bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Acts 21
Acts 21
Igbo 1988
← Chapter 20
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 22 →
1
Mgbe anyị hapụsịrị ha, anyị nyapụrụ ụgbọ anyị bịaruo Kos. Mgbe chi bọrọ, anyị rutere Rods. Anyị sitere nꞌebe ahụ jeruo Patara.
2
Nꞌebe ahụ, anyị banyere ụgbọ mmiri na-aga Siria na akụkụ obodo ndị Fonisia.
3
Anyị rutere ebe anyị nọ nwee ike ịhụ Saiprọs, ma anyị hapụrụ ịga Saiprọs chee ihu nꞌụzọ Siria, tutuu anyị erute nꞌọnụ mmiri Taịa nꞌime Siria. Ebe a ka e bupụsịrị ibu nile dị nꞌụgbọ ahụ.
4
Anyị banyere nꞌime obodo Taịa, hụ ndị kwere ekwe, nọnyere ha otu izu ụka. Ma ụmụ Chineke a dọrọ Pọl aka na ntị dị ka Mmụọ Nsọ Chineke kpugheere ha ka ọ ghara ịga Jerusalem.
5
Ma mgbe otu izu ụka ahụ gasịrị, anyị lọghachiri nꞌụgbọ ahụ, ma ọ bụ ndị inyom na ụmụntakịrị dupụtara anyị nꞌọnụ mmiri ahụ. Anyị kpere ekpere kelee onwe anyị ekele ikpeazụ.
6
Emesia, anyị banyere nꞌime ụgbọ, ma ha laghachiri azụ nꞌụlọ ha.
7
Mgbe anyị hapụrụ Taịa, anyị kwụsịrị na Tolomas. Nꞌebe a anyị kelekwara ndị kwere ekwe nọ nꞌime obodo a, nọnyere ha nanị otu ụbọchị.
8
Nꞌụbọchị nke ọzọ ya, anyị gara nꞌihu nꞌije anyị rute Sizaria. Nꞌebe ahụ anyị nọnyeere otu nwanna anyị a na-akpọ Filip onye na-agbasa ozi ọma. Ọ bụ otu nꞌime mmadụ asaa ahụ a họpụtara maka ije ozi na Jerusalem.
9
Nwoke a mụtara ụmụ agbọghọ anọ ndị na-alụbeghị di. Ha nwekwara onyinye ibu amụma.
10
Mgbe anyị nọrọ ọtụtụ ụbọchị, otu nwoke a na-akpọ Agabọs onye nwekwara onyinye ibu amụma, sitere Judia bata.
11
Ọ bịara ileta anyị. Ma ọ chịlitere belịtị Pọl na-eke nꞌukwu kee onwe ya nꞌụkwụ na aka sị, “Dị ka Mmụọ Nsọ kwuru, otu a ka ndị Juu ga-eke onye nwe ihe a agbụ na Jerusalem. Ha ga-ararakwa ya nye nꞌaka ndị Rom.”
12
Mgbe mmadụ nile nụrụ nke a, ndị kwere ekwe bi na Sizeria na ndị ya na ha so na-ejegharị rịọrọ Pọl ka ọ kwụsị ịga Jerusalem.
13
Ma Pọl jụru ha ajụjụ sị, “Gịnị mere unu ji na-akwa akwa? Unu na-eme ka obi gbawaa m! Nꞌihi na ọ bụghị nanị na m jikeere ịghọ onye mkpọrọ na Jerusalem, kama ejikeere m iwere ndụ m nye nꞌihi Jisọs.”
14
Mgbe mmadụ nile hụrụ na o kpebiela nꞌobi ya ịga Jerusalem, anyị kwụsịrị igbochi ya. Kama anyị nile sịrị, “Ka e mee uche Onyenwe anyị.”
15
Ya mere, mgbe nwa oge nta gafere anyị chịkọtara ihe anyị bilie iga Jerusalem.
16
Ụfọdụ ndị kwere ekwe bi na Sizaria sooro anyị, duru anyị rute nꞌụlọ Mnasin, onye anyị ga-anọ nꞌụlọ ya. Mnasin onye Saiprọs bụ otu nꞌime ndị mbụ kweere na Jisọs. Ọ nabatara anyị nke ọma.
17
Ndị nile kwere ekwe bi na Jerusalem jikwa obi ụtọ nabata anyị.
18
Nꞌụbọchị nke abụọ, Pọl duuru anyị mee ka anyị zute Jemes, na ndị okenye nzukọ Kraịst nọ na Jerusalem.
19
Mgbe anyị keletasịrị ekele, Pọl kọọrọ ha ọtụtụ akụkọ, banyere ihe Chineke jiri ya rụọ nꞌetiti ndị mba ọzọ.
20
Mgbe ha nụchara ihe o kwuru ha nyere Chineke otuto. Emesịa, ha gwara Pọl sị, “Ị maara nwanna anyị na ọtụtụ ndị kwere ekwe. Ma ha nile nọgidere na-asị na ndị Juu kwere ekwe aghaghị ịnọgide na mmemme na omenala ndị Juu.
21
Ndị Juu kwere ekwe nọ nꞌebe a enweela uche abụọ banyere gị. Ha nụrụ na ị na-ezi ndị Juu bi na mba ọzọ sị ha hapụ ịgbasokwa iwu Mosisi, na ka ha kwụsịkwa ibi ụmụ ha ugwu dị ka omenala ndị Juu si dị.
22
Gịnị ka anyị ga-eme ugbu a? O doro anya na ha ga-amata na ị bịara.
23
“Ntụpụta anyị bụ ka ị kpọrọ mmadụ anọ ndị a kwere Chineke nkwa.
24
Soro ha gaa nꞌụlọ nsọ ukwu Chineke, sorokwa ha kpụchaa isi gị. Kwụọkwara ha ụgwọ ịchụ aja ịdị ọcha ha, ka ha kpụchaakwa isi ha. Ọ bụrụ na i mee nke a, ọ ga-edo onye ọ bụla anya na okwu nile e kwuru megide gị abụghị eziokwu. Ha ga-ahụkwa na gị onwe gị na-erube isi nꞌiwu Mosisi, na i sokwa anyị nwee otu uche banyere ya.
25
Ma nꞌebe ndị mba ọzọ kwere ekwe nọ, iwu na omenala ndị Juu agbasaghị ha. Anyị edegarala ha akwụkwọ gwa ka kwụsị iri ihe ọ bụla a chụrụ nꞌịta nye arụsị na iri ọbara, ma ọ bụ anụ a nyagburu anyagbu, ya na ịkwa iko.”
26
Pọl nabatara atụmatụ ha. Nꞌụbọchị nke ọzọ ya ọ kpọọrọ mmadụ anọ ndị ahụ banye nꞌụlọ nsọ ukwu ahụ, maka mmemme ịdị ọcha. Emesịa, ọ gara nꞌụlọ nsọ ukwu ahụ kwupụta abalị ole ọ ga-abụ mmemme ịdị ọcha ha agwụchaa, na oge ịchụ aja ha nꞌotu nꞌotu ga-abụ.
27
Ma mgbe ọ fọdụrụ nwa oge nta ka ụbọchị asaa ahụ gwụchaa, ụfọdụ ndị Juu si akụkụ Tọki bịa hụrụ Pọl nꞌụlọ nso ukwu ahụ. Ha tikuru igwe mmadụ megide ya, jidekwa ya.
28
Ha na-eti mkpu na-asị, “Ndị ikom Izirel, nyenụ aka! Onye a bụ nwoke ahụ na-ejegharị nꞌebe nile na-ezi ozizi megidere ndị anyị. Ọ na-ezikwa ozizi megidere iwu Mosisi na ụlọ nsọ ukwu a. Ma ugbu a o merụọkwala ụlọ nsọ a site nꞌịkpọbata ndị mba ọzọ nꞌime ya.”
29
Ha kwuru nke a nꞌihi na ha hụrụ Pọl na Trofimọs onye Efesọs, bụ onye a na-ebighị ugwu nꞌime obodo Jerusalem. Ha chere na Pọl kpọbatara ya nꞌụlọ nsọ ukwu ahụ.
30
Ọgba aghara jupụtara nꞌobodo ahụ nile nꞌihi ama ụgha a. Oke mkpọtụ sooro ya. Ndị mmadụ gbakọtara dọkpụpụta Pọl site nꞌụlọ nsọ ukwu ahụ. Nꞌotu mgbe ahụ, ha mechiri ọnụ ụzọ ụlọ nsọ ukwu ahụ.
31
Igwe mmadụ ahụ na-achọ ụzọ ha ga-esi gbuo Pọl mgbe ozi ruru ọchịagha ndị Rom ntị na Jerusalem nile nọ nꞌaghara.
32
Otu mgbe ahụ ọchịagha ahụ duuru ụfọdụ ndị isi agha ya na ndị agha ya mee ngwangwa bịaruo nꞌebe igwe mmadụ ahụ nọ. Mgbe igwe mmadụ ahụ hụrụ ndị agha ka ha na-abịa, ha kwụsịrị iti Pọl ihe.
33
Ọchịagha ahụ jidere Pọl, nye ndị agha ya ike ka ha kee ya agbụ nke ọma. Mgbe ahụ ọ jụrụ ajụjụ sị, “Onye bụ nwoke a? Gịnị ka o mere?”
34
Ụfọdụ na-eti otu ihe, ma ụfọdụ na-eti ihe ọzọ. Mgbe ọchịagha na-apụghị ịchọpụta ihe bụ isi mkpọtụ na aghara ahụ, o nyere iwu ka e duru Pọl gaa nꞌogige ndị agha.
35
Mgbe ha na-eru nꞌụlọ elu ahụ, igwe mmadụ ahụ gbalịrị nke ukwuu igbu Pọl, ma ndị agha ahụ buuru ya tụkwasị ya nꞌubu ha, gbochie ihe ọjọọ ahụ.
36
Igwe mmadụ ahụ so ha nọ na-eti mkpu na-asị, “Wepụnụ ndụ ya! Wepụnụ ndụ ya!”
37
Mgbe ha chọrọ iduba Pọl nꞌime ogige ahụ, ọ gwara ọchịagha ahụ okwu sị, “Ì nwere ike inye m ohere nta ịgwa gị okwu?”
38
“Ị̀ maara asụ asụsụ ndị Griik?” Ka ọchịagha ahụ jụrụ ya. “Ị̀ bụghị onye Ijipti ahụ bidoro ọgba aghara afọ ole na ole gara aga. Onye duuru puku ndị ogbu mmadụ anọ gbalaa nꞌozara?”
39
“É,è!” ka Pọl zaghachiri. “Abụ m onye Juu si Tasọs, obodo dị na Silisia, nke bụ oke obodo. Biko ka m gwa ndị a okwu ntakịrị.”
40
Ọchịagha ahụ nyere ya ike. Ya mere, Pọl guzoro nꞌọnụ ụzọ ahụ fee aka ya ime ka ha nọọ duu. Mgbe ha nọdụrụ nwayọọ, Pọl gwara ha okwu nꞌasụsụ Hiburu sị,
← Chapter 20
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 22 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28