bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Acts 14
Acts 14
Igbo 1988
← Chapter 13
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 15 →
1
Nꞌobodo Aikoniọm, Pọl na Banabas banyekwara nꞌụlọ nzukọ ndị Juu, kwuo okwu Onyenwe anyị site nꞌike Mmụọ Nsọ. Ọtụtụ ndị Juu na ndị mba ọzọ chegharịkwara.
2
Ma ụfọdụ ndị Juu, ndị na-anabataghị okwu Chineke ahụ, kpalịrị ndị mba ọzọ ahụ, mee ka ha malite imegide Pọl na Banabas. Ha kwuru ọtụtụ ihe ọjọọ dị iche iche megide ha.
3
Otu ọ dị, Pọl na Banabas nọgidere nꞌebe ahụ ogologo oge. Ha na-ekwusakwa okwu Onyenwe anyị. Chineke gosikwara na ọ bụ okwu ya ka ha na-ekwu site nꞌinye ha ike ịrụ ọrụ ịrịba ama dị iche iche.
4
Ma igwe mmadụ na-ege Pọl na Banabas ntị kewara abụọ. Ụfọdụ nꞌime ha dịnyeere ndị Juu. Ụfọdụ dịnyeekwara Pọl na Banabas.
5
Ma mgbe Pọl na Banabas matara nzube ha, na ha na-achọ ịtụ ha nkume, ha hapụrụ obodo ahụ. Ndị ha chọrọ isite nꞌaka ha tụọ Pọl na Banabas nkume bụ ndị mba ọzọ, ha na ụfọdụ ndị Juu na ndị isi ha.
6
Ha gara nꞌobodo Laikonia, Listra, na Debi, na obodo nta ọzọ dị nꞌakụkụ ebe ahụ, na-ekwusakwa ozi ọma ahụ.
8
Ma mgbe ahụ ha nọ nꞌime obodo Listra, ha hụrụ otu nwoke dara ngwụrọ site nꞌoge a mụrụ ya. Nwoke a ejibeghị ụkwụ ya abụọ gaa ije mgbe ọ bụla.
9
O gere ntị mgbe Pọl na-ekwu okwu Chineke. Ma Pọl legidere ya anya hụ na ọ bụ nwoke nwere okwukwe nke a ga-eji mee ka ahụ dị ya ike.
10
Nꞌihi nke a, Pọl kpọrọ ya sị, “Bilie!” Mgbe ahụ nwoke a wuliiri elu nꞌụkwụ ya abụọ. Ọ malitere ịga ije.
11
Mgbe igwe mmadụ ahụ na-ege Pọl ntị hụrụ ihe Pọl mere, ha nile tiri mkpu nꞌasụsụ ha sị, “Ndị a bụ chi pụtara ìhè nꞌụdị mmadụ!”
12
Ha kpebiri nꞌetiti onwe ha na a ga-akpọ Banabas Jupita. Jupita bụ chị ndị Griik. Ha kpọkwara Pọl Mekuri, nꞌihi na ọ bụ Pọl na-ekwu okwu nile.
13
Mgbe ahụ, onye nchụaja Jupita, bụ chi nwere ụlọ nchụaja nꞌihu obodo ahụ, bupụtara igbe okoko osisi dị iche iche. Ọ kwadokwara iji chi ịchụ aja nye Pọl na Banabas nꞌọnụ ụzọ e si abata obodo ahụ, nꞌihu igwe mmadụ ahụ.
14
Mgbe Pọl na Banabas hụrụ ihe nile ha na-akwado ime, ha dọwara uwe ha, tie mkpu, jekwuru igwe mmadụ ahụ nile na-eti mkpu na-asị,
15
“Ndị ikom obodo a! gịnị ka unu na-achọ ime? Lee, anyị bụkwa mmadụ dị ka unu. Ọ bụ ozi ọma ka anyị wetaara unu. Anyị chọrọ ka unu site nꞌịsọpụrụ ihe ndị a na-abaghị uru, bụ nke unu na-efe site na-amaghị ama bịakwute Chineke dị ndụ. Ọ bụ Chineke kere eluigwe na ụwa, na oke osimiri na ihe nile dị nꞌime ha.
16
Nꞌoge gara aga ọ hapụrụ mmadụ nile ka ha sọọ isi nꞌụzọ nile nke aka ha.
17
Ma ọ nọkwa na-agba akaebe banyere onwe ya nꞌime ọgbọ nile, site nꞌọrụ ọma ya nile. Ọ na-enye unu mmiri ozuzo, na mkpụrụ nke ala nꞌoge ha. Ọ na-enyekwa unu nri nke na-eme ka obi na-atọ unu ụtọ.”
18
Otu ọ dị, ọ rara Pọl na Banabas ahụ igbochi igwe mmadụ ahụ ịchụrụ ha aja.
19
Ma mgbe ụbọchị ole na ole gasịrị, ndị Juu ụfọdụ bịara site nꞌAntiọk na Aikoniọm. Ha kwaliri obi igwe mmadụ ahụ ka ha gbuo Pọl. Nꞌihi ya, ha tụrụ Pọl nkume, dọkpụrụ ya gaa nꞌazụ obodo ahụ, hapụ ya nꞌọnọdụ ọdịndụọnwụkamma.
20
Ma mgbe ndị kwere ekwe gbakọrọ guzo ya gburugburu, o bilitere. Ọ laghachiri nꞌime obodo ahụ. Ma nꞌechi ya, ya na Banabas hapụrụ obodo ahụ gaa Debi.
21
Mgbe ha kwusịrị okwu Chineke nꞌebe ahụ, ha lọghachiri na Listra. Ma ọtụtụ mmadụ chegharịrị nꞌobodo Debi. Ha sitere Listra gaa obodo Aikoniọm.
22
Nꞌebe ahụ ha gbara ndị kwere ekwe ume ka ha na-eto eto nꞌịhụnanya nꞌebe Chineke na mmadụ ibe ha nọ. Ha kasịkwara ha obi sị ha jidesie eziokwu ahụ ike, na-agụghị nsogbu nile a na-esogbu ha. Ha mekwara ka ndị kwere ekwe mata na ha aghaghị ịba nꞌalaeze Chineke site nꞌime nsogbu dị iche iche.
23
Pọl na Banabas họpụtakwara ndị okenye nꞌime nzụkọ Kraịst dị nꞌebe ahụ. Ha sitere nꞌobubu ọnụ na ekpere tinye ha na nlekọta Onyenwe anyị, onye ha tụkwasịrị obi.
24
Mgbe ha mesịrị ihe ndị a, ha sitere obodo Pisidia laghachi obodo Pamfilia.
25
Ha zisakwara ozi ọma nke ugboro abụọ nꞌobodo Pega. Site nꞌebe ahụ ha jeruru Atalia.
26
Mgbe ha jezuru ebe ndị a nile, ha sooro ụgbọ mmiri jeruo Antiọk. Ọ bụkwa nꞌAntiọk ka ha malitere ije ha nile. Ọ bụ nꞌAntiọk ka e nyefere ha nꞌaka Chineke nꞌihi ije ozi ndị a. Ugbu a ha ejezuokwla ozi ha.
27
Mgbe ha bịaruru Antiọk, ha kpọkọtara ndị kwere ekwe nile kọwaara ha ihe banyere ije ha. Ha kọwaara ha otu Chineke si mee ka ozi ọma ya ruo ọtụtụ ndị mba ọzọ ntị.
28
Emesịa, ha na ndị kwere ekwe nọgidere nꞌAntiọk oge dị anya.
← Chapter 13
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 15 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28