bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Acts 5
Acts 5
Igbo 1988
← Chapter 4
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 6 →
1
Ma ọ dị otu nwoke a na-akpọ Ananayas. Ya na nwụnye ya Safaịra gbara izu ree ala ha nwere.
2
Ma ha ewetaghị ego nile ha retara. Ananayas zoro ụfọdụ nꞌime ego ahụ. Safaịra nwụnye ya matakwara. O kwenyere ka di ya zoo ego ahụ. Ma ego ha kwekọtara iwepụta ka Ananayas wetara nye ndị ozi.
3
Ma Pita maara ihe Ananayas mere. Ọ sịrị ya, “Gịnị mere i ji kwenye ka ekwensu na-achị nꞌobi gị ime ka ị ghọgbuo Mmụọ Nsọ? Gịnị mere ekwensu ji mee ka i kwere izo ụfọdụ nꞌime ego i retara?
4
Mgbe a na-erebeghị ala ahụ, ala ahụ ọ̀ bụ nke onye? Ọ bụghị nke gị? Mgbe i rere ya ego i retara ọ̀ bụkwaghị nke gị, iji mee ihe ị chọrọ? Gịnị mere i ji mee ihe dị otu a? Ọ bụghị mmadụ ka ị ghọgburu, ọ bụ Chineke ka ị ghọrọ aghụghọ.”
5
Mgbe Ananayas nụrụ okwu ndị a, ọ dara nꞌala nwụọ. Ndị nile nụrụ ihe mere tụrụ egwu.
6
Ụmụ okorọbịa ndị nọ nꞌebe ahụ batara jiri akwa kee Ananayas bupụ ya, gaa lie ya.
7
Mgbe awa atọ gasịrị, Safaịra nwụnye Ananayas batara. Ọ matabeghị ihe ọ bụla banyere ihe mere di ya.
8
Mgbe ahụ Pita jụrụ ya sị, “Gwa m, ego ole ka unu rere ala ahụ?” Safaịra gwara na ọ bụ ihe ahụ di ya gwara ya.
9
Pita sịrị ya, “Gịnị mere gị na di gị ji gbakọọ izu ịkpasu Mmụọ Nsọ iwe? Gee ntị! Nzọ ụkwụ ị na-anụ bụ nzọ ụkwụ ụmụ okorọbịa liri di gị. Ha ga-ebupụkwa gị!”
10
Nꞌotu oge ahụ Safaịra dara nꞌihu Pita nwụọ. Ụmụ okorọbịa ahụ liri di ya batakwara buru ya pụọ gaa lie ya nꞌakụkụ ebe ha liri di ya.
11
Oke egwu tụrụ nzukọ Kraịst nile. Oke egwu tụkwara ndị nile nụrụ akụkọ ndị a.
12
Ndị ozi ahụ rụkwara ọrụ ebube na ọrụ ịtụnanya dị ukwuu nꞌetiti ndị mmadụ. Ndị kwere ekwe nile jiri otu obi zukọọ na mpaghara ụlọ nsọ ukwu Chineke a na-akpọ Mgbe ụlọ Solomọn.
13
Ndị ọzọ tụrụ egwu ịdịnyere ha. Ma ọtụtụ mmadụ kwuru okwu dị mma banyere ha.
14
Ọtụtụ ndị ọzọ, bụ ndị kwere nꞌOnyenwe anyị dịnyeere ha, nwoke na nwanyị.
15
Nꞌihi ọrụ ebube ndị ozi rụrụ, ọtụtụ bupụtara ndị enyi ha na ndị ikwu ha nꞌụzọ, bụ ndị ahụ na-esighị ike. Ha nyibere ha nꞌụte ma ọ bụ nꞌihe ndina ọzọ. Nzube ha bụ na ọ bụrụ na Pita agafee ha, onyinyo ya ga-eme ka ahụ dị ha mma.
16
Igwe mmadụ zukọrọ site nꞌobodo dị Jerusalem gburugburu. Ha butekwara ndị na-arịa ọrịa, na ndị mmụọ ọjọọ na-enye nsogbu. Ndị ozi mekwara ka ahụ dị ha mma.
17
Ihe ndị a nile mere ka onyeisi nchụaja na ndị enyi ya, na ndị Sadusii megharịa ahụ. Ha jupụtara nꞌiwe na ekworo.
18
Ha jidere ndị ozi a tinye ha nꞌụlọ mkpọrọ.
19
Ma nꞌabalị ahụ, Onyenwe anyị zitere mmụọ ozi ya. Mmụọ ozi ahụ meghere ụzọ ụlọ mkpọrọ ahụ, dupụta ndị ozi ahụ, gwa ha okwu sị,
20
“Gaanụ, guzonụ nꞌụlọ nsọ ụkwụ Chineke gwa ndi mmadụ ihe banyere ndụ ọhụrụ a!”
21
Ndị ozi ahụ pụrụ dị ka mmụọ ozi gwara ha. Nꞌisi ụtụtụ ha banyere nꞌụlọ nso ukwu Chineke bido izi ihe. Mgbe e mesịrị, onyeisi nchụaja na ndị enyi ya, batara nꞌụlọ nzukọ ha. Onyeisi nchụaja kpọrọ nzukọ ndị na-achị achị. Ndị bịara nzukọ a bụ ndị okenye ndị Juu, ndị na-anọchite anya ụmụ Izirel nile. Mgbe ha zukọrọ, onyeisi nchụaja ziri ndị uwe ojii ka ha gaa kpụta ndị ozi site nꞌụlọ mkpọrọ.
22
Ma ndị uwe ojii ahụ ahụghị ha nꞌụlọ mkpọrọ. Ha lọghachiri azụ kọọrọ onyeisi nchụaja ihe ha hụrụ. Ha gwara ha sị, “Anyị hụrụ na a kpọchiziri ụlọ mkpọrọ. Ndị nche guzokwa nꞌọnụ ụzọ. Ma mgbe anyị meghere ụzọ, o nweghị onye nọ nꞌime ụlọ ahụ!”
24
Mgbe onyeisi ndị agha na-eche ụlọ nsọ ukwu Chineke na ndị isi nchụaja nụrụ okwu ndị a, ọ gbara ha gharịị. Ha amaghị ihe ha ga-akpọ nke a.
25
Ma nꞌotu oge ahụ, otu onye batara gwa ha sị, “Lee! Ndị unu tinyere nꞌụlọ mkpọrọ guzo ugbu a nꞌụlọ nsọ ukwu Chineke na-ezi ụmụ mmadụ ihe!”
26
Otu mgbe ahụ, onyeisi agha na ndị agha ya gara nꞌụlọ nsọ ahụ. Ha jidere ndị ozi ahụ kpụta ha nꞌihu nzukọ ndị na-achị achị ahụ. Ma ha ejighị ike mee nke a. Nꞌihi na ha tụrụ egwu na ndị mmadụ ga-atụ ha nkume, ma ọ bụrụ na ha emesie ndị ozi ahụ ike.
27
Mgbe a kpụtara ha nꞌihu nzukọ ahụ onyeisi nchụaja bidoro ịjụ ha ajụjụ na-asị,
28
“Ọ bụ na m adọghị unu aka na ntị sị unu kwụsị izi onye ọ bụla ihe ọ bụla banyere aha a? Lee ihe unu mere ugbu a! Ozizi unu ejula Jerusalem! Unu chọkwara ka ndị mmadụ taa anyị ụta nꞌihi ọnwụ nwoke a!”
29
Ma Pita na ndị ozi ọzọ nọ nꞌebe ahụ sịrị, “Anyị enweghị ike ịhapụ ime ihe Chineke chọrọ. Anyị agaghị emekwa ihe mmadụ chọrọ.
30
Chineke nna nna anyị akpọlitela Jisọs site nꞌili. Ọ bụkwa otu Jisọs ahụ unu gburu site nꞌịkpọgbu ya nꞌelu obe.
31
Chineke ebuliela ya elu mee ya ka ọ nọdụ nꞌaka nri ya, ka ọ bụrụ Onyendu na Onye nzọpụta, iwetara Izirel nchegharị, na mgbaghara mmehie.
32
Anyị na-agbakwa ama na ihe ndị a bụ eziokwu. Otu a kwa, Mmụọ Nsọ, onye Chineke nyere ndị na-erubere ya isi, na-agbakwa ama.”
33
Mgbe ndị nọ na nzukọ ahụ nụrụ ihe ndị a, okwu a bara ha nꞌobi dị ka a ga-asị na e ji mma dụọ ha. Nke a mere ka ha jupụta nꞌọnụ ma. Ha kpebiri igbu ha.
34
Ma otu nwoke guzoro ọtọ nꞌime ha. Ọ bụ onye Farisii. Aha ya bụ Gamaliel. Ọ bụ onye ozizi iwu. Ọ bụkwa onye a maara ama na onye a na-asọpụrụ. Nwoke a nyere iwu ka a kpọpụ ndị ozi nꞌezi nwa oge nta.
35
Ọ gwara nzukọ ahụ okwu sị, “Ndị Izirel, jienụ onwe unu aka banyere ihe unu na-ezube ime ndị a!
36
Nꞌihi na ọ dịbeghị anya mgbe Teodas gosiri onwe ya kwuo na ọ bụ mmadụ pụrụ iche. Chetanụ na e gburu ya. Ndị nile na-eso ya ka e mere ka ha gbasasịa. Ihe nile banyere ya gwụsịrị.
37
“Mgbe e mesịrị, Judas onye Galili gosikwara onwe ya nꞌoge a na-agụ mmadụ ọnụ sị na ọ bụ mmadụ dị mkpa na mmadụ dịkwa ukwuu. O nwetakwara ndị sooro ya, ma ya onwe ya lakwara nꞌiyi. Otu a kwa, ndị nile sooro ya gbasasịrị.
38
“Ya mere, nke a bụ ndụmọdụ m na-enye unu taa. Hapụnụ ndị a ka ha laara onwe ha. Nꞌihi na ọ bụrụ na ọrụ ha bụ ọrụ mmadụ, mgbe na-adịghị anya ọ ga-emebi.
39
Ọ bụrụkwanụ na ọrụ ha bụ ọrụ Chineke, bụrụkwa nke ha na-arụ dị ka nzube ya si dị, unu enweghị ike ịkwatụ ya, ma ọ bụ ịkwụsị ya. Ọ bụrụ ọrụ Chineke ka unu na-agbalị ịkwụsị, unu ga-achọpụta na unu na-edo onwe unu imegide Chineke.”
40
Nzụkọ ahụ nabatara ndụmọdụ ya. Ha kpọrọ ndị ozi Kraịst ahụ tie ha ihe, nyekwa ha iwu ka ha kwụsị ikwu okwu nꞌaha Jisọs. Mgbe e mesịrị, ha hapụrụ ha ka ha laa.
41
Ma ndị ozi ahụ jiri ọṅụ hapụ nzukọ ahụ. Ha na-aṅụrị ọṅụ nꞌihi na Chineke nyere ha ugwu ịhụ ahụhụ ihere nꞌihi aha Jisọs.
42
Ụbọchị nile, nꞌụlọ nsọ ukwu Chineke, na nꞌụlọ ndị kwere ekwe dị iche iche, ndị ozi ahụ gara nꞌihu izi ihe na ikwusa ozi ọma Jisọs Kraịst.
← Chapter 4
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 6 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28