bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Acts 8
Acts 8
Igbo 1988
← Chapter 7
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 9 →
1
Sọl kwenyere ka e gbuo Stivin. Nꞌụbọchị ahụ, oke mkpagbu bidoro megide nzukọ Kraịst dị na Jerusalem. Mkpagbu a mere ka ndị kwere ekwe site na Jerusalem gbapụ. Ha gbaara ọsọ gbaga obodo ndị ọzọ dị iche iche dị na Judia na Sameria. Ọ bụkwa nanị ndị ozi Kraịst fọdụrụ na Jerusalem.
2
Ma ndị Juu ụfọdụ, ndị na-atụ egwu Chineke, bịara buru ozu Stivin, gaa lie ya. Ha kwara akwa nke ukwuu nꞌihi ya.
3
Ma Sọl bidoro ịla nzukọ Kraịst nꞌiyi. Ọ banyere nꞌụlọ ndị kwere ekwe dọpụta ha, nwoke na nwanyị, tinye ha nꞌụlọ mkpọrọ.
4
Ma ndị kwere ekwe ahụ, ndị sitere Jerusalem gbapụ, jegharịrị na-ekwusa ozi ọma Jisọs.
5
Onye dị ka Filip gara nꞌotu obodo dị na Sameria kọọrọ ndị nọ nꞌebe ahụ ihe banyere Kraịst.
6
Igwe mmadụ gere ntị nꞌihe ọ na-ekwu nꞌihi na ha hụrụ ọrụ ebube ọ rụrụ.
7
Nꞌihi na site nꞌọrụ ebube ndị a, mmụọ ọjọọ pụrụ site na ndụ ndị ụfọdụ. Mmụọ ọjọọ a pụtara na-eti mkpu. Ọtụtụ ndị ahụ ha kpọnwụrụ akpọnwụ ka Filip gwọkwara. Ụfọdụ ndị ngwụrọ ka ọ gwọkwara.
8
Nꞌihi ya, ọṅụ dị ukwuu jupụtara nꞌobodo ahụ.
9
Ma o nwere otu nwoke bi nꞌobodo ahụ a na-akpọ Saimọn. Tupuu Filip abịa, Saimọn na-arụ ọrụ ịtụnanya dị iche iche site nꞌike ọgwụ e kere eke. Nꞌihi ihe ndị a ọ na-eme, ọ na-akpọ onwe ya mmadụ dị mkpa.
10
Onye ọ bụla na Sameria, onye ukwu na onye nta, na-ege ya ntị. Ha na-asị na ọ bụ ike Chineke a na-akpọ Ike dị ukwuu.
11
Ha na-eso ya nꞌihi na ọrụ ya na-eju ha anya.
12
Ma mgbe Filip kwusasịrị ozi ọma, ha kweere na Jisọs, na ọ bụ Onye nzọpụta. Ha kwekwara ihe nile Filip kwuru banyere alaeze Chineke. E mere ọtụtụ nꞌime ha baptizim, nwoke na nwanyị ha.
13
Saimọn kwekwaara otu aka ahụ. E mekwara ya baptizim. O bidoro iso Filip nꞌihi na ọrụ ebube nile Filip rụrụ tụrụ ya nꞌanya nke ukwuu.
14
Mgbe ndị ozi nọ na Jerusalem nụrụ na ndị Sameria anabatala ozi ọma Chineke, ha zipụrụ Pita na Jọn ka ha gaa hụ ihe na-eme nꞌebe ahụ.
15
Mgbe ha bịaruru, ha bidoro ikpe ekpere ka ndị a kwere ekwe nata Mmụọ Nsọ.
16
Nꞌihi na tutuu ruo ugbu a, ha anatabeghị Mmụọ Nsọ. Ọ bụ nanị baptizim ka e mere ha baa nꞌaha Onyenwe anyị Jisọs.
17
Mgbe Pita na Jọn bikwasịrị ndị a kwere ekwe aka nꞌisi, ha natara Mmụọ Nsọ.
18
Mgbe Saimọn hụrụ na ndị a natara Mmụọ Nsọ nanị site nꞌaka ndị ozi bikwasịrị ha nꞌisi, o chere ha ego nꞌihu, rịọ ha sị,
19
“Werenụ ego a, nyekwanụ m ike a. Ka onye ọ bụla m bikwasịrị aka nꞌisi nata Mmụọ Nsọ.”
20
Ma Pita baara ya mba sị, “Gị na ego gị laakwa nꞌiyi! Ì si aṅaa chee na ị pụrụ iji ego zụta onyinye Chineke?
21
I nweghị oke nꞌọrụ a, nꞌihi na obi gị adịghị ọcha nꞌihu Chineke.
22
Si nꞌajọ omume gị tụgharịa, kpeekwa ekpere. Ma eleghị anya Chineke ga-agbaghara gị echiche ọjọọ gị nile.
23
Nꞌihi na ahụrụ m na ekworo na mmehie jupụtara gị nꞌobi.”
24
Saimọn rịọrọ Pita sị ya, “Biko, kpee ekpere rịọrọ m Chineke, ka ihe ndị a nile i kwuru, hapụ ịbịakwasị m.”
25
Mgbe Pita na Jọn rụsịrị ọrụ ịgwa ndị ọzọ banyere Kraịst, na ikwusa okwu Onyenwe anyị, ha lọghachiri Jerusalem. Ma mgbe ha na-ala nꞌụzọ, ha kwụsịrị nꞌọtụtụ obodo nta nke Sameria ikwusa ozi ọma ahụ.
26
Mgbe ahụ mmụọ ozi Onyenwe anyị gwara Filip okwu sị, “Bilie, gaa nꞌụzọ ahụ sitere Jerusalem na-aga Gaza, ya bụ, ụzọ ọzara.”
27
Filip biliri gaa nꞌụzọ ahụ. Mgbe ọ nọ nꞌụzọ ahụ, ọ hụrụ otu nwoke onye Etiopia. Ọ bụ ọnozi nke nwere ike dị ukwuu nꞌụlọ ya. Ọ bụ onye na-eche akụ Kandis, eze nwanyị ndị Etiopia. Nwoke a si Jerusalem ebe ọ gara ife Chineke na-alọghachi Etiopia.
28
Mgbe ọ na-ala, ọ nọdụrụ ala nꞌụgbọ ala ya, nke inyinya na-adọkpụ, na-agụ akwụkwọ Aịzaya onye amụma dere.
29
Mmụọ Nsọ gwara Filip okwu sị, “Gaa nso, nọọkwa ụgbọ ahụ nso.”
30
Filip gara nso, nụkwa ka nwoke ahụ na-agụ ihe Aịzaya dere. Ọ jụrụ nwoke ahụ ajụjụ sị, “Ị na-aghọta ihe ị na-agụ?”
31
Nwoke a zara Filip sị, “M ga-esi aṅaa ghọta, ma mmadụ ezighị m?” Ọ rịọrọ Filip ka ọ rigota nꞌụgbọ ala ahụ, soro ya nọdụ nꞌime ya.
32
Mpaghara akwụkwọ nsọ nwoke a na-agụ bụ nke a, “E duuru ya dị ka atụrụ gaa nꞌebe a ga-egbu ya. Dị ka atụrụ si emechi ọnụ ya, o megheghị ọnụ ya.
33
“Nꞌọnọdụ ịdị ala ya, e meghị ka ikpe ziri ezi ruo ya aka. Ònye pụrụ ịkọ akụkọ ajọ omume nke ndị bi nꞌọgbọ ya? Nꞌihi na e sitere nꞌụwa wepụ ndụ ya.”
34
Ọnozi ahụ jụrụ Filip ajụjụ sị, “Biko gwa m, onye ka onye amụma a na-ekwu okwu ya? Ọ̀ bụ ihe banyere onwe ya ka ọ na-ekwu, ka ọ bụ banyere onye ọzọ?”
35
Mgbe ahụ Filip sitere nꞌakụkụ akwụkwọ nsọ ahụ nwoke ahụ na-agụ kọọrọ ya akụkọ ozi ọma Jisọs.
36
Mgbe ha na-aga nꞌụzọ, ha bịaruru ebe ọdọ mmiri nta dị. Ọnozi ahụ gwara Filip okwu sị, “Lee! Nke a bụ mmiri. Ọ dị ihe ga-egbochi ime m baptizim?”
37
Filip zara sị ya, “E nwere ike ime gị baptizim ugbu a, ma ọ bụrụ na i jiri obi gị nile kwere.” Ọnozi ahụ sịrị ya, “Ekweere m na Jisọs Kraịst Ọkpara Chineke.”
38
Ọnozi a kwụsịrị ụgbọ ala ahụ. Ya na Filip wụdatara banye nꞌime mmiri nta ahụ. Filip mekwara ya baptizim.
39
Mgbe ha sitere nꞌime mmiri ahụ pụta, Onyenwe anyị sitere nꞌebe ahụ wepụ Filip. Ọnozi ahụ ahụkwaghị ya anya ọzọ. Ma ọ lara nꞌụlọ ya nꞌọṅụ.
40
Ebe ọzọ a hụrụ Filip bụ nꞌAzọtus! Ebe ahụ, ọ na-ekwusa ozi ọma. Site nꞌAzọtus, o kwusara ozi ọma site nꞌobodo ruo nꞌobodo tutuu ruo Sizaria.
← Chapter 7
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 9 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28