bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Acts 27
Acts 27
Igbo 1988
← Chapter 26
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 28 →
1
E mere njikere ikpeazụ banyere iji ụgbọ mmiri gaa Rom. Ya mere, e mere ka Pọl na ndị mkpọrọ ọzọ nwee onye ga-elekọta ha. Aha ya bụ Juliọs. Ọ bụ ọchịagha so nꞌotu ndị agha pụrụ iche eze nwere.
2
Anyị banyere ụgbọ mpempe nke na-akwụsị nꞌọnụ mmiri Tọki ọ bụla. Aristakọs onye Griik nke Tesalonaịka sokwa anyị nꞌije a.
3
Nꞌechi ya, anyị rutere Saidọn. Juliọs nwere obi ọma nꞌebe Pọl nọ. Ọ ha-pụkwara ya ka o jegharịara onwe ya izute ndị enyi ya. Ndị a lekwara anyị ezi ọbịa.
4
Ịgakwa nꞌihu na mmiri ahụ, anyị zutere ifufe mmiri nke mere ka ije anyị jupụta na nsogbu. Nꞌihi ya, anyị gara ala Saiprọs nso.
5
Anyị gafere ọnụ mmiri obodo Silisia na Pamfilia. Anyị bịaruru Mira nꞌime obodo Lisia.
6
Nꞌebe ahụ ka onye na-edu anyị kpọgharịrị anyị nꞌụgbọ ndị Ijipti na-aga Itali.
7
Anyị nwere ọtụtụ ụbọchị nke na-enyeghị anyị ahụ udo. Nꞌoge anyị na-erute nso Snidus, oke ifufe bidoro ifesi ike. Anyị enwekwaghị ike ịga nꞌihu nꞌụzọ ahụ. Nꞌihi ya anyị chigharịrị ihu site ụzọ ọnụ mmiri Salmone.
8
Anyị jikwa nwayọọ na-agba nꞌakụkụ ọnụ mmiri tutuu ruo mgbe anyị sitere nꞌoke nsogbu rute ebe a na-akpọ Ọnụ Mmiri Ọma nke dị nso na Lasia.
9
Ebe a ka anyị nọrọ ọtụtụ ụbọchị. Ma ihu eluigwe adịghị mma inye mmadụ nkasịobi ịnyalị ụgbọ ije ebe dị anya nꞌihi na ugbu a oge ịchụ aja ngabiga agafeela. Pọl gwara ndị isi ụgbọ ahụ okwu sị,
10
“Ndị nwe m, ahụrụ m na anyị ga-enwe nsogbu ma ọ bụrụ na anyị agaa nꞌihu. Eleghị anya ụgbọ mmiri anyị ga-ekpu, ma ọ bụ ibu nile ga-efu, ma ọ bụ na anyị ga-enwe mmerụ ahụ, ma ọ bụ na ọnwụ ga-adị.”
11
Ma ndị isi na-achị ndị mkpọrọ ahụ aṅaghị Pọl ntị, kama ha ṅara ntị nꞌihe onyeisi ụgbọ ahụ na onye nwe ụgbọ ahụ kwuru karịa ihe Pọl kwuru.
12
Ma Ọnụ Mmiri Ọma abụghị ọnụ mmiri dị ezi mma, ebe kwesịrị ekwesị ịnọdụ nꞌoge oyi. Nꞌihi ya ndị na-eso ụgbọ ahụ họọrọ ịga nꞌihu ịgbalị iru Fonikisi ka ha nọdụ nꞌebe ahụ nꞌoge oyi. Ọnụ mmiri Fonikisi dị ezi mma. Ọ na-enwe ezi ikuku nke na-esi nꞌugwu na ndịda.
13
Mgbe ha nọ na-atụle ihe ndị a, ikuku dị nwayọọ bidoro ifegharị site na ndịda. Nke a mere ka ha chee na ụbọchị ahụ ga-adị mma. Nꞌihi ya ha kwọpụrụ ụgbọ, nyara ya na-aga nso nso ọnụ mmiri.
14
Ma ọ dịghị anya ihu eluigwe gbanwere, oke ifufe bidoro na-efe. O buuru ụgbọ mmiri anyị buba ya nꞌosimiri.
15
Ndị na-anya ụgbọ ahụ gbalịsịrị ike na mbụ ichigharị ihu ụgbọ ahụ ka ọ gaa nꞌọnụ mmiri, ma ọ pụghị ime. Ha hapụrụ ụgbọ ahụ ka o soro ikuku.
16
Nꞌikpeazụ, anyị kwọọrọ ụgbọ anyị gaa nꞌazụ agwa etiti nta a na-akpọ Klauda. Nꞌebe ahụ anyị jisiri ike kekwasị ụgbọ nta nke ụgbọ mmiri anyị na-adọkpụ nꞌazụ nꞌelu ụgbọ mmiri ahụ.
17
Emesịa anyị jiri ụdọ kee ụgbọ mmiri ahụ ime ka o sie ike karịa. Ndị na-anya ụgbọ ahụ tụrụ egwu na ikuku ga-eburu ụgbọ anyị gaa nꞌọnụ mmiri na-achị ọkụ nke dị nꞌAfrika. Ha wedatara akwa e kobere nꞌelu, nke na-enyere ikuku aka ibu ụgbọ mmiri. Emesịa, ha sooro ikuku mmiri ahụ na-aga.
18
Mgbe chi echi bọrọ, dị ka osimiri ahụ na-etonye etonye, ndị na-eso ụgbọ bidoro ịtụdasị ngwongwo dị nꞌụgbọ ahụ nꞌime osimiri.
19
Nꞌechi ya kwa ha tụbakwara ngwongwo e ji edozi ụgbọ mmiri na ọtụtụ ihe ọ bụla nke nke aka ha ghọtara nꞌime osimiri.
20
Oke ifufe ọjọọ ahụ magharịrị ọtụtụ ụbọchị na-enweghị nkwụsị. Eluigwe hujiri ehuji, anyị ahụkwaghị anwụ ma ọ bụ kpakpando ọ bụla anya tutuu ruo nꞌikpeazụ olileanya anyị nile gwụsịrị.
21
Nꞌoge a nile o nweghị onye ọ bụla nri ọ bụla bara ọnụ. Ma nꞌikpeazụ, Pọl kpọrọ ndị na-eso ụgbọ ahụ sị ha, “Ndị iko m ibe m, ọ bụrụ na unu gere ntị nꞌokwu m na mbụ anyị agaraghị ahapụ Ọnụ mmiri ọma. Anyị gaara agbanarị oke nsogbu an ntụfu ndị a nile.
22
Ma otu ọ dị, ana m arịọ unu, nweenụ obi ike! Nꞌihi na o nweghị onye ọ bụla nꞌime anyị a ga-achọ achọ. Ọ bụ ezie na ụgbọ a ga-emikpu.
23
“Nꞌihi na nꞌabalị gara aga mmụọ ozi Chineke Onyenwe m, na onye m na-efekwa bịakwutere m,
24
gwa m sị, ‘Atụla egwu Pọl, nꞌihi na ị ghaghị iguzo nꞌihu Siza. Nke ọzọ kwa Chineke anụla arịrịọ gị, ọ ga-anapụta ndụ ndị a nile gị na ha so site nꞌaka ọnwụ mberede.’
25
Ya mere, nweenụ obi ike! Nꞌihi na enwere m ntụkwasị obi na Chineke ga-eme ihe o kwuru.
26
Ma a ga-eburu ụgbọ mmiri anyị buba ya nꞌotu agwa etiti.”
27
Ihe dị ka nꞌetiti abalị nꞌụbọchị nke iri na anọ ebili mmiri a, mgbe anyị na-erugharị nꞌosimiri a na-akpọ Adratik, ndị na-anya ụgbọ chere na ala dị nso.
28
Ha tụnyere ụdọ e kenyere igwe nꞌọnụ ya nꞌime osimiri chọpụta na omimi osimiri ahụ dị narị nzọ ụkwụ na iri abụọ nꞌebe ahụ ha nọ. Ha jekwara nꞌihu tụọkwa ụdọ ahụ ọzọ chọpụta na omimi osimiri ahụ dị iri nzọ ụkwụ toolu.
29
Ha matara nꞌoge a na ebili mmiri ahụ ga-eburu anyị gaa nꞌọnụ mmiri. Ma egwu juru ha obi nꞌihi na ha amaghị ma ha ga-ezute nkume nꞌakụkụ ọnụ mmiri ahụ. Ha tụpụtara ụdọ igwe anọ e ji ejide ụgbọ ma na-arịọ chi ha maka chi ọbụbọ.
30
Ụfọdụ nꞌime ndị na-eso ụgbọ ahụ kpebiri ịhapụ ya. Ha weturu ụgbọ mpempe e dobere maka ihe mberede, mee dị ka ha na-aga itinye ụdọ igwe nꞌọnụ mmiri ahụ.
31
Ma Pọl ghọtara nzube ha, gwa ndị agha na ọchịagha ha okwu sị, “Unu nile ga-anwụ ma ọ bụrụ na ndị a na-anya ụgbọ a ahapụ ugbu a.”
32
Nꞌihi okwu a, ndị agha ahụ chabiri ụdọ e ji kee ụgbọ mpempe ahụ hapụ ụgbọ mpempe ahụ ka ọ daba nꞌime osimiri.
33
Mgbe chi bidoro ịbọ, Pọl rịọrọ mmadụ nile ka ha rie nri. Ọ sịrị ha, “O nweghị onye ọ bụla nꞌime unu nri bara ọnụ kemgbe izu ụka abụọ.
34
Nꞌihi ọdịmma unu, ana m arịọ unu ka unu rie ihe. Nꞌihi na o nweghị onye ọ bụla nꞌime unu otu agịrị isi ya ga-ala nꞌiyi.”
35
Mgbe ahụ Pọl weere achịcha nye Chineke ekele nꞌihu ha nile, nyawaa ya, taa.
36
Otu mgbe ahụ, obi ụtọ batara mmadụ nile nꞌobi, ha bidokwara iri nri.
37
Anyị nile nọ nꞌụgbọ ahụ dị narị mmadụ abụọ na iri asaa na isii.
38
Mgbe anyị richara nri, ndị na-eso ụgbọ ahụ buuru akpa ọka nile dị nꞌụgbọ ahụ tụba ha nꞌime osimiri ime ka ụgbọ ahụ gbaa efere.
39
Mgbe chi bọrọ ha enwekwaghị ike ịghọta akụkụ mmiri nke ha nọ nꞌime ya. Ma ha hụrụ obosara ala nta nke nwere ọnụ mmiri. Ha gbara izu ịchọpụta ma ọ ga-ekwe mee ka ụgbọ mmiri ahụ site nꞌagbata nkume dị nꞌọnụ mmiri ahụ gafee. Ka ikuku nwee ike ibuba ụgbọ mmiri ahụ nꞌelu ala.
40
Nꞌikpeazụ ha kpebiri ịgbalị ike ha. Ha chabiri ụdọ igwe nwere ike ijide ụgbọ ahụ, hapụ ha nꞌime osimiri. Ha wedatara ụmara e ji anyagharị ụgbọ, weliekwa akwa ifufe, meekwa ka ụgbọ mmiri chee ihu nꞌelu ala.
41
Ma ụgbọ ahụ gara maa isi na mkpumkpu aja mmiri, mịkpuo nꞌịta. Ọnụ ụgbọ ahụ mikpuru nke ukwuu mee ka isi ụgbọ ahụ laa elu. Nke a nyere ebili mmiri a ohere iji ike tiwasịa ụgbọ ahụ.
42
Ndị agha gwara ọchịagha ha ka o nye ha ike igbu ndị mkpọrọ nọ nꞌụgbọ ahụ. Ka ha hapụ igwuru mmiri ruo nꞌọnụ mmiri site nꞌebe ahụ gbafuo.
43
Ma Juliọs achọghị ka ihe ọ bụla mee Pọl. Nꞌihi ya ọ jụrụ inye ha ike. Mgbe ahụ o nyere iwu ka ndị nile maara igwu mmiri si nꞌụgbọ ahụ wụba nꞌime mmiri, gwuru mmiri gaa nꞌelu ala.
44
Ma ọ sịrị ndị na-enweghị ike igwu mmiri gbalịa ịchọ ụzọ ọzọ, site nꞌịghọnye aka na mkpirikpi osisi na nꞌihe ndị ọzọ si nꞌahụ ụgbọ ahụ. Ya mere mmadụ nile rutere elu ala nꞌudo.
← Chapter 26
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 28 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28