bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Acts 15
Acts 15
Igbo 1988
← Chapter 14
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 16 →
1
Mgbe Pọl na Banabas nọ nꞌAntiọk e nwere ụfọdụ mmadụ sitere Judia bịa nꞌebe ahụ. Ndị a malitere izi ndị kwere ekwe na ọ dị mkpa ka ha mezuo omenala ndị Juu banyere obibi ugwu tupuu a zọpụta ha.
2
Ndị nkuzi a na Pọl na Banabas rụrịtara ụka nke ukwuu. Emesịa, ndị kwere ekwe nọ nꞌAntiọk kpebiri iziga Pọl na Banabas Jerusalem ka ha gaa chọpụta ihe banyere okwu a. Ụmụnna ndị ọzọ sokwa ha gaa ịhụ ndị ozi na ndị okenye nzukọ dị na Jerusalem banyere okwu ahụ.
3
Mgbe nzukọ Kraist dị nꞌobodo ahụ dupụrụ ha, Pọl na Banabas, na ndị so ha chere ihu ha ịga Jerusalem. Ma mgbe ha na-aga, ha kwụsịkwara nꞌobodo nta dị iche iche, nke dị nꞌụzọ ahụ, bụ obodo ndị Fonisia na Sameria. Ha na-eleta ndị kwere ekwe nọ nꞌebe ahụ, na-akọwara ha otu ndị mba ọzọ si anabata Kraịst. Nke a mere ka ndị kwere ekwe ṅụrịa ọṅụ nke ukwuu.
4
Mgbe ha bịaruru Jerusalem, ha zutere ndị isi ụlọ nzukọ Kraịst. Ndị ozi Kraịst nile na ndị okenye ụlọ nzukọ ahụ zukọtara nꞌotu ebe ịnụrụ ihe Pọl na Banabas nwere ikwu banyere ihe Onyenwe anyị rụrụ site nꞌaka ha.
5
Ma ọtụtụ nꞌime ndị zukọrọ nꞌoge ahụ, ndị bụrịị ndị Farisii tupu ha echegharịa, guzosiri ike na-ekwu na ọ dị mkpa ka ndị chegharịrị site na mba ọzọ bie ugwu dị ka omenala ndị Juu si dị.
6
Mgbe ahụ ndị ozi na ndị okenye zukọtara ịtụle okwu ahụ.
7
Mgbe ha nọ tụlee okwu ahụ ruo oge dị anya, Pita guzoro ọtọ sị ha, “Ụmụnna m, unu nile maara ihe banyere nhọpụta nke Onyenwe anyị họpụtara m. Nhọpụta a bụ ka m zisaa ozi ọma Onyenwe anyị Jisọs Kraịst nye ndị mba ọzọ. Ka ha nụrụ, ma chegharịakwa.
8
Chineke a, onye maara obi mmadụ nile, anabatala ndị mba ọzọ. O gosiri na ọ nabatala ha site nꞌinye ha onyinye Mmụọ Nsọ dị ka anyị si nata ya na mbụ.
9
O gosighị na o nwere ihe dị iche nꞌetiti anyị na ha. Nꞌihi na ọ sachara obi ha nile site nꞌokwukwe.
10
Ugbu a, unu na-achọ ikuziri Chineke ihe? Unu chọrọ ibo ndị mba ọzọ ibu arọ nke anyị na nna nna anyị ha na-enweghị ike ibu?
11
Ọ bụ na unu amataghị na e sitere nanị nꞌotu ụzọ ahụ zọpụta anyị nile? Ụzọ onyinye amara Onyenwe anyị Jisọs Kraịst!”
12
Nꞌoge a, ọ dịghị onye ọ bụla kwuru okwu ọzọ. Mmadụ nile nọdụrụ nwayọọ gee ntị nꞌihe Pọl na Banabas nwere ikwu banyere ihe ịrịba ama nile Chineke rụrụ nꞌetiti ndị mba ọzọ.
13
Mgbe ha kwusịrị okwu ndị a, Jemes malitere ikwu okwu sị, “Ụmụnna m geenụ ntị.
14
Pita akọọrọla unu ihe banyere otu Chineke si leta ndị mba ọzọ. Chineke sitere nꞌetiti ha họpụtara onwe ya ndị ga-asọpụrụ ya, na ndị ga-ebuli aha ya elu.
15
Okwu ahụ ndị amụma kwuru dakọtara nꞌihe ndị a na-eme ugbu a. Nꞌihi na Emọs onye amụma kwuru sị,
16
‘Mgbe ihe ndị a gasịrị, dị ka Onyenwe anyị kwuru, aga m alọghachikwute ndị m. Aga m ewughachikwa ụlọ Devidi; ebe ya nile dakpọsịrị adakpọsị ka m ga-ewugharịkwa.
17
Nke a ga-eme ka ndị mba ọzọ chọta Onyenwe anyị, bụ ndị mba ọzọ ahụ nile a kpọkwasịrị aha m.
18
Ihe a ka Onyenwe anyị kwuru. Nke a bụkwa nzube ya maliterị na mbụ.’
19
“Nꞌihi nke a, ntụpụta m bụ nke a, o kwesịghị ka anyị jidesie ndị mba ọzọ aka ike, bụ ndị chegharịrị bịakwute Chineke sị ha debe iwu na omenala ndị Juu nile.
20
Kama o kwesịrị ka anyị degara ha akwụkwọ gwa ha sị ha hapụ iri anụ ọ bụla e ji chụọra arụsị aja. Ka ha wezụgakwa onwe ha site na mmehie ịkwa iko, ya na iri anụ a nyagburu anyagbu, ma ọ bụ ọbara.
21
Nꞌihi na a na-ekwusa ihe dị nꞌiwu Mosisi nꞌụlọ nzukọ ndị Juu dị nꞌebe nile, site nꞌotu obodo ruo nꞌobodo ọzọ na site nꞌizu ruo nꞌizu.”
22
Mgbe ahụ ndị ozi na ndị okenye na igwe mmadụ nọ nꞌebe ahụ fere nza iji ya ịchọpụta ndị ga-ewere okwu ahụ jekwuru ndị kwere ekwe nọ nꞌAntiọk. Ndị dị otu a ga-eso Pọl na Banabas gaa kọwaara ha ihe nzukọ a kpebiri. Ndị a họpụtara bụ mmadụ abụọ site nꞌetiti ndị isi. Ha bụ Judas onye aha ya bụkwa Basabas, na otu onye ọzọ a na-akpọ Saịlas.
23
Nke a bụ ihe ha dere nꞌakwụkwọ ahụ ha ga-eji gaa ozi a. “Akwụkwọ a sitere nꞌaka ndị ozi, ndị okenye na ụmụnna nọ na Jerusalem. A na-edetara ya unu ndị sitere na mba ọzọ kwere na Kraịst, unu ndị nọ nꞌAntiọk, na Siria na Silisia. Anyị na-ekele unu ekele nꞌime Onyenwe anyị.
24
“E mere ka anyị mata na ụfọdụ ndị kwere ekwe si nꞌetiti anyị ebuterela unu nsogbu na ọgba aghara banyere nzọpụta unu. Ha etinyerela unu obi ịlọ mmiri. Ma nꞌezie, ọ bụghị anyị zitere ha nꞌebe unu nọ.
25
Nꞌihi nke a anyị zukọrọ sitekwa nꞌotu obi nwee mkpebi a. Anyị na-ezitekwa mmadụ abụọ ndị a, bụ ndị ha na Pọl na Banabas so, ka ha nọchite anya anyị.
26
Mmadụ abụọ ndị a ahụla ọtụtụ ahụhụ nꞌihi ozi ọma Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.
27
Ya mere, anyị na-ezite Judas na Saịlas ka ha site nꞌokwu ọnụ ha kwagide ihe anyị dere nꞌakwụkwọ.
28
“Nꞌihi na ọ bụ ihe ziri ezi nꞌanya Mmụọ Nsọ, na nꞌanya anyị kwa, na o kwesịghị ka anyị bokwasị unu ibu arọ banyere omenala ndị Juu.
29
Ma o kwesịrị ka unu hapụ iri ihe ọ bụla e jiri chụọ aja nye arụsị, ya na iri ihe ọ bụla a nyagburu anyagbu, ma ọ bụ ọbara. Kewapụkwanụ onwe unu site nꞌịkwa iko ọ bụla. Ọ bụrụ na unu eme ihe ndị a unu mere nke ọma. Nọọnụ nke ọma.”
30
Ndị ozi anọ ahụ biliri gaa Antiọk. Nꞌebe ahụ ha kpọrọ nzukọ nke ndị nile kwere ekwe. Mgbe ha zukọrọ, ndị ozi a nyere ha akwụkwọ ozi ahụ ha si na Jerusalem weta.
31
Mgbe ha gụsịrị akwụkwọ ahụ, ndị kwere ekwe ṅụrịrị ọṅụ nke ukwuu nꞌihi agbamume akwụkwọ ahụ wetara.
32
Ma ebe Judas na Saịlas nwere onyinye ikwuwa okwu, ha kwupụtara okwu Onyenwe anyị nꞌime nzụkọ Kraịst oge ahụ nile, mee ka okwukwe ndị kwere ekwe nọ nꞌobodo ahụ guzosie ike.
33
Judas na Saịlas nọnyeere ha ụbọchị ụfọdụ. Emesịa, ha laghachiri Jerusalem. Ha jikwa obi ụtọ na ekele laghachikwuru ndị ozi.
34
Ma Pọl na Banabas nọgidere nꞌAntiọk,
35
inyere ndị na-ekwusa okwu Onyenwe anyị aka. Ha nọgidesịrị ike ịkụzi okwu Chineke.
36
Mgbe ọtụtụ ụbọchị gasịrị, Pọl gwara Banabas sị, “Ka anyị laghachikwa obodo Tọki ileta nzukọ Kraịst dị iche iche dị nꞌakụkụ obodo ahụ. Ka anyị gaa leta ndị ahụ anyị zisaara ozi ọma nꞌoge gara aga, ịmata ihe banyere ọnọdụ ndị kwere ekwe nọ nꞌebe ahụ.”
37
Banabas kwenyere nꞌihe Pọl kwuru kama ọ chọrọ ka Jọn Mak soro ha nꞌije ha.
38
Ma Pọl ekweghị ka o soro ha, nꞌihi na Jọn Mak esoghị ha nọgide ruo ọgwụgwụ ije ha nꞌoge gara aga.
39
Nꞌihi nke a ịrụ ụka dapụtara nꞌetiti ha. Emesịa, ha kewara. Banabas kpọọrọ Jọn Mak banye nꞌụgbọ mmiri gaa nꞌobodo Saịprọs.
40
Ma Pọl họọrọ Saịlas. Emesịa, mgbe ụmụnna kpeere ha ekpere tinye ha nꞌaka amara Onyenwe anyị,
41
ha jegharịrị nꞌime obodo Siria na Silisia na-agba nzukọ Kraịst nọ nꞌebe ahụ ume.
← Chapter 14
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 16 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28