bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Acts 4
Acts 4
Igbo 1988
← Chapter 3
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 5 →
1
Mgbe ha nọ na-agwa ndị mmadụ okwu, ndị nchụaja na ndị isi agha na-eche ụlọ nsọ ukwu ahụ, bịakwutere ha. Ụfọdụ ndị Sadusii sokwa ha bịa.
2
Ha were iwe nꞌihi na Pita na Jọn na-ezi ndị mmadụ ihe. Ha na-ezi ha na ndị nwụrụ anwụ ga-ebilie ọzọ. Ha ji mbilite nꞌọnwụ Jisọs na-ama atụ.
3
Ha jidere Pita na Jọn tinye ha nꞌụlọ mkpọrọ, ka ha nọdụ nꞌebe ahụ ruo nꞌechi ya. Nꞌihi na oge e jidere ha bụ nꞌoge anyasị.
4
Otu ọ dị, ndị nụrụ ihe ha kwuru kwenyere. Nꞌụbọchị ahụ ihe dị ka puku mmadụ ise kweere!
5
Nꞌụtụtụ echi ya, ndị na-achị achị, ndị okenye na ndị ozizi iwu,
6
na Anas onyeisi nchụaja, na Kaifas na Jọn na Alegzanda, na ndị ọzọ, bụ ndị ikwu onyeisi nchụaja, zukọtara na Jerusalem.
7
A kpọpụtara Pita na Jọn nꞌihu ha. Ha jụrụ ha ajụjụ sị, “Ọ bụ site nꞌike onye, na site nꞌaha onye, ka unu ji mee ihe ndị a?”
8
Nꞌoge ahụ, Pita jupụtara na Mmụọ Nsọ. Ọ gwara ha sị, “Unu ndị na-achị achị, na ndị okenye ala anyị.
9
Ọ bụrụ na unu kpọpụtara anyị ịchọpụta otu nwoke a si bụrụ onye ahụ dị mma,
10
aga m agwa unu. Ka ụmụ Izirel nile matakwa! A gwọrọ nwoke a guzo nꞌebe a site nꞌike Jisọs Kraịst onye Nazaret. Ọ bụkwa Jisọs ahụ unu kpọgidere nꞌobe, onye Chineke kpọlitere site nꞌọnwụ. Ọ bụ site nꞌike Jisọs Kraịst ka nwoke a ji guzo nꞌihu unu, dị ka onye ahụ zuru oke.
11
Jisọs dị ka nkume nke unu bụ ndị na-ewu ụlọ jụrụ. Ma ugbu a ọ ghọọla nkume dị mkpa nꞌụlọ ahụ.
12
O nweghị onye ọzọ pụrụ ịzọpụta anyị. Chineke ahọpụtakwaghị aha ọzọ nꞌụwa nile nye ụmụ mmadụ, nke a ga-esite na ya zọpụta anyị.”
13
Mgbe ha hụrụ na Pita na-ekwusi okwu ike, na-atụghị ụjọ, chọpụtakwa na ha bụ ndị na-amaghị akwụkwọ, ndị a na-azụghị nꞌụlọ akwụkwọ ndị Juu, ndị mmadụ efu, o juru ha anya! Ma mgbe ahụ ha chetara na ha bụ ndị ha na Jisọs yịkọrọ.
14
Ọzọ kwa, mgbe ha hụrụ nwoke ahụ a gwọrọ, ka o guzo nꞌihu ha, ha enweghị okwu ọ bụla ha nwere ikwu megide nke Pita kwuru.
15
Ihe ha mere bụ ịsị ha pụọ nꞌụlọ ikpe ahụ. Mgbe ha pụrụ, ha bidoro ịgba izu nꞌetiti onwe ha
16
na-asị, “Gịnị ka anyị ga-eme ndị a? Anyị apụghị ịgọ na ha rụrụ ọrụ ebube pụrụ iche. Ndị bi na Jerusalem anụlarị ihe banyere ọrụ a.
17
Kama ime ka akụkọ ọrụ ebube a hapụ ịgbasa ruo ọtụtụ mmadụ ntị, ka anyị dọọ ha aka na ntị sị ha kwụsị ịgwa onye ọ bụla okwu banyere nwoke a bụ Jisọs.”
18
Ha kpọrọ ha nye ha iwu sị ha kwụsị ikwu okwu, ma ọ bụ izi ihe nꞌaha Jisọs.
19
Ma Pita na Jọn sịrị, “Kpeenụ ikpe a nꞌọnwe unu. Ò ziri ezi nꞌanya Chineke irubere unu isi karịa irubere Chineke isi?
20
Nꞌuche anyị, ọ bụ ihe rara ahụ ịkwụsị ikwu okwu banyere ihe ahụ anyị hụrụ na nke anyị nụrụ!”
21
Ndị ikpe ahụ dọkwara ha aka na ntị ọzọ, hapụ ha ka ha laa, ebe ọ bụ na o nweghị iwu ọ bụla ha dara nke pụrụ iwetara ha ahụhụ. Otu ọ dị, ha hapụkwara ha nꞌihi na mmadụ nile na-ekele Chineke ekele nꞌihi ihe a mere.
22
Nwoke ahụ ha gwọrọ agafeela iri afọ anọ.
23
Mgbe a hapụrụ ha, ha lara kọọrọ ndị enyi ha ihe ndị nchụaja na ndị okenye gwara ha.
24
Mgbe ha nụrụ akụkọ a, ha nile jiri otu obi kpọkuo Chineke sị, “Onyenwe anyị, onye kere eluigwe na ụwa, na osimiri, na ihe nile dị nꞌime ha.
25
Ọ bụ gị mere ka Mmụọ Nsọ kwuo okwu site nꞌọnụ Devidi sị, ‘Gịnị mere mba nile ji na-agbọ ụfụfụ? Gịnị mere ha ji ezube nzube nzuzu imegide gị, Chineke?
26
Ndị eze nke ụwa ejikerela onwe ha. Ndị na-achị achị ezukọtakwala imegide Onyenwe anyị na onye ahụ ọ họpụtara.’
27
Nꞌihi na Herọd, na Pailet na ndị ụwa nile, na ndị Izirel ezukọtaala imegide Jisọs, Ohu gị dị nsọ, onye ị họpụtara ka ọ bụrụ Onye nzọpụta!
28
Ha zukọtara ime ihe i zubere kwadookwa na ha aghaghị ime.
29
Ugbu a Onyenwe anyị, lee ịba mba ha nile. Nyere ndị ozi gị aka ikwusa okwu gị na-atụghị ụjọ.
30
Nyere anyị aka site nꞌisetipụ aka gị ịgwọ ndị ọrịa, na ime ihe ịrịba ama na ịrụ ọrụ ebube site nꞌike Jisọs, Ohu gị dị nso.”
31
Mgbe ha kpesịrị ekpere, ụlọ ahụ ha zukọrọ nꞌime ya mara jijiji. Ha nile jupụtakwara na Mmụọ Nsọ. Ha gakwara nꞌihu ikwusa ozi ọma Chineke na-atụghị ụjọ.
32
Ndị nile kwere ekwe nwere otu obi. O nweghị onye ọ bụla gụrụ ihe ọ bụla o nwere dị ka nke aka ya. Kama ha mere ka ndị ọzọ keta oke nꞌihe ha nwere.
33
Ndị ozi Kraịst gara nꞌihu na-agba ama banyere mbilite nꞌọnwụ Onyenwe anyị Jisọs site nꞌike nile. Ngọzị Chineke dịnyeere ha.
34
O nweghị onye ihe kọrọ nꞌetiti ha. Nꞌihi na ndị nile nwere ala na ụlọ rere ha, wetakwa ego ha retara,
35
nye ya ndị ozi Kraịst. E kekwara ya ka onye ọ bụla keta dị ka mkpa ya si dị.
36
Josef, onye a na-akpọkwa Banabas, nke aha ya pụtara Nwa nkasịobi, onye agbụrụ Livayị, na onye obodo Saịpros, rere ala ya. O wetakwara ego o retara nye ndị ozi.
← Chapter 3
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 5 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28