bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Acts 25
Acts 25
Igbo 1988
← Chapter 24
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 26 →
1
Mgbe ụbọchị atọ gasịrị site nꞌoge Festọs bịaruru Sizaria, o mere njegharị ruo Jerusalem.
2
Nꞌebe ahụ ka ndị isi nchụaja na ndị isi ndị Juu nọ kọọrọ ya ihe nile ha maara banyere Pọl.
3
Ha rịọrọ Festọs ka ọ kpọta Pọl na Jerusalem. Nꞌihi na ha agbaala izu igbu ya nꞌụzọ.
4
Ma Festọs gwara ha sị, “Pọl nọ dị ka onye mkpọrọ na Sizaria. Ebe ahụ ka mụ onwe m ga-alaghachi na mgbe na-adịghị anya.
5
Dunyerenụ m ụfọdụ ndị isi unu ka ha bịa gbaa ya akaebe nꞌisi, ma ọ bụrụ na ọ dị ihe ọjọọ o mere.”
6
Mgbe ihe dị ka abalị asatọ ma ọ bụ abalị iri gasịrị, Festọs lọghachiri na Sizaria. Nꞌechi ya, o bidoro ikpe Pọl ikpe.
7
Mgbe e dupụtara Pọl, ndị Juu sitere Jerusalem bịa gbara ya gburugburu na-ekwu ọtụtụ ihe megide ya nke ha na-apụghị ịkọwa.
8
Ma Pọl gọọrọ onwe ya, na-asị, “Ọ dịghị ihe ọjọọ ọ bụla m mere megide iwu ndị Juu ma ọ bụ eze ndị Rom.”
9
Ma ebe Festọs chọrọ ka ya na ndị Juu dị na mma, ọ jụrụ Pọl sị, “Ị̀ ga-ejekwa Jerusalem ka m kpee gị ikpe nꞌebe ahụ?”
10
Ma Pọl zaghachiri ya, “Ọ dịghị! Eguzo m nꞌụlọ ikpe Siza nꞌonwe ya, ebe a ka e kwesịrị ikpe m ikpe. Ị maara nke ọma na aka m dị ọcha. Adaghị m iwu ndị Juu ma ọ bụ nke Siza.
11
Ọ bụrụ na ọ dị ihe m mere kwesịrị ọnwụ, akwadoro m ịnwụ. Ma ọ bụrụ na aka m dị ọcha, gị, ma ọ bụ onye ọ bụla ọzọ enweghị ike ịrara m nye nꞌaka ndị Juu ka ha gbuo m. Ana m akpọku Siza ka o lenye anya nꞌikpe m.”
12
Ya mere, mgbe Festọs na ndị na-adụ ya ọdụ gbara izu, ọ gwara Pọl sị, “Ị chọrọ ka Siza lenye anya nꞌikpe gị, ọ dị mma, ị ga-ahụkwa Siza.”
13
Mgbe ụbọchị ole na ole gasịrị, eze Agripa na nwụnye ya Benaisị bịara ileta Festọs.
14
Mgbe ha nọrọ ọtụtụ ụbọchị, Festọs kọwaara eze a ọnọdụ Pọl sị, “Ọ dị nwoke Feliks hapụrụ nꞌụlọ mkpọrọ nꞌebe a.
15
Mgbe m gara Jerusalem, ndị isi nchụaja na ndị isi ndị Juu gwara m ihe ha maara banyere nwoke a. Ha rịọkwara m ka e gbuo ya.
16
Ma emere m ka ha ghọta na o megidere iwu ndị Rom ịma onye ọ bụla ikpe tupuu e kpee ya ikpe nyekwa ya ohere ịgọrọ onwe ya nꞌihu ndị na-ekpe ya ikpe.
17
“Mgbe ha bịara ebe a nꞌihi ikpe a, akpọrọ m ikpe a mgbe chi ụbọchị ahụ bọrọ, nyekwa iwu ka a kpọbata Pọl.
18
Ma ihe nile ha kwuru megide Pọl abụghị ihe mụ onwe m lere anya ịnụ nꞌọnụ ha. O nweghị ihe ọjọọ ọ bụla ha kwuru megide ya.
19
Okwu ha nile bụ ịrụ ụka banyere okpukpe ndị Juu, na banyere otu onye ọzọ a na-akpọ Jisọs onye nwụrụ, onye Pọl na-ekwusikwa ike na ọ dị ndụ.
20
Ọ rara m ahụ imedo okwu dị otu a. Nꞌihi ya ajụrụ m Pọl ma ọ ga-esoro m gaa nꞌụlọ ikpe dị na Jerusalem ka ọ nọdụ nꞌebe ahụ gọrọ onwe ya.
21
Ma Pọl bugaara Siza ikpe ya. Ya mere, ezighachiri m ya nꞌụlọ mkpọrọ tutuu ruo mgbe m jikeere izigara ya Siza.”
22
Agripa gwara Festọs sị, “Achọrọ m ịnụ okwu site nꞌọnụ nwoke a nꞌonwe ya.” Festọs zaghachiri ya, “Ị ga-anụ ya echi.”
23
Ya mere, nꞌechi ya, Agripa na Benaisị rutere nꞌụlọ ikpe nꞌoke nganga. Ọtụtụ ndị isi agha na ndị a maara aha ha nꞌobodo a sooro ha. A kpọbatakwara Pọl.
24
Mgbe ahụ ka Festọs kwuru okwu sị, “Eze Agripa na ndị nile soro ya nọkọọ. Nke a bụ nwoke ahụ ndị Juu bi nꞌobodo a na ndị Juu bi na Jerusalem na-achọsi ọnwụ ya ike.
25
Ma achọpụtaghị m ihe ọjọọ o mere nke kwesịrị ka ọ nwụọ. Ma ebe ọ rịọrọ ka Siza lenye ikpe ya anya, ekpebiri m iziga ya.
26
Ma enweghị m ihe ọ bụla doro anya m ga-edegara Siza banyere ya. Ya mere m jiri kpọpụta ya nꞌihu unu nile. Karịsịa nꞌihu gị onwe gị eze Agripa ka i lee anya nꞌime okwu a gwa m ihe m ga-edere Siza.
27
Nꞌihi na ọ bụ ihe na-ezighị ezi na m ga-ezipụrụ Siza onye mkpọrọ na-egosighị iwu ji ya.”
← Chapter 24
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 26 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28