a, obi tọrọ ha ụtọ nke ukwuu. Ha ṅụrịkwara ọṅụ nꞌihi ozi ọma nke Pọl wetaara ha. Ya mere ndị nile a họpụtara inweta ndụ ebighị ebi kweere nꞌaha Onyenwe anyị Jisọs.
49
Site nꞌihe ndị a nile, okwu Onyenwe anyị gara nꞌihu nꞌobodo ahụ.
50
Mgbe ahụ ndị isi Juu ahụ kpalịrị obi ọtụtụ ụmụ nwanyị na-atụ egwu Chineke tinyere ndị isi obodo ahụ. Ha sitere nꞌọgbakọ ọjọọ ndị a megide Pọl na Banabas, chụpụ ha site nꞌobodo ahụ.
51
Ma Pọl na Banabas tichapụrụ aja dị nꞌụkwụ ha ka ọ bụrụ ihe ga-emegide obodo ahụ. Emesịa, ha hapụrụ obodo ahụ gaa obodo ọzọ a na-akpọ Aikoniọm.
52
Ndị kwere ekwe nile jupụtakwara nꞌọṅụ nꞌebe ahụ. Ha jupụtakwara nꞌike Mmụọ Nsọ.
← Chapter 12
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 14 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28